evaluation/en-ig/flores-dev.ig (997 lines of code) (raw):

Na Monde, ndi oka mmuta sayensi sitere na Mahadum Stanford Ulo-akwukwo nke Ogwu kwuputara nchoputa nke ngwa-oru nyochaputa ohuu nwere it hoputa mkpuru-ahu site udi: otu mpekere ngwa nka nke enwere ike iruputa site na iji inkjeti igwe-prita din mma nke enwere-ike imeputa na otu senti mba US n’otu. Ndị isi nchọpụta sị na nke a nwere ike iweta maka nnyochapụta n'oge nke ọrịa kansa, ụkwara nta, obiri n'aja ọcha, na ịba nye ndị nọ n'ọrịa n'obodo ndị n'enweghị ego, ebe nnapụta n'aka ọrịa dịka kansa nke ara nwere ike ịbụ ọkara otu ọdị n'obodo ndị kara nwee ego. Ụgbọ JAS 39C Gripen kpọkasịrị n'okporo ụzọ ụgbọelu ebe ihe dị ka 9:30 nke ụtụtụ oge obodo (0230 UTC) ma gbawaa, nke mere ka a kagbuo njem ofufe niile n'odụ ụgbọelu a. Achọpụtara onye onyaa ụgbọ elu a dịka Squadron Leader Dilokrit Pattavee. Ndị mgbasa ozi ebeụlọ na-akọ maka ụgbọ ala mgbanyụ ọkụ ọdụ ụgbọ elu tụgharịrị n'okpuru ya mgbe ọ na-aza. Vidal gbara afọ iri abụọ na asatọ esonyela Barça n'oge egwuregwu bọọlụ atọ gara aga, site na Sevilla. Kemgbe ọ kwagara na isi obodo Catalan, Vidal egwurula klọb egwuregwu 49. Ngagharị iwe ahụ malitere ihe dị ka oge obodo 11:00 (UTC+1) na Whitehall n’ofe ụzọ mbata nke okporo ámá Downing ahụ ndị uwe ojii na-echekwa, ụlọ keọkwa nke Onye isi ala ahụ. Mgbe okuchara nnoo elekere 11:00, ndi ngahari-iwe anochie owa-ugbo na okporo gawara-mpaghar-ugwu na Whitehall. N'elekere 11:20, ndị uwe ojii gwara ndị ngagharị iwe ahụ ka ha laghachi azụ n'elu ụzọ ebe ndị ji ụkwụ na-aga, na-akọwa na ọ dịla mkpa ha ịtụle ikike ha nwere ime ngagharị iwe dịka ụzọ na-akpọchi. Ihe dị ka mgbe oge jiri nkeji iri abụọ na itolu gafee elekere iri na otu, ngahari mkpesa ahụ gbagoro Whitehall, gafee ebe ọgbakọ Trafalgar, n'ụzọ Strand, ma a gafee Aldwych ma gbagoo Kingswee n'ebe Hoborn, ebe Otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Kọnzavetiv nọ na-enwe ọgbakọ udu mmiri ha n'ime ụlọ nkwari akụ Grand Konnọt Rums. Ihe ogo mmeri n'asọmụmpi nke ndị Nadal ji megide nke ndị Kanada bụ 7-2. Ọ dara n’oge na-adịghị anya megide Raonic na Mmepe Brisbane ahụ. Nadal nwere 88% n’egwuregwu ahụ iji merie na 76 n’ọrụ izizi. Ka ndọrọ ndọrọ egwuregwu gasịrị, Eze Kle were sị, "Enwerem nnọọ obi añurị ịbụ onye bịaghachiri na agba nke ikpeazụ nke mmemme ndị kacha mkpa. A nọ m ebe a ịgbalị imeri ihe a." Panama Papers bụ aha gburugburu maka ihe ruru nde akwụkwọ iri nke ụlọ ọrụ iwu nke Panama bụ Mossack Fonseca, gbakwunyere ndị nta akụkọ n'oge sprịng 2016. Akwukwo ahu gosiri na ulo aku iri na ano nyere ndi ogaranya n’azu ha ahia aka were zoo ijeri US dollars ka ha were gbalaga ikwu tax na ihe ndi ozo. Di Gadịan, ụlọ ọrụ akwụkwọ ozi Briten, tụrụ aro na Deutsche Bank bụ ndị na-ahụ maka ihe dị ka otu ụzọ n'ụzọ atọ nke ụlọ ọrụ 1200 anọghị n'ọrụ, ndị e ji wee mee ihe a. Enwere ngagharị mkpesa gburugburu ụwa, ọtụtụ mkpegbu ndị omekome, na ndị isi ọchịchị obodo Iceland na Pakistan gbakwara arụkwaghịm A mụrụ ya na Họng Kọng, Ma gụrụ akwụkwọ na Mahadum nke Niu Yọk, makwa Mahadum Ikpe nke Havad n'otu oge o nwekwara "akwukwo obibi" na-adigide adigide nke obodo Amerịka. Hsieh kwuru okwu n’oge ntuliaka na Ma nwere ike ịgbapụ n'obodo n'oge ọgba aghara. Hsieh kwukwara na Ma mara mma foto bụ naanị ịchọ mma ka ọ maara, na onweghi ihe ọ chị. Agbanyeghị ebubo ndị a, Ma meriri ọfụma n'otu na-akwado ịmụba mmekọrịta ha na Chaịna ukwu. Onye egwuregwu nke taa a na-akwanyere ugwu Taa bụ Alex Ovechkin nke Washington Capitals. O nwere goolu abụọ na enyemaka abụọ na mmeri 5-3 nke Washington meriri Atlanta Thrashers. Enyemaka mgbanyere bọọlụ mbụ Ovechkin nyere n'egwuregwu bọọlụ nke abalị ahụ bụ ya butere ọkpụ goolu mmeri sitere n'aka Nicklas Backstrom. Gol ya nke abụọ n'abalị ahụ bụ nke 60 ya n'afọ egwuregwu a, nke mere ya onye egwuregwu nke mbụ yọgoro gol 60 maọbụ karịa n'otu afọ egwuregwu kemgbe 1995-96, mgbe Jaromir Jagr na Mario Lemieux rutere ogo ahụ. E nyere Batten ọkwa onye nke 190 na ndepụta mmadụ 400 ndị Amerika kachasị baa ọgaranya n'afọ 2008 dịka na akụnaụba ya ruru ihe dịka ijeri $2.3. Ọ gụchara akwụkwọ na Mpaghara nke Nka na Sayensị nke Mahadum nke Vejinia n'afo 1950 ma bụrụkwa onye na enye onyinye ama ama n'ụlọ akwụkwọ ahụ. Mkpọrọ Abu Ghraib nke Irakị bụ nke amụnyere ọkụ n’oge otu ogbaaghara. Ụlọ nga ahụ ghọọrọ ihe ama mgbe achọpụtara mmegide ndị atụrụ nga n'ebe ahu ka ndị agha US weere ọnọdụ. Piquet Jr. kpọkashịrị n’ime 2008 Singapore Grand Prix ozugbo o mechara nkwụsị obere oge maka Fernando Alonso, na-ewepụta ụgbọala nchekwa ahụ. Ka ụgbọ ala ndị ahụ bu Alonso ụzọ gara ịgbata mmanụ ụgbọala n'okpuru ụgbọ nchekwa, o duuru ndị n'eso ya wee were ọnọdụ mmeri. Achụpụrụ Piquet Jr. mgbe Asọmpi Nnukwu Ịgba ọsọ nke ụgbọ n'afọ 2009 nke Họngarị gasịrị. Na kpọmkwem n'elekere asatọ nke ụtụtụ owu dara n'ofe obodo ahụ, na-aka akara kpọmkwem ogenta ahụ ụgbọelu nke mbụ gbara na nzube ya. E dochiri ụzọ abụọ dị ọkụ iji rụtụrụ mbara igwe n'otu abalị. Owuwu ụlọ ruru igwe ise na-aga n'ihu n'ebe ọrụ, a na arụkwa ụlọ njem na ogige ncheta n'etiti. Ihe ngosi PBS nwere ihe kariri iri abuo Emmy nyere ya, oso oso ya di mkpirisi karia Sesame Street na Mister Rogers 'Neighborhood. Nkebi nke ọbụla n'ihe nkiri ahụ ga-etinye uche n’otu isiokwu n’ime otu akwụkwọ akọwapụtara ma mgbe ahụ nyogharịa isiokwu ahụ site n’ọtụtụ akụkọ. Ihe ngosi ọbụla gakwa enye ụmụ nkwanye maka akwụkwọ ndị nke ụmụaka kwesịrị ịchọ maka mgbe ha gara n’ọbaakwụkwọ ha. John Grant nke WNED Buffalo(ebe Reading Rainbow) kwuru si na "Reading Rainbow ekuzigoro umuaka ihe kpatara ha ga eji guo akwukwo, ...ihunanya nke igu akwukwo -[ihe ngosi] na-akwado umuaka ka ha tuturu akwukwo guo." Ụfọdụ, tinyere Jọn Grant, kwenyere na mbelata mbinye ego na mgbanwe na nka ihe ọmụma gbasara ndozi ihe ngosi nkuzi ihe so weta maka njedebe ihe ngosi ahụ. Ebili mmiri ahụ, nke nọ ihe dịka maịlụ 645 (1040 km) n'ọdịda anyanwụ isuo nke Kep Ved, nwere ike ịdajụ tupu orute ebe obibi, ndị nhụta ihu igwe kwuru. Ugbu a, Fred nwere ikuku nke kilomita 105 kwa awa (165 km/h) ma na-aga n'akụkụ nọtwest. Fred bu oke ikuku ebe okpomọkụ kachasi sie ike edekogwere n’ebe ndida ya n’owuwa nke osmiri Atllantic ka mgbe obibia foto satilaiti, o bukwazi ajo ifufe nke ato enwegoro n’odida nke 35°W. Na Septemba 24, 1759, Arthur Guinness banyere na nkwekọrịta ịnwere Briwiri St Jems Get na Dublin, Ireland, ruo afọ puku iteghete. Ka afọ 250 gasịrị, Gines etoruola ogugo azụmahịa zuru ụwa nke na enweta ihe karịrị euro iri nde (US$14.7 billion) ọnwa ọbụla Jọni Reid, onye ọkwọ ụgbọala ibe m maka otu A1GP nke Niu Ziland, mere ihe a na-emebeghi mbụ taa site na-inyakari ọsịsọ gafee akwa mmiri Ọkland Habọ nke dị afọ iri anọ na asatọ, na-emebighị iwu. Mazi Reid jisiri ike nyaa ụgbọala a na-akpọ nwa mma dị oji bụ A1GP nke Niu Ziland, n'ogugo ọsọ nke 160km/h ugboro asaa gafee akwa mmiri ahụ. Ndị uwe ojii New Zealand police nwere nsogbu iji reda èkwòmọsọ ha ịhụ ọsọ ole Maazị Reid na-agba n’ihi etu ala Black Beauty dị, ma naanị oge ndị uwe ojii gbalịrị ma nweta Maazị Reid bụ mgbe jiri nwayọọ ruo km/a160. N'ọnwa ato gara-aga, ndi nga karịrị iri asatọ ka a hapụrụ site n'ụlọ mgba akwụkwọ nke etiti n'enweghị akwụkwọ agbara ha Na onwa eprel afo a,oka-iwu Glynn nyere iwu mmachi nke ga adi nwa oge-nta megide ogige ahu iji kwudosie-ike nye ntohapu nke ndi eji-eji karia awa 24 ejidere ha bu ndi n’enwetaghi onunu ziri-ezi site n’aka onye-isi ulo-ikpe. Kọmishọna na ewepụta ụgwọ mgbapụta, ọbụrụ na ekwenye na ya, ma hazie ụgwọ akwụkwọ onye jidere onye omekome gbara ya. Akwụkwọ ndị a ka a ga edenye kọmputa nke steeti ebe aga-esi wee sowe okwu ahụ. Oge ikpe izizi na egosikwa oge onye a na enyo enyo nwere ikike isi ka ekpee ya bụ ikpe ọsịsọ. Pita Kostello, Onye Ndokwa akụ Ọstrelia na onye a na-ele anya ga-anọchi Praịm Minista Jọn Howard dịka onye isi otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Libral, ewerela nkwado ya nye otu ụlọ ọrụ na-eme ihe gbasara ike nuklia n'Ọstrelia. Mazị Kostello sị na mgbe mmepụta ike nuklia ghọorọ ihe nchekwa akụ, obodo Ọstrelia ga agbagharị ịhụ na etinyere ya n'ọrụ. Ọ bụrụ na ọ ghọrọ azụmahịa, anyị kwesịrị inwe ya. Nke ahụ bụ, enweghị nkwekọrịta dị adị maka ike nuklia Mr Costello kwuru. Dika Ansa si kwuo, "ndi uwe-ojii nwere mmetu maka nkuta di-elu ole na ole ha turu-ujo nwere-ike ikpasu ezigbo agha nke nsota. Ndị uwe ojii kwuru na Lo Pikolo bụ onye ka dị ike maka na ọ rụọrọla Provenzano ọrụ na Palemo dị ka onye nnọchiteanya, nakwa ahụmahụ ya karịrịnụ mere ka ndị ọga kara aka sọpụrụ ya maka ha kwadoro iwu Provenzano tinyere maka izopu onwe, jiri nwayọọ na-amụba ikikere. Povenzano kwụsịrị ndị isi a mgbe ọ kwụsịrị agha Riina nke megidere steeti nke weere ndụ ndị agha ntụgharị Mafia bụ Giovanni Falkon na Paolo Borsellino n'afọ 1992." Onyeisi ụlọọrụ Apple bụ Steve Jobs kpuhere ekwentị ahụ site n'iwepụta ya bụ ekwentị iPhone n'akpa uwe ukwu jiini ya mgbe ọ na-agbago n'elu nkwago. N’okwu ya nke ruru awa 2, o kwuru “Taa Apple ga-agbanwe ekwentị dị ka ụwa si mara ya, Anyị ga-eme oke ihe taa”. Brazil bụ mba Roman Katọlik kachasị ukwuu n'ụwa, na Chọọchị Roman Katọlik emegidewo iwu ịgba alụkwaghịm nwoke na nwanyị na mba ahụ .. Nzuko Omeiwu Nke Mba Brazịl rụrịtara ụka nkwado iwu ruo afọ iri, ma ụdị alụmdi na nwunye obodo ahụ bụ ugbu a naanị a kwadoro n'iwu n'ime Rio Grande do Sul. Iwu mbụ ahụ bụ onye bụbu onyeisi obodo nke São Paulo, Marta Suplicy wepụtara ya. Iwu ahụ achọrọ ime, mgbe e mezichara ya, nọzi ugbu a n’aka Roberto Jefferson. Ndi ngaghari iwe nwere olile-anye inweta mkpesa ntibanye aka n’akwukwo nde 1.2 iji gosi nzuko ome-iwu ala-anyi n’onwa Novemba. Ka o doro anya na ọtụtụ ezinụlo na-achọ enyemaka iwu iluso nchụpụ n'ụlọ ndị ahụ ọgụ, e nwere otu ọgbako na Maachị 20 n'Ebe Iwu Obodo Ọnụ Mmiri Ọwụwa Anyanwu ahụ maka ndị e megburu n'ojoro ebe obibi ahụ. Mgbe ndị gbazitere ụlọ bidoro na-akọwara ha ihe mere, ọtụtụ ezinụlọ ndị o metụtara bịara chọpụta na Karolin Wịlsịn onye ụlọ ọrụ OHA eburula ego ha kwụnyegoro si n'obodo larie. Ndị bi na Lọkwud Gadịns kwenyere na ọnwere ike inwe ihe dị ka ezinụlọ iri anọ maọbụ karịa ndị a ga achụpụ n'ebe obibi, ebe ha matara na ndị uwe ojii OHA so na eleba anya n'ihe gbasara ihe onwunwe nke ụlọ obibi ọha nke di na Okland ndị nwere ike ịnọ n'ọnọdụ aghụghọ gbasara ebe obibi. Ndị otu ahụ kagburu ihe ngosipụ ahụ na Maui's War Memorial Stadium, nke mmadụ 9,000 ga-aga, ma rịọ mgbaghara ndị nkwado. Ụlọ ọrụ nlekọta òtù nkwa egwu ahụ, bụ HK Management Inc., enyeghị nkọwa nke izizi mgbe ha kagburu na Septemba 20, mana ha boro ya ihe mkpata lọjistik mgbe chi foro. Ndị ọka ikpe Grik amaara aha ha, Sakis Kechagioglou na Jiọj Nikolakopoulos ka atụrụ mkpọrọ n'ụlọ mkpọrọ nke Atens nke dị na Korydallus, n'ihi na achọpụtara na ikpe mara ha n'okwụ gbasara iri ego oha na mpu. N'ihi nke a, nnukwu nsogbu bilitere n'etiti ọgbakọ ndị oka iwu nke Gris site na-igba n'anwụ omume n'ezighi ezi nke ndị ọka ikpe na ndị oka iwu na ndị solositọ na ndị atoni mere n'afọ ndị gara aga. Izuụka ole ma ole gara aga, ka ebipụtachara ozi onye odeakụko bụ Makis Triantafylopoulos n'ihe onyonyo ya a maara nke ọma bụ "Zoungla" n'ọwa ihe ngosi igwe onyonyo bụ Alfa, onye otu nzukọ omeiwu nakwa ọkaiwu, Petros Mantouvalos ka a chụpụrụ dịka na ndị ụlọọrụ ya sonyere n'ihe mmegide iwu mpụ na ngarị. Nke ka nke, atuola oka-iwu di elu Evangelos Kalousis nga ebe ahutara na aka ya na mpu tinyere omume na aso-oyi. Robets jụrụ ikwu okwu gbasara ngbe okwetara na ndụ n'ebido, ajụjụ dị oke mkpa ma a na eleba anya n'ihe gbasara ụkpụrụ omume ntepụ ime, ọ sị na ọ bụ ihe megidere ụkpụrụ omume ikwu okwu kpọmkwem gbasara okwu akpụ n'ọnụ. O mechekwara kwugharịa ihe o kwuru mbụ, na ikpe Roe v. Wade bụ "iwu ala ekpebigoro", na-akọwa etu o si dị mkpa ka mkpebi Ụlọ ikpe kachasị elu bụrụ agbanwe agbanwe. O kwenyere na o kweere na ikikere nzuzo e kwuru nke mkpebi Roe dabere na ya. Maroochydore mechara bụrụ onye nke mbụ n'ogo ahụ, o ji akara isii gafee Noosa bịara n'onye nke abụọ. Ngalaba abụọ ahụ ga-ezute na mmeme ukwu n'ebute mmeme ngwụcha ụzọ ebe Noosa ji ọkpụ iri na otu emerie. Maroochidore ewere merie Caboolture na mmeme ngwụcha nke izizi. Hesperonychus elizabethae bụ ụdị ụmụ nke ezinụlọ Dromaeosauridae ma ọ bụ nwa nwanne nna nke Velociraptor . Nnụnụ a nku juru ahụ na-eri anụ, bụ nke ekweere na dika ajọ anụ Velosiraptọ na o jere ije n'ọnọdụ kwụ ọtọ n'ụkwụ abụọ nwere mbọ aka. Mkpisiri aka ya nke abuo buru ibu karia, nke tuputara aha ahu bu Hesperonychus nke putara “nkpisiri odida-anyanwu”. Tinyere mmiri oyi siri ike, ọnọdụ ihu igwe dị egwu na egbochi mgbalị nzọpụta. Pittman tụnyere n’ọnọdụ ndị ahụ agaghị adịwa mma ruo mgbe ụfọdụ n’izu na-abịanụ. Onu-ogugu na idi-ike nke mmiri ahu jukporo oyi, dika Pittman si kwuo, bu nke kacha njo karia otu ona-adi nye nyi nkeko kemgbe afo 15 gara-aga. Akụkọ gbasara n'ime obodo Red Lek taa dịka a na eme olili ozu Jeff Weise na mmadụ atọ ọzọ n'ime mmadụ itolu ndị ihe mmerede metụtara na ejidere nwa akwụkwọ ọzọ maka okwu gbasara mgbagbu mere n'ụlọ akwụkwọ n'ụbọchị nke iri abụọ na otu nke ọnwa Maachị. Ndị nọ n’ọchịchị kwuru obere n’ọrụ gabiga nkwenye njide taa. Mana, otu onye maara maka nnyocha a gwara Miniapolis Sta-Tribun na ọ bụ Luwi Jurdan, nwa nwoke Flọịd Jurdan, onye isi Red Lek Traịbal, nke dị afọ 16. Amatabeghi ugbu a ebubo a ga-ebo maọbụ ihe mere ndị isi ji wee nyowe nwata nwoke a, mana ebidola usoro ikpe ụmụazị n'ụlọ ikpe gọọmenti. Lodin sịkwara na ndị isi kpebiri na a ga akagbu emume ntuli aka nke abuo iji nwee onye mmeri ka enwee ike ịnapụta ndị mba Afganistan n'aka oke mmefu ego makwa n'aka ihe na-emegide nchekwa na-esote ntuli aka. Ndị nnọchiteanya mbà kwuru na ha ahụghị ezigbi ihe mgbagwujuanya n’usoro iwu ndị Afghan iji kpebie n’usoro ntụziaka ahụ ezighị ezi. Nke a na-aga na mmegide ihe akọbụrụ na mbụ, nke bụ na ịkagbu mgbapụ ahụ gara ịda iwu. Ụgbọelu ahụ na-agabu Irkutsk na ọ bụ ndị agha nke ụlọ na-anya ya. E tinyere nnyocha iji mee nchọpụta. Il-76 bụ ngalaba gbapụtara ihe nke ndị agha Rọshịa na Sọviyetị kamgbe afọ 1970 ga, ma hụkwalarị ihe mberede siri oke ike na mba Rọshịa n'ọnwa gara aga. N'ụbọchị nke asaa n'ọnwa Oktoba otu njin pụrụ dịka ụgbọelu na-efeli, n'enweghị mmerụ ahụ ọbụla. Mba Rọshia kagburu ụgbọelu Il-76s ifegharị ka ihe mberede ahụ mechara. Emechiri ọkpọkọ mmanụ nke Trans-Alaska ruru maịlụ 800 ka puku kwuru puku gbọmgbọm mmanụ kwafuru na ndịda Fairbanks, nke Alaska. Ọkụ ọnyụnyụ sochitere nlekwa a na emechite anya n'ụlọ ihe gbasara ọkụ mere ka valvụ enyemaka mepee mmanụ wee gbabiga oke n'akụkụ ebe mgbapụta mmanụ nke itolu Fọt Griili. Mmepe valvụ ahụ nyere òhèrè otu nnwereonwe nrụgide maka sistemụ ahụ ma mmanụ wụrụ na paadị gaa na taankị nwere ike ijide bareelụ 55,000 (galọn nde 2.3). Dị ka n’ehihie Wenezdee, ụmụ oghere ikuku tankị ahụ ka na-ehi ehi o nwere ike site na ebumibu n’ihi ekpomọkụ n’ime tankị ahụ. Ebe ọzọ e ji agbanye ihe ọzọ n’okpuru olori ndị ahụ nke nwere ike ijigide barelụ 104,500 ejuchabeghị. Okwuntukwasa ndi ahu, nke telivishon gosiri ka o na eme, bu izizi ndi isi Iran kwetere na ikike anapuru ha metutara ha. Ihe na-esote ha bụ mgbochi otu esi emefu ego ya na iwu mmgbachibido sitere n'aka ọgbakọ nke Iroopu n'ihe gbasara mbupu n'obodo mmanụ, ebe akụnụba mba Aịranụ si enweta ego nrite si mba ọzọ pasenti iri asatọ. N'ime akụkọ ya a na akọ n'ọnwa ọbụla nke akọrọ nso nso a, OPEC si na mbupu mmanụ n'obodo dara ada ruo ogugo nke kacha dị ala n'ime afọ iri abụọ n'ọnụ gbọmgbọm nde abụọ na asatọ kwa ụbọchị. Onye isi kacha ndị isi obodo nke obodo ahụ, onye aha ya bụ Ayatollah Ali Khamenei, kọwatara ndabere na mmanụ dị ka "ọnya" nke bidoro tupu mgbanwe okpukpe Islam n'obodo Aịraanụ n'afọ 1979 ma bụrụkwa ihe obodo kwesịrị isi na ya napụta onwe ya. Mgbe kapsụlụ ahụ bịarutere n’Ụwa ma banye mbara ụwa, n’oge ihe dị ka 5 ụtụtụ (oge ebe ọwụwa anyanwụ), a na-atụanya na ọ ga-eme otu ihe ngosi ọkụ maka ndị enyi anyị nọ na Ebe ugwu Kaifonịa, Ọregọn, Nevada, na Yutaa. Ụgbọ ahụ ga eyi kpakpando na-agbafe n'ihu igwe. Kapsụlụ ahụ ga na-aga njem n'ihe dịka km 12.8 maọbụ maịlụ 8 kwa ntabianya, ọsịịsọ zuru oke iji site na San Francisco ruo Los Angeles n'otu nkeji. Stardust ga atoo ndeko oge ohuu nke oji buru ugboelu kacha agbasi ike na njem iji ilaghachite n'uwa, o ga agbawa ndeko oge atooro na onwa May nke 1969 oge isi modulu Apollo X n’alaghachite n’uwa. “Ọ ga agafe ụsọ oke osimiri ọdịda anyanwụ nke northern Kalifonia ma mukekwaa ihu igwe site na Kalifonia gafee central Ọregọn rukwaa na Nevada na Idaho ruo n'ime Utah" ka Tom Duxbury, onye bụ onye nlekọta ndị ọrụ ngo bụ Staadọst kwuru. Mkpebi Mazị Rudd ịkwado Nkwekọrita Ihu Igwe Kyoto kewapụrụ United States, mee ka ha bụrụzie naanị mba mepere-emepe nke na-agaghị akwado nkwekọrịta a. Isi ọchịchị na-achọghị mgbanwe nke gara aga nke mba Ọstrelia jụrụ ịkwado Kyoto, ha sị na ọ ga emebi akụnụba obodo n'ihi oke ndabere o nwere na mbupu coal n'obodo, mana mba dịka India na Chaịna abụghị ndị iwu oke anwụrụ jigidere. Ọ bụ ihenzụta kachasị dị elu nke ntọala ndị eBay. Ụlọọrụ ahụ nwere olileanya ịgbasa ụmụ isi mmalite uru ya ma mee ka amara ya amara n’ebe Skype nwere ọkwa guzosịrị ike, dịka Chaịna, Ebe ọwụwa anyanwụ Yuropu, na Brazili. Ndị ọkammụta sayensị lere Enceladus anya dịka ebe e nwere mmegharị ala ma bụrụkwa ebe enwere ike isi nweta oghoghoro E nke bụ mkpụrụ mmiri nke Saturn. Enseladus bụ ihe kachasị enwukepụ ihe na sola sistem niile; ọ na-enwukepụ ihe dị ka pasent 90 nke ọkụ niile na-abịakwasa ya. Taa Konami bụ dị na-emepụta egwuregwu sịrị n'otu akwụkwọ akụkọ nke mba Japan na ha agaghị ewepụta egwuruegwu a na akpọ Ụbọchị Isii na Faluja. Egwuregwu a si n'akụkọ Agha nke Abụọ nke Fallujah, agha kara aka ndị Amị Amerịka na nke ndị Iran lụrụ. Ndi ACMA chọpụtarakwara na n'agbanyeghị na a na elere ya n'ịntaneetị, ihe onyonyoo Big Brọda emebighị iwu gbasara nyocha na mmachi ihe ngosi n'ịntaneetị maka na ihe onyonyoo ahụ abụghị ihe echekwara na webụsaịtị nke Big Brọda. Iwu Ọrụ Mgbasa ozi ahụ na-enye maka njikwa nke ndị̀na ịntaneetị, Etu ọ bụla a ga-esi echebara ndị̀na Ịntaneetị, ọ ga-ebirịrị n’anụ ahụ n’otu sava. Ulo-nnochita-anya mba Ameriaca no na obodo Nairobi, Kenya adoola aka-na-nti na "ndi-mmeru-nisi sitere na mba Somalia" na akpa-nkata iwebata ogbunigwe na-egbu-onye-turu-ya na mba kenya na Ethiopia. Mba U.S sị na o nwetara ozi site n'aka onye ozi a na amaghị kwuru kpọmkwem na a ga eji ndị ogbunigwe gbuo onwe were gbarie "akara ngosi ala pụtara ihe" na mba Etiopia na Kenya. Ogologo oge tupu Di Deeli Sho na Di Kolbet Rịpọt ebido, Heck na Johnson atụọla atụmatụ maka mbipụta ga na-enye akụkọụwa ntọrọmọchị— ma na-akọ akụkọụwa— mgbe ha ka bụ ụmụ akwụkwọ na Mahadum Washịntịn n'afọ 1988. Kemgbe mbido ya, Di Oniọn abụrụla n'eziokwu alaeze ntaakụkọ na eme ejije n'atọ ọchị, ha nwere mpaghara mbipụta, webụsaịtị nke dọtara ndị ọbịa nde ise pụrụ iche n'ọnwa Ọktoba, mgbasa ozi nke onwe, netwọkụ nke na-enye ntaakụkọ awa ọbula nke dị n'ụbọchị, pọdkastị, nakwa akwụkwọ ngosipụta ụwa a malitere nke a na akpọ Ụwa Anyị N'amaghị Ihe. Al Gọ na Onye isi agha Tọmi Franks kwupụtara isi ntaakụko kacha masị ha n'echebaraghị ya echiche ( Nke Gọ bụ mgbe Di Onịon kpesara na ya na Tipa nwere mmekọ nwoke na nwanyị kachasị na ndụ ha ka emerichara ya na ntuliaka kekọleji ntuliaka n'afọ 2000). Ọtụtụ n'ime ndị odee ha agaala n'ihu ịkpa ike di egwu n'ihe ngosi mgbasa ọzi ntọrọmọchị nke Jon Stewart na Stephen Colbert. Mmemme nka a so n'atụmatụ Bucharest Siti Họl nwere ime ka ndi mmadụ bido ịhụta isi obodo Romenia dịka ebe mara mma ma juputa na ndi okike. Obodo ahụ ga abụ nke izizi n'ọwụwa anyanwụ ndịda ọwụwa anyanwụ Iroopu nke ga bụ onye nnabata na mmeme KawụParedị, mmeme nka ọha kachasị ukwu n'ụwa n'ile, n'etiti ọnwa Juunu na Ọgọstụ nke afọ a. Ọmụma ọkwa nke taa gbatịkwuru ruo na nkwa gọọmenti kwere n'ọnwa Maachị nke afọ a itinyekwu ego inweta ụgbọ okporoígwè kemgbako. Narị atọ a gbakwunyere ọzọ na-eweta mkpokọta ya ruo ụgbọ ibu otu puku na narị atọ a ga-enweta iji belata oke njupụta. Kristofa Gashia, onye nkwuchite okwu ngalaba uwe ojii nke Lọs Anjeles, sị na nwoke ahụ nke a na enyocha gbasara mmebi iwu bụ maka njehie oke m'ọbụghị maka mmebi ihe. Ihe ịrịba ama ahụ emerụghị ahụ kèahùrụanya; Emere mgbanwe ahụ site n'iji tarpaulins achọrọ mma n'iji akara nke udo na obi iji gbanwee "O" ahụ ka ọ gụọ mkpụrụedemede ntà "e". Ihe n’ebute taid n’acha uhie uhie bu oke Karenia brevis, otu single-celled organism n’agba na mmiri. Ihe okike nwere ike ịgbagha onwe ha iweta maka ezigbo ọnọdụ, nke ga eme ka nje a bụ alge mụbaa n'ụzọ dị egwu. Algee na-emepụta nsi nke akwara ozi nke nwere ike ịgbanyụ akwara na ma mmadụ ma azụ. Azụ na anwụkwarị n'ihi ọnọdụ nsi dị oke elu n'ime mmiri. Nke a nwere ike imetụta ndị mmadụ site n'ikuru mmiri o metụtara nke oke ikuku na ebili bugara n'ikuku. Na nkacha elu ya, Ajọ ifufe Ebe okpomọkụ Gonu, agụrụ aha maka akpa nke akụkwọ osisi nkwụ n’ime asụsụ nke ndị Maldives, rutere ifufe nọgidesịrị ike nke kilomita 240 kwa awa (maịlị 149 kwa awa) . Ka ọ na-erule mbido taa, ikuku dị ihe dịka 83km/awa, ma a na-atụkwa anya na ọ ga-eme ka ọ na-agbada. Na Wenezdee, Nashọnal Basketbọl Asosieshọn (NBA) nke Amerịka kwụsịrị ogbe egwuregwu basketbọl ya maka egwu gbasara COVID-19. NBA kpebiri nke a ka onye egwuregwu Utah Jazz butere ọrịa COVID-19. Ma adabere n'ọkpụkpụ a, ọputara na nkewa ahụ mere n'oge karịa ka ihe nchọpụta ahụrụ anya tụwara anya. Nke a pụtara na a ga-etighachirịrị ihe niile, onye nyocha na Rift Valley Research Service na Ethiopia nakwa onye so dee nlebaanya a, Berhane Asfaw kwuru nke a. Ruo ugbua, AOL enweele ike kpalie ma melite ahịa IM ka osiri chọ, n'ihi otu osiri zuo ọha onụ n'ime mba Yunaịted Steeti. N’inwe mkwado a n’ọnọdụ, nnwereonwe a nwere ike ịgwụ. Ọnụọgụgụ mmadụ ndị ojiji ọrụ Yahuu! na Maịkrosọftụ ejikọta ha ga-… ọnụọgụgụ ndị ahịa AOL. Emere ụlọ akụ Northern Rock nke obodo na 2008 mgbe achọpụtara na ụlọ ọrụ a natara nkwado ihe mberede n'aka Gọọmentị UK. Northern Rock chọburu nkwado maka mkpughepụ ya n'oge ọdụdọ nyefee ego mgbazinye ụlọ dị ọnụ ala na 2007. Otu Vejini nke Nnaukwu Richard Branson kweburu ụlọakụ ahụ ọnụ nke ndị nwe ụlọakụ ahụ anabataghị tupu e mee ụlọakụ ahụ nke mba nwe. N’afọ 2010, mgbe ọ ka bụ nke mba, e si na "ụlọ akụ ọjọọ" Northern Rock (Nkekọta Akụ) wee kewapụ ụlọ akụ dị ugbu a na high street Northern Rock plc. Vejịn egorola naanị 'ezigbo ụlọ akụ' nke Nọden Rọk; ọ bụghị ụlọ ọrụ ndozi akụ ya. Ekweere na nke a bụ oge nke ise n'akụkọ ihe mere eme ndị mmadụ na-ahụ ihe emechaara chọpụta site na nyochapụta ihe kemịstrị na ọbụ ihe si n'ụwa Maas daa n'ụwa anyị. N'ime ihe dị ka okwute si eluigwe 24,000 ama ama dara na ụwa, naanị ihe dị ka 34 ka egosiri na ha bụ ndị nwere mbido Martian. N’ime okwute ndi a, asiri na iri na ise si na meterorite si na igwe daa n’onwa Julai gara aga. Ụfọdụ okwute ahụ, ndị dị oke ụkọ n’Ụwa, bụ ndị a na-ere site na US$11,000 ruo $22,500 kwa aunsị, nke bụ ihe dị ka ugboro iri karịa ọnụahịa nke ọlaedo. Ka agbasiri oso a, Keselowski nwere onuogugu 2,250 nke mere oji buru onye isi na egwuregwu okwo ugbo. Onye nke mbụ ji pọyịnt asaa gafee Jọnsịn, onye nke abụọ gbatara pọyịnt 2243. Dịka onye nke atọ, Hamlin ji pọyịnt iri abụọ nọrọ n'azụ, mana o ji ise nọrọ n'ihu Bowyer. Kahne na Truex, Jr. bụ ndị nke ise na isii n'otu n'otu ma nwee pọyịnt 2,220 na 2,207. Stewart, Gordon, Kenseth na Harvick mejuru onodu iri kachasi maka egwuregwu okwo ugbo tinyere na o bu so oso ano foro n’oge a. Ndị agha mmiri mba US sị na ha na-eleba anya n'ihe mere. Ha kwukwara n'ozi ha zipuru, "Otu a nọ n'ọrụ ugbu a ịchọpụta usoro ga-akachasị mma iji wepụta ụgbọ mmiri a". Avenger class mine na emesho ugbommiri, ugbommiri ahu n’aga Puerto Princessa na Palawan. E kenyere ya ụgbọagha nke asaa nke ndị agha mmiri Amerịka nọ na Sasebo, Nagasaki dị na Japan. Ndị mwakpọ Mumbaị ahụ jiri ụgbọmmiri wee bịa na Nọvemba 26, 2008, ha ji ogbunigwe nta, ngwaagha kemmerenonwe bịa ma gbata ọtụtụ ebe nke gụnyere ọdụ ụgbọokporoigwe Chhatrapati Shivaji Terminus ndi mmadu juru na Ụlọ nkwari akụ Taj Mahal ama ama. Ọchịchọ na mkpokọta ozi nke David Headley enyerela aka ime ka arụmarụ ahụ nwee ike site n’aka ụmụ nwoke ndị ji egbe iri si n’otu militantị nke Pakịstan Laskhar-e-Taiba. Mbuso agha ahụ tinyere nnukwu nghọtahie n'etiti India na Pakịstan. Ndị ọrụ ndị ahụ sonyere ya, o kwere ndị obodo texas na a na-esoro usoro ichedo obodo na ọha. Perry kwuru hoo haa, "O nwere ebe ole na ole n’ụwa ndị ka dị kwadobe ịnagide ihe ịma aka a bịaranụ." Onye n'achị steeti sịkwara na, "Taa, anyị mụtara na ụfọdụ ụmụaka ruru ogo ịgụ akwụkwọ bụ ndị achọpụtara na ha na onye ọrịa ahụ nwere mmekọ." Ọ gara n’ihu ikwu, "Okwu a dị mkpa. Kwere nkwa anyị na sistemụ anyị na-arụ ọrụ nke ọma dị ka etu o kwesịrị." Ọ bụrụ eziokwu, nchọta ahụ mezuru afọ asatọ nke Allen chọrọ Musashi. Site na’usoro imepụta maapụ nke akwa osimiri eji ROV were chota ihe mebisiri. Akoro si n’otu n’ime ndi kasi baa ogaranya n’uwa, Allen etinyela nnukwu oke aku n’uba ya n’ime oru nchoputa ihe no na mmiri iji bido icho Musashi maka nnukwu aguu onwere gbasara agha. O nwetara otuto dị oke mkpa n'oge ya n'Atlanta ma bụrụ onye a họpụtara ma kwanyere ugwu maka ihe ọmụmụ uche-ọhụrụ nke mmepe obodo. Na 2009 enyere ya okwa National Superintendent nke afo ahụ. N'oge onyinye ahụ, ụlọ akwụkwọ ndị dị na Atlanta ahụla oke mmelite n'akara ule. N'oge n'eteghị aka, ndị ode akwụkwọ Atlanta depụtara akwụkwọ nke n'egosi nsogbu n'akara ule. Nkọwapụta ihe a chọpụtara gosiri na akara ule gbalitere ọsịịsọ nọkwara na-arụtụ aka na-asị na ụlọakwụkwọ ahụ choputara n'ime onwe na e nwere nsogbu mana ha emeghi ihe ọbụla gbasara ihe ha chọpụtara. Ihe akaebe mechara gosi na emetụrụ akwụkwọ ule ndị ahụ aka. A mara Hall, ya na ndị ụlọ ọrụ mmụta ndị ọzọ 34 ikpe na 2013. Gọọmentị mba Ireland na-adọ aka na ntị maka mkpa ọ dị ka ndị omeiwu dozie ọnọdụ ahụ. Onye nkwuchite goomenti kwuru si na o dikwazi mkpa site na anya ahu ike oha n’eze ma ikpe mpu na aga eti iwu a ozugbo enwere ike. Mịnịsta na-ahụ maka Ahụike gosiri nchegbu ya maka ọdịmma nke ndị mmadụ ndị gbasoro uru nwa oge nta dị na nnabata ọgwụ ike ndị ahụ, ma maka amamikpe ndị nke metụtara ọgwụ e nyefere kamgbe mgbanwe ndị na-abụghịzi iwu ugbu a banyere n'ọrụ. Jarque nọbụrụ na-emewa ọzụzụ egwuregwu tupu-oge na Coverciano na Itali na mbụ n’ụbọchị. Ọ nọbụrụ na họteelụ òtù ahụ n’ọdịnihu otu egwuregwu atụrụ arọ ya maka Sọnde megide Bolonia. Ọ nọbu n'ụlọ oriri na nkwari nke ndị otu ya na-akwado maka egwuregwu ha ga-agbasị Bolonia ezubere maka ụbọchị Sọnde. Ụgbọala ahụ na-aga Six Flags St. Louis nọ na Missouri ka otu egwu ga tiere igwe mmadụ kwụrụla ụgwọ egwu. Na elekere 1:15 nke ụtụtụ Saturday, dịka ndị akaebe kwuru, Bọọsụ ahụ na-agafere ọkụ na-acha akwụkwọ ndụ mgbe ụgbọ ala ahụ mere otu ntụgharị n'ihu ya. N'abalị Ọgọọst 9, anya oke ikuku Mọrakọt fọrọ kilomita iri asaa ka o ruo mpaghara Chaịna a na-akpọ Fujian. Ezubere oke ikuku ahụ ji ọsọ n'ogugo 11kph agbaje ụzọ Chaịna. E nyere ndị njem mmiri dịka ha na-eche n'okpuru okpomọkụ ruru digrii 90(F). Onyeisi ọkụ Scott Kouns kwuru, "Ọ bụ ụbọchị dị ọkụ n’ime Santa Clara ya na okpomọkụ nọ na 90s. Ogologo oge ọ bụla a tọrọ atọ n’igwe na-agba okirikiri ga-abụ ihe adighi nma, ikwu ntakịrị, o wee dịkarịa ala otu awa iji wepụta onye mbụ n'ụgbọ ahụ." Schumacher onye lara ezmuike-nka na afo 2006 mgbe otuchaara ugo na asoroma-mpi Fomula 1 ugboro asaa, di njikere inochi Felipe Massa meruru-ahu. Onye Brazil a merụrụ ahụ n'isi mgbe moto ya kpọkasịrị n'ọsọ moto Grand Prix 2009 na Họngarị. Oge e ruola Massa ịpụta ma opekata mpe ọ bụrụ ruo oge 2009 fọdụrụ. Arias nyochatara na o butere nje ahụ n'oke dị obere, Onye Ozi Nke Onye Isi Ala Rodrigo Arias kwuru. Ọnọdụ ahụike onyeisiala adịla mma, mana ọ ka ga-anọpụ anọpụ ruo ọtụtụ abalị. Ewepu ahuoku na akpiri n’egbu m mgbu, ahu di m enwere m ike iru oru site na telecommuting. Ana m ele anya ịlaghachi n'ọrụ m niile n'ụbọchị Mọnde", Arịas kwuru n'ozi ya. Felicia bu bu oke ifufe nke udi 4 na okwa onuogugu ajo ifufe nke Saffir-Simpson, mana o dara buruzia obere ifufe nke ana akpo tropikal depression tupu odajuo ubochi Tuzdee. Ihe fọdụrụ na ya butere maka mmiri ozizo n'ọtụtụ isuo, mana enwebeghị mkpesa ide mmiri m'ọbụ mmebi ihe. Ekowara ugwu ahụ, ruru sentimita 6.34 na inchi n’ogologo na Oahu, dịka akọwara dịka ‘ihe bara uru’. Ụfọdụ mmiri ozuzo ahụ bụ nke égbè eluigwe na àmụmà ugboro ugboro sonyere. Ejima Otter ahụ anwagidela ifeda ala na Kokoda ụnyaahụ dị ka Ndị ụgbọ elu PNG Flight CG4684, mana a kwụsigo otu ugboro na mbụ. Ihe dịka nkeji iri tupu oge a kara n'ọga erute site n'ọbịbịa nke abụọ ya o fesasịa. A chọtara ebe mkpọka ahụ taa ma ọ nweghịkwa nnwetaòhèrè iru ya nke mere ka tụba ndị uwe ojii abụọ n'oké ọhịa ka ewere ije ruo ebe ahụ wee chọọ ndị nwụfọrọ. Otu ihu igwe ọjọọ nke kpatara ọdịda nlotu ahụ gbochikwara ọchịchọ ahụ. Dị ka akụkọ kwuru, otu ụlọ n'ama Makbet gbariri n'ihi ohihi ikuku eji esi nri. Onye-oru ulo-oru mmanu-oku gas no na nzaghachi na ogige ahu mgbe otu onye-agbata-obi kpochara banyere mmiputa nke mmanu-oku gas. Mgbe onye si n'ụlọ ọrụ bịara, nkewa ụlọ ahụ enwuru ọkụ. O nweghị nnukwu mmerụ ahụ akọrọ, mana o pekata mpe ọ bụrụ mmadụ ise nọ n’ebe ahụ mgbe ihe mgbawa ahụ gbawara ka agwọrọ maka mgbaàmà nkụja. Onweghi onye nọbụrụ n’ime ulo N’oge ahụ, ihe fọrọ obere ka o ruo 100 ndị bi ebe ahụ ka a kpọkpụrụ site n’ebe ahụ. Ma gọlfụ na rọgbi adịla njikere ịbịaghachi n'egwuregwu Olimpik. Kọmitii Olimpik nke ụwa niile tụrụ ụtụ itinye egwuregwu ahụ n'ọgbakọ ndị isi ha n'obodo Belịn taa. Egwuregwu Rugbi, njikọ n'ahụ maka rugbi kpọmkwem, na gọlf ka ahọọrọ n'ime egwuregwu ise ndị ọzọ ka a ga atụle ma ọ ga eso na Olimpik. Egwuregwu skwash, karate na rola spọts nwakwara ịbanye na mmemme Olympic yana bezbọọlụ na sọftbọọlụ, ndị e si n'Egwuregwu Olympic wepụ n'afọ 2005. IOC n'uju ya ga akwadorịrị ụtụ ahụ n'ọgbakọ Ọktoba ha na Kopenhagen. Ọbụghị mmadụ niile kwadoro ntinye ụmụ nwanyị n'ọkwa. Amir Khan onye meritere onyinye ọla ọcha na Olimpik e mere na 2004 sị, "n'ala ala obi m echere m na ụmụnwanyị ekwesịghị ịlụ ọgụ. Nke ahụ bụ echiche m." Agbanyeghị ihe ndị o kwuburu, ọ sị na ọ ga-akwado ndị egwuregwu Briten na 2012 Olimpiks a na-eme na Lọndọn. E kpere ikpe ahụ n’Ụlọ Ikpe Birmingham Crown ma kpechaa ya na Ọgọst 3. Onye nta akụkọ, nke a nwụdoro n'ebe ihe mere, gọnarịrị mwakpọ ahụ ma sị na o ji polu ahụ were chekwaa onwe ya site na ụmụ karama a na-atụ ya site n'aka ndị ruru ndị mmadụ iri na atọ. Ikpe sokwere maa Blake maka ịnwa ibugharị usoro ikpe ziri ezi. Onye oka-ikpe ahu gwara Blake na obu “ohere kariri na onweghi-ihe mgbochi” na ana aga itinye ya na nga. Ikike Ojii bụ ike anaghị ahụ anya, nke na-arụ ọrụ n'ụwa kwa mgbe. Naanị ihe e ji mara na ihe dị otu a dị bụ maka ihe ọ na-eme na mmụba igwe na ala. . Ndị ọka mmụta sayensị achọpụtala ihe dịka ala nke gbasara n'ihu onwa nke akpọrọ lobet skaps nke nwere ike ịbụ ihe sitere n'ọnwa ịchịkọta nwayọ nwayọ. Skap ndị a ka achọpụtara gburugburu ọnwa ha dịkwa ka ihe ribatụrụ eriba, nke na-egosi na ihe mmegharị ala kpatara ya eteghị aka omere. Atụtụ a na-emegide atụmatụ na-akọwa na o nweghi ihe mmegharị ala nke n'eme n'ọnwa. Nwoke ahụ kwọrọ n'ebubo ụgbọ ala nwere ụkwụ atọ eji ihe mgbawa gasị jikere kwaba n'ime igwe mmadụ. Ejidere onye echere na ọbụ ya gbasuru ogbunigwe ahụ, ka omerụchara ahụ n'ihi mgbari ogbunigwe ahụ. Ndị isi amatabeghi aha ya, mana ha ma na ọ bụ onye otu agbụrụ Uigọọ. Nadia, amụrụ na Septemba 17, 2007, site n'Iwa afọ n'otu ụlọ ọgwụ ndị nne nọ na Aleisk, Rọshịa, nwere nnukwu ibu bụ 17 paụnd 1 ounce. Nne ha kwuru sị, “Anyị niile nọ nnọọ na mgbagwojuanya”. Mgbe a jụrụ ya ihe nna kwuru, ọ zara “O nwenwughị ike ikwu otu ihe - ọ dị nnọọ kwụrụ ebe ahụ na-atabianya.” Ona aga ikpa-agwa ka mmiri. ana-ahu site nime ya dika esi emekwa na mmiri. Ọ bụrụ na ị kwụrụ n'ụsọ mmiri, ị ga enwe ike ịhụ okwute maọbụ unyi dị n'ala ya. Ka anyị madebere, sọ otu ụwa na-egosi ọtụtụ ike karịa Taịtan, ma aha ya bụ Earth" Stofan tinyere. Nsogbu bidoro n'ụbọchị Jenụwarị 1 mgbe ọtụtụ ndị bi n'ebe ahụ bidoro bawa mba n'ụlọọrụ nzipụ ozi nke Obanazawa na ha enwetabeghi ozi ha na-enwetawa oge afọ ọhụrụ. Ụnyaahụ, ụlọ ọrụ nzipụ wepụtara arịrịọ mgbaghara ha nye ụmụ amaala na ndị mgbasa ozi mgbe ha chọpụtara na nwata nwoke ahụ zochiri akwụkwọ nzipu ozi karịrị narị isii, gụnyere akwukwo ozi Afọ Ọhụrụ narị anọ na iri abụọ na itoolu, nke ndị a na-enyefebeghị ndị nnata ha bu n’obi. Igwe nfegharị ọnwa a na-akpọ Chandrayaan-1 nke mmadụ anọghị nyụpụrụ Moon Impact Probe (MIP) ya n'ike, nke gbafere elu ọnwa n'ọsọ kilomita 1.5 kwa nkeji (kilomita 3000 kwa awa), wee mechaa kpọkasịa na nso Ọwụwa Anyanwụ nke ọnwa. Karịa ngwa sayensị atọ dị mkpa o bu, ụgbọ nchọpụta ihu ọnwa bukwa onyonyo ọkọlọtọ nke obodo india, nke etere ka agba n'akụkụ ya nile. Ana m ekele ndị kwadoro onye amagoro ikpe dịka m, Siriporn kwuru n'otu nzukọ ndị nta akụkọ. "Ụfọdụ nwere ike ha agaghị ekwe mana achoghị m ịma. Obị dị m ụtọ na o nwere ndị chọrọ ịkwado m. Kemgbe nwere onwe obodo Pakịstan n'aka ọchịchị Briten na 1947, onye isi obodo Pakịstan ahọpụtala "Ndị ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị" ịchị FATA, ndị ọfọdụrụ ka ha nwee ike ọchịchị kpamkpam n'ebe ndị ahụ. Ndị ọrụ ndị a na-ahụ maka ịnye ụmụ ọrụ gọọmentị na ìkpé ikpe n'okpuru Nkeji edemede narị abụọ na iri anọ na asaa nke Iwu Pakistan. Ebe obibi na Mecca dara na, ebe di nso ndi alakuba n’elekere 10 nke ututu oge obodo anyi. Ụfọdụ ndị njem ala nsọ bịara ịhụ obodo nsọ n'abalị na-esote hajj nọrọ n'ụlọ a. Ndị na-abịakarị n'ụlọ mbinigwe ahụ bụ ndị mba Yunaịtedị Arabụ Emireti. Onu ogugu ndi nwuru-anwu di opekata-mpe 15, onu ogugu bu nke ana atu-anya na oga agbago. Leonov, onye a makwaara dịka "ọganambaraigwe nke 11", sobu n'otu ndị na-aga na mbara igwe mbụ nke Sọviyetị Yunịọnụ. Na Machị 18, 1965, o mere ihe omume kemgbagharị ụgbọ (EVA) mbụ, maọbụ "njem n'eluigwe", ebe ọ nọọrọ naanị ya na mpụta ụgbọ elu ahụ ruo nkeji iri na abụọ. Ọ natara “Dike nke Òtù Soviet ahụ”, ugwu nke Òtù Soviet kachasị elu, maka ọrụ ya. Ka afọ iri gachara, o duuru ngalaba Sọviet nke ozi Apolo Soyuz nke gosiri na ọsọ gbasara oghere mpụga uwa eruola na njedebe. O kwuru, "Enweghị ihe ọmụma na-atụ aka na a ga-enwe mwakpo mgbe na-adịghị anya. Kama mweda nke ogugo iyi egwu ruo ogugo siri ike apụtaghị na ihe iyi egwu nile agaala." Ka ndị isi na-atụgharị uche gbasara ntụkwasị obi n'ihe iyi egwu ahụ, ndị ọchịchị njem Meriland mechiri njem site na nkwado FBI. E jiri ụmụ wongworo mkpofu igbochi ụmụ mbata tuubu ma enyemaka nke ndị uwe ojii 80 nọ anọ iduzi ndị na-anya ụgbọ ala n’ụzọ ndị ọzọ. Anụghị akụkọ maka ogbugbu oge ọbụla mere na beltwee, okporo ụzọ nke ọzọ obodo a nwere. Naịjiria kwuputara n'oge gara aga na ọtụrụ atụmatụ isonye AfCFTA n'izuka tupu ọgbakọ ahụ Albert Muchunga, bụ onye isi ire ahịa n'ụlọ ọrụ AU kwuputara na Benin ga esonye. Onye kọmishọna kwuru, "Anyị enwebeghị nkwekọrịta maka iwu nke ebe mmepụta na mwepụ ụgwọ mbubata, mana atụmatụ anyị nwere zuru oke iji malite zụwa ahịa na Julaị 1, 2020". Ọdụ ụgbọ nọ n’eluụwa ahụ nọgidere na-akpa àgwà, n'agbanyeghị ofufu gyroscope na mbụ na ozi ọdụ ụgbọ nọ n’eluụwa, ruo na njedebe nke ịga ije n’elu ụwa. Chiao na Sharipov kwuru na ha nọ n'oteaka ngwa ndozi arimelu. Mgbe ndị Rọshia si n'ala ahazi ihe tinyere ụgbọelu ndị ahụ n'ọrụ, steshọn ebido kpawa ezi agwa ọzọ. Ekpere ikpe ahụ na Vejinia n'ihi n'ọbụ ọnọdụ isi nweta ịntanetị bụ AOL, bụ ụlọọrụ wetara mkpesa ndị ahụ. Nke a bụ mbụ a na-ekpe mmadụ ikpe site n'iji iwu enyere na 2003 iji gbochie e-mail igwe, nke a na-akpọ spam, na mgbasa ruo n'ime igbe ozi ndị na-achọghị ya. Jesus di afo 21 sonyere Manchester City afo gara aga na Januari 2017 o si Klub Brazil ana akpo Palmeiras k’akuko siko akwuru nde £27. Kemgbe ahụ, onye Brazil a agbaala n'egwuregwu 53 maka klọb a n'asọmpi niile ma yọọ gol 24. Dr. Lee gosikwara nchegbu ya banyere akụkọ kwuru na ụmụaka nọ na Tọki eburula ọrịa A(H5N1) evian influenza vaịrụs n'adaghị ọrịa. O kwuru na nchọpụta ụfọdụ na-akọwa na ọrịa ahụ agaghị enwecha ike ibute ọnwụ tupu o bute ntiwapụ ọrịa n'ụwa dum. E nwere nchegbu na ndị ọrịa nwere ike ị gaa n’ihu na-ebufekwu ndị mmadụ ọzọ ọrịa ahụ site na ịga n’omume ha na eme kwa ụbọchị ma ọ bụrụ na mgbaàmà flu ahụ nọgidesie ike. Leslie Aun, onye nkwuchite maka otu enyemaka Komen, kwuru na otu ahụ webatara iwu ọhụrụ nke anaghị enye ohere ego enyemaka ma ọ bụ nnyemego ka enye ya ụmụ otu ndị nọ n’okpuru nnyocha iwu. Usoro omume ihe Komen ekwenyeghị n'ịbụ nne na nna ezubere ezube n'ihi nyocha na-abịa abịa nke gbasara otu ịbụ nne na nna ezubere ezube si emefu ma na enye mkpesa ka osiri mefu ego nke onye nnọchiteanya bụ Kliff Stens na-eme. Stearns na eme nyocha ichoputa ma eji utu-isi akwu-ugwo ite-ime site na ibu nne na nna ahaziri ahzi site n’oru dika onye-isi-oche nke ngalaba na ahu maka nlaba anya nyochasi, nke no n’ukpuru otu nke ulo ikike na azum-aha. Gọvanọ steeti Masachusets gara aga, Mitt Romney, meriri ntuliaka praịmarị maka nhọrọ onye isi ala nke mpaghara otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Rịpọblikan nọ na Flọrida mere n'ụbọchị Tusdee ebe o nwetara karịa pasent 46 na vootu niile. Onye bụbu Ọkaokwu Ụlọnnọchiteanya mba Amerịka bụ Newt Gingrich ji pasentị 32 gbata onye nke abụọ. Dịka steeti onye meriri-na-ewere ihe niile, Florida nyere ndị nnọchi anya iri ise ha niile nye Romney, na-akwaga ya n'ihu dị ka onye na-agba oso ihu na nhọpụta nke Otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Republican. Ndị nhazi ngagharị iwe ahụ kwuru n’ihe dị ka ndị mmadụ 100,000 bịara n’ụmụ obodo nke Jamanị dị ka Berlin, Cologne, Hamburg, na Hanover. Na Berlin, ndị uwe ojii mere atụmatụ ndị ngaghari iwe 6500. Ngagharị iwe mekwara na Paris, Sofia n’ime Bulgaria, Vilnius n’ime Lithuania, Valetta n’ime Malta, Tallinn n’ime Estonia, na Edinburgh ma Glasgow n’ime Scotland. Na Lọndọn ihe ruru mmadụ narị abụọ kpesara n'ihu ụfọdụ ụlọọrụ isi nwebisiinka. N'ọnwa gara aga, enwere ọtụtụ ngagharị iwe na Poland mgbe obodo a nyere ACTA nkwenye ha, nke mere ka gọọmenti Poland kpebie na ha ka ga-echere tupu ha asị nkwekọrịta ahụ gaa n'ihu.. Ma Latvia ma Slovakia egbuola oge nke usoro isonyere ACTA. Otu Animal Liberation na elekota maka na otu n’afu na akwusiri mmegbu umuanumanu nke ana akpo Royal Society for the Prevention of Cruelty to Animals (RSPCA) akpola oku maka itinye igwefoto CCTV n’ime ebe niile ana egbu anu n’Australia. Onye-isi ndi uwe-oji nke South Wales Ohuu RSPCA David O'Shannessy gwara ABC na nleba-anya na nyocha nke ulo-igbu-anu kwesiri idi kwa-mgbe na Australia. Igwefoto ahụ ga ezijeriri ozi siri ike nye ndị na azụ anụmanụ na odịmma ha bụ ihe kacha mkpa. Maapụ ala ọma jijiji ụwa nke United States Geological Survey gosiri na ala ọma jijiji emeghị na Iceland n'izu gasịrị tupu nke a. Ọfis Mitiọrọlọjikal nke Aịzilandị kọkwara na o nweghi ihe omume ala ọma jijiji mere n’ebe Hekla n’oge awa iri anọ na asatọ gara aga. Ala ọma jijiji ahụ dị ịrịba ama butere mgbanwe mere n'ụbọchị nke iri n'ọnwa Maachị n'ugwu ọwụwa anyanwụ nke isi ugwu mgbawa kaldera. Akọrọ akụkọ igwe ojii n'enweghị ihe gbasara ha n'ihe omume ugwu mgbawa n'ụkwụ ugwu ahụ Urukpu igwe gosipụtara ohere nke a na-enweghị ike ịkọwa ma ntiwapụ o meela n'ezie. The Luno nwere kubik mita 120-160 nke mmanụ n'ime ya mgbe o mebiri ma oke ifufe na ebili mmiri dubara ya n'ime brekwọta ahụ. Helịkọpta napụtara ndị onya ụgbọ iri na abụọ ahụ ma sọ mmerụ ahụ enwere bụ mgbawa imi. Ụgbọ mmiri toruru mita otu narị nọ n'ụzọ ibute fatịlaịza mana na mbụ ndị ọrụ nọ n'ụjọ ya iwufu ụfọdụ ibu. Ndozigharị iwu achọrọ agafeela ụlọ abụọ ahụ na 2011. E mere otu mgbanwe n’oge imeiwu a mgbe ehichapụrụ ahịrị abụọ ahụ mbụ site n’aka Ụlọ ndị Nnọchiteanya ma mgbe ahụ ekwenye na ya n’ụzọ yiri site n’aka Mọnde Ndị Omeiwu. Odida ahiriokwu nke abuo, nke na-asi ka amachibido alum di nwoke na nwoke ma o bu nwanyi na nwanyi nwere ike imeghe uzo ka enwe civil union n’ihu. Esowe usoro ahụ, ndị ome iwu na-abịa abịa ga elebara HJR-3 anya ọzọ n'afọ 2015 m'ọbụ 2016. Ihe mmeta nke Vautier na-anọghị na ngalaba nduzi ihe ngosi gụnyere ịkwụ agụụ na 1973 megide ihe ọ hụrụ dị ka nnyocha ndọrọndọrọ ọchịchị. E degharịrị iwu Fransị. Mbido mmume mgbanwe ọchịchị ya sitere n'afọ iri na ise mgbe o sonyere Ndị Agha Nguzogide Nke Fransị n'oge Agha Ụwa nke abụọ. Ọ dere ihe gbasara onwe ya na akwụkwọ afọ 1998. Na oge 1960 olaghachiri azu n’obodo Algeria nwere onwe ya ohuu ikuzi maka film directing. Onye mba Japan Hitoshi Saịto bụ onye ọgụ egwuregwu judo, bụkwa onye meriri onyinye ọla edo nke Olimpik ugboro abụọ, anwụọla ka ọ dị afọ iri ise na anọ. Asiri na ihe gburu ya bu intrahepatic bile duct kansa. Ọ nwụrụ n’ime Osaka na Tusdee. Ọ bụbu onye egwuregwu Olympic na onye mmeri n’egwuregwu ụwa, Saito bụ onye isi oche kọmiti ozuzu egwuregwu Japan Judo Federation n’oge ọ nwụrụ. Opekata mpe ihe dịka 100 mmadụ gara nnọkọ ahụ, maka isonye na mmemme ncheta otu afọ alụmdinanwunye otu di na nwunye e mere agbamakwụkwọ ha n’afọ gara aga. Ndi isi si na, ihe omume nke ncheta nke onye-obula ga ama maka ya ka aga etinye na oge na abia. Ha lụrụ di na nwunye otu afọ gara aga na Tekzas were bịa Buffalo ka ha na ndị enyi makwa ezinụlọ me mmemme. Di ya dị afọ iri atọ, onye a mụrụ na Buffalo, bụ otu onye n’ime mmadụ anọ e gburu n’egbe ahụ a gbara, mana nwunye ya emerụghị ahụ. Karno bụ onye a mara nke ọma ma bụrụkwa onye nkuzi Bekee omume ya na-ebute mgbagha, ọ kuziri n’okpuru Mmụta agba ọhụrụ na Ebube Eze ọ sịrị na ụmụakwụkwọ ya ruru 9,000 oge ike ọrụ ya kacha. Edemede ya nwere mkpụrụ okwu ụfọdụ nne na nna cheere na odịghị mma, ekpesakwara na ọ na-ekwu okwu rụrụ arụ n'ụlọ nkụzi Ọmụmụ nke Ọlọrọ ọhụrụ boro ya ebubo nke ibipụta ụmụ mgbasa ozi ahịa buru ibu n’ụmụ bọọsụ na-enweghị ikikere ma na-atụ asị n’ikwu na ọ bụ onye isi ndị nkuzi Bekee. Ebobukwara ya ebubo ịda iwu nwebisiinka, mana amaghị ya ikpe. Otu nwa akwukwo ochie kwuru si na ya ‘na-asu asusu nkiti nime klassi, kuzie ukpuru iyi-oyi nime akwukwo, ma diri ka nno ka enyi umu akwukwo’. Mgbe afọ iri atọ gara aga gachara, n’agbanyeghị na ha nọ na kọmunisti steeti, China akwalitela azụmaahia obodo ha. E mepụtara mmezi akụ na ụba mbụ n’okpuru ọchịchị nke Deng Xiaoping. Kemgbe ahụ, akụnụba obodo Chaịna ejirila mmaji iri itolu too. Nke a bụ mbụ ọ na-eme, n'afọ gara aga Chaịna bupuru ụgbọala karịa Jamani ma gafere Amerịka dịka ahịa kachasị ukwu maka ụlọọrụ a. Aku na Uba mba China nwere ike idi ukwu karia nke mba United State na agbata ogu-afo abuo Oké mmiri ozuzo N’ebe okpomọkụ Danielle, oké mmiri ozuzo nke anọ enyere aha nke oge ajọ ifufe Atlantik 2010 ahụ, akpụọla n’ime ebe ọwụwa anyanwụ Oke osimiri Atlantik. Ifufe ahu, di ebe 3,000miles na Miami, Florida, o nwere ikuku ruru 40mph(64 kph). Ndị ọka mmụta sayensị na n'ụlọ nyocha ajọ ikuku nke obodo ekwuola na oke ikuku Daniel ga aghọ ajọ ikuku na ụbọchị Wenezde. Dị ka oké mmiri ozuzo ahụ ka toro aka site n’imetụ n’ala, ọ ka na-ara ahụ inyocha etu o nwere ike isi metụta United States ma ọ bụ Caribbean. A mụrụ n’isi obodo Kroeshịa, Zagreb, Bobek nwetara ọmụma mgbe ọ na-agbara Partizan Belgradi. O sonyere ha na 1945 ma nọrọ ruo 1958. Na oge ya na ndi otu egu ahu, osuiri okpo goolu 403 na mputa 468. O nwebeghị onye ọzọ ọbụla na-agbakarịala bọọlụ maọbụ nyekarịa goolụ n'otu egwuregwu bọọlụ ahụ karịa Bobek. N'afọ 1995 a tụrụ ụtụ chiri ya onye kacha n'egwuregwu n'akụkọ ihe mere eme nke Patizan. Ihe e ji bido mmemme bụ ihe ngosi ọpụrụiche nke Sek du Solei, otu a maara aha ha n'ụwa dum, mere. Ihe sotere ya bụ Simfoni Ọkestra Steeti Istanbul, Otu egwu ndị Janisrị, na Fatih Erkoç na Müslüm Gürses, ndị abụ abụọ. Mgbe ahụ ndị okpukpe ọgba egwu ntụgharị gbogotere n’elu nkwago. Onye Tọki diva Sezen Aksu mere emume ngosi ya na onye Itali ahụ tenor Alessandro Safina na ọgụ egwu onye Griik Haris Alexiou. Na ngwụcha, ndị otu igba egwu nke Tọki gosiri ihe ngosi "Troị". Peter Lenz, onye ọgba ọsọ ọgba tum tum gbara afọ iri na atọ, anwụọla mgbe o sonyere n’ime otu mkpọka na Indianapolis Motor Speedway ahụ. Dị ka ọ ka nọ na laapụ ikpo ahụ ọkụ ya, Lenz dapụrụ n’igwe ya, ma mgbe ahụ a kụrụ ya site n’aka onye ọgba ọsọ ibe ya Xavier Zayat. Ndị ọrụ ahụike nọ na trak letara ya ozugbo, e wee buru ya gaa n'ụlọ ọgwụ dị na mpaghara ahụ ebe ọ mechara nwụọ. Zayat ahụghị ihe mberede ahụ. Gbasara onodu ego n’uwa niile, Zapatero n’ekwu si na "usoro eji akpa ego bu otu nkewaputa di n’ime usoro eji akpa aku n’uba, nkewaputa di ezigbo mkpa. Anyi anọọla otu afọ n'ụkọ ego, ọnwa abụọ gara aga bụ oge ọkacha njo, mana echerem na ahịa ego na-agbake." N’izu gara aga, Akụkọ Gba ọtọ mara ọkwa na ọ ga-amụba ikike asụsụ mba ụwa ya nye ịkọ akụkọ, ya na mgbasa ozi atọ ọhụrụ. Ka a na-akọ akụkọ n'asụsụ Bekee na asụsụ Japan ugbua, ụlọọrụ zuzugbe na-amalitebe ihe omume n'asụsụ Spenụ, Itali na Koria, maka televishọn, weebụ, na ngwaọrụ mkpanaka. Isi awele m mere onweghi ihe mere m, mana ahuru m ajoo ihe ebe a, ka ndi mmadu n’akuwasi windo n’acho ka ha ga esi puta. Ndị mmadụ ji oche na-akụ ndasị ndị ahụ, mana ntapu ndị ahụ ekweghi nkụwa. Otu n'ime ndasị ndị ahụ mechara kụwaa, ha wee si na ntapu na-apụ," onye lanarịrị ihe mberede bụ Franciszek Kowal kwuru nke a. Kpakpando ga na-enyepụ ọkụ na okpomọkụ site n'ike nke na-adị mgbe atọm haịdurojin ga na-amakọta wee mebe elementị ndị ka n'arọ. Ndị ọka mmụta sayensị na-arụ ọrụ ịrụpụta igwe si oti ahụ eme ike. Nke a, otú ọ dị, bụ otu nsogbu tara ezigbo akpụ idozi ma ga-ewe ọtụtụ afọ tupu anyị ahụ fushọn rịaktọ ndị bara uru a rụrụ. Agịga igwe n'ese n'elu mmiri n'ihi ike n'arụ ọrụ n'elu mmiri. Nsogbu ahụ mere n’ihi na mkpụrụ mmiri ahụ nke mọlekùl dị n’elu mmiri dị ike ma mee ka ndịọzọ karịa ka ha si enweta ihe ikuku dị n’elu ha. Ụmụ irighiri ihe nke mmiri na-eme akpụkpọ na-adịghị ahụ anya n’elu mmiri nke na-eme ka ihe dị ka agịga wee see n’elu mmiri. Bleedi nọ n'akpụkpọ ụkwụ aịz sketị nke ugbua nwere akụkụ abụọ nke oghere dabara ime dị n'etiti ha. Akụkụ abụọ a na-eme ka o jide aịz nke ọma karịa, ma mgbe o hulatara n'otu akụkụ. N'ihi na okpuru agụba ahụ rọrọ arọ nwa obere, ka agụba ahụ na-arọje n'otu akụkụ maọbụ nke ọzọ, akụkụ ahu nke na-emetụ mkpụrụ mmiri ga arọkwa. Nke a na-eme ka onye na-agba skeeti tụgharịa. Ọ bụrụ na skeeti atụlaga n'aka nri, onye na-agba ya atụlagakwa n'aka nri, ọ bụrụ na skeeti atụlaga n'aka ekpe, onye na-agba ya atụlagakwa n'aka ekpe. Ma ha chọ ịlaghachi n'ogugo ike ha nọbụ na ya, ha ga ewepụrịrị ike ha natara ọkụ. Ha na-eme nkea site na-ịgbasa obere urughuru ọkụ a na akpọ "fotọn". Ndị ọkammụta sayensị kpọrọ usoro a "mkpalite mmepụta radiyeshọnụ" maka na ọkụ na-egbuke egbuke na-akpali atọm, nke na-ebute mmepụta ọkụ fotọn, ma ọkụ bụkwa otu ụdị radiyeshọnụ. Foto nke na-esote na-egosie ebe ụmụ atọm a na-anyụpụ fotọn gasị. N'ezie, fotọn pere mpe karịa etu i si ahụ na foto a. Photons dị obere karịa ihe dị n'ime atom! Ka ọtụtụ narị awa a rụchara ọrụ, filament na ọkụ ahụ mechara gbaa ọkụ ma bọlbụ ọkụ ahụ anaghịzi arụ ọrụ. Ugbu a oge e ji agbanwe ọkụ a eruola. Mmadụ aghaghị ịkpachara anya mgbe ọ na-agbanwe ọkụ a. Nke mbu, ekwesịrị ịgbanyụ ihe ngbanye ọkụ ma ọ bụ na-ewepụrụ ihe eriri ọkụ ya N’ihi na oku latrik nke na-abanye na soket ebe akuku bolbu nwere metal na anodu nwere ike inye gi eletrik shok o buru na imetu ime soket ahu aka ma o bu ebe metal ahu di na bolbu mgbe o ka di na soket. Obi, nke na-agbasa ọbara, bụ akụkụ ahụ kachasị mkpa n'usoro mgbasa ọbara dị n'ahụ mmadụ. Ọbara na-apụ site n'obi n'ime tuubu ndị a na-akpọ akwara ọbara ma na-alọghachi n’obi mmadụ n’ime tuubu ndị a na-akpọ akwara ọbara. Tuubu ndị kachasị obere ka a na-akpọ kapịlarị. Eze traịserotọpsụ ga-enweli ike ịgbari ọ bụghị naanị akwụkwọ osisi mana ọbụlagodi mpalaga osisi na mgbọrọgwụ ndị siri ezigbo ike. Ụfọdụ ndị ọka mmụta sayensị chere na Traịseratọpsụ jiri kaịad, nke bụ ụdị osisi dị ebe nile na Kretashiọs mere nri. Osisi ndia ndi yiri oburu obere ukwu nkwu nwere okpu ahihia mpipi, na adu-adu. Tụraịserotọpsụ nwere ike bụrụ na ọ na-eji ọnụ mpịa ya siri ike atụchasị akwụkwọ osisi tupu o riwe ogwe osisi ahụ. Ndị ọkammụta ndị ọzọ na-ekwu na ebe osisi ndị a na-ebute ọrịa, ọ dịghị ka daịnosọọ ọbụla ọ tara ha, agbanyeghị na taa ụmụanụmanụ dị ka slọtụ nakwa icheku (nke si n'agbụrụ daịnosọọ) nwere ike iri akwụkwọ nri maọbụ mkpụrụ osisi na-emerụ ahụ. Kedụ ka ike ndọda nke lo si adọm? Ọbụrụ na ịkwụrụ n'elu lo, Ị ga-ada obere karịa ka Ị si ada n'ụwa anyị. Onye na-ada paụndụ 200 (kg90) n'ụwa ga-ada ihe dịka paụndụ 36 (kg16) na lo. Ya bụ na ike ndọda, dịka ọ dị, anaghị adọsi gị ike. Anyanwụ enweghị ala kpọrọ mkpọ dị ka Ụwa nke ị nwere ike ịkwụ n’elu ya. Anyanwụ niile bụ ụmụ gaasị, ọkụ, na plasma mejupụtara ya. Gaasị ahụ ga-adị gịrịrị ka ị ga-aga site n’etiti anyanwụ. Mpaghara mputa nkea anyi ahu ma anyi lee Anyanwu anya ka ana akpo photospere, nke putara "bọọlụ nke ọkụ". Ka e mechara n’ihe dịka afọ puku atọ, na 1610, Onye Itali bụ ọkammuta n'amụmamụ mabaraigwe Galileo Galilei jiri teleskopụ wee nyote na Venus nwere agba ga, dịka ọnwa nwere. Usoro feezi na-eme n’ihi naanị akụkụ Venus (ma ọ bụ nke Ọnwa) chewere ihu n’Anyanwụ ahụ mụnyere ọkụ. Usoro feezi nke Venus kwadoro tiori nke Copernicus na ụmụ mbara ala na-agba Anyanwụ gburugburu. Mgbe ahụ, afọ ole na ole gachara na 1639, otu onye Bekee ọkachamara na mbara igwe aha ya bụ Jeremiah Horrocks nyotere otu njem nke Venus. England enweela udo ogologo oge kamgbe ha merigharị Danelaw n'agha. Otu ọ dịna na 991 Etelred buru agha megide ndị agha mmiri Vaịkịn ka nke ọbụla kemgbe nke Gutrum otu narị afọ gara aga. Onye isi agha a bụ Olaf Trygvasson, onye obodo Nọọwe onye chọrọ ịnapụta obodo ya n'aka nchịkwa ndị obodo Denmak. Mgbe ha nwechara ihe ọdachi agha n’isi mbụ, Ethelred kwenyeziri n’usoro nke nkwekọrịta Olaf, onye laghachịrị na Norway iji nwàa iwetaghachi obodo ya n’iji ngwakọrịta ọganiihu. Hangeul bụ naanị mkpụrụ edemede a ka na-eji kwa ụbọchị taa nke akpachara anya kepụta. E kepụtara mkpụrụ edemede ahụ n'afọ 1444 n'oge ọchịchị nke Eze Sejong (1418 – 1450). Eze Sejong bụ eze nke anọ nke Usoro ndi eze Joseon ma ọ bụkwa otu n’ime ndị a kacha akwanyere ugwu. Na mbụ ọ gụrụ akara edemede Hangeul, Hunmin Jeongeum, nke pụtara "ụda kwesịrị maka ntuziaka ndị mmadụ". Enwere ọtụtụ akụkọ maka etu e si mepụta asụsụ Sanskrit. Otu n'ime ha bụ na o si n'aka ndị Aryan jiiri asụsụ ha si n'ọdịda anyanwụ bata India. Sanskrit bụ asụsụ mgbe gboo bụrụkwa nke enwere ike ịtụnyere asụsụ Latịn a na asụ na Yuropu. Akwụkwọ mbụ a maara n'ụwa a bụ asụsụ Sanskrit ka e ji dee ya. Mgbe a chịkọtachara Upanishads, asụsụ ndị ọzọ ewere ọnọdụ sanskrit. Sanskrit bụ asụsụ bara ụba ma dị mgbagwoju anya, nke bụ isi mmalite ọtụtụ asụsụ obodo India taa, dịka Latịn siri bụrụ isi mmalite asụsụ mba Iroopu dịka Frenchị na Spaniishi. Ebe agha banyere mba France agafela, mba Germany ebido kwadowa maka iba mba-mmiri nke Britain na-ike. Aha koodu Germany kpọrọ mwakpo ahụ bụ "Operation Sealion". Ọtụtụ ngwa agha na ihe agha ndị agha Britain furu efu mgbe ha siri na Dunkirk pụọ, yabụ na ndị agha adịchaghị ike. Ma na ndi agha mmiri mmiri mba Britain ka ndi agha mmmiri ndi Germany ("kriesmarine") were sie ike. ha kara imemina ugbo ala obula ezipuru n’owa bekee. Ma ka o si dị, ụgbọ mmiri agha ole m'ole nọchiri ụzọ dị ka ụzọ mwakpo agha ebe ndị isi agha nọ n'ụjọ na ndị agha ikuku Jamani ga emi ụgbọ mmiri ha. Ka anyị bido n’otu nkọwa gnasara atụmatụ nke Itali. Itali bụ tụmadị “obere nwanne nwoke” nke Jamani na Japanụ. O nwere ndị agha ala na nke mmiri n’adịghị ike, n’agbanyeghi na ha ka rụchara ụgbọmmiri anọ ọhụụ tupu agha ebido. Isi ihe mgbaru ọsọ mba Itali bụ mba Afrịka dị iche iche. Ịnwudo obodo ndị ahụ, ha ga enwe ebe esi ezipu ndị agha, ka ndị agha nwee ike kwọọ ụgbọ kwọfee oke osimiri Mediterenia wee wakpo mba Afrịka. N'ihi nke a, ha lara ntọala ndị agha ma ụgbọ mmiri agha mba Briten dị n'obodo Ijipt n'iyi. Ewepụ omume ndị a, ụgbọ mmiri agha ndị Itali ekwesịghị ime ihe ọzọ. Ugbua maka Japan. Japan bụbu obodo isuo, dịka Briten. Ụgbọ okpuru mmiri bụ ụgbọ mmiri arụrụ maka njem n'okpuru mmiri, ma nọrọ ebe ahụ oge tere aka. E jiri ụgbọ okpuru mmiri lụọ Agha Ụwa I na Agha Ụwa II. N’oge ahụ ha na-aga nnọọ nwayọ ma nwekwaa ohere ọgbụgba pere mpe. Na mbido agha ha nọ na-aga naanị n’elu mmiri mana a ihe nnataozi n'ikuku bidoro rụwa ọrụ nke ọma ụgbọokpurummiri enweghizi ihe ọzọ ọ ga-eme n'abụghị ịgbada n'okpuru mmiri ka a ghara ịhụ ya. A na-akpọ ụgbọ okpuru mmiri ndị Germany U-Boat. Ndị Germany maara anya ụgbọ okpuru mmiri ha ọfụma N'ihi ọga n'ihu ha n'iji ụgbọ okpuru mmiri, ka agha gasịrị ndị obodo Jamani abụghị ndị atụkwasịrị obi inwe ọtụtụ n'ime ha. Ee! Eze Tutankhamun, oge ụfọdụ amaara ya dịka "Eze Tut" maọbụ "Eze nwa", bụ onye eze amaara mgbe ochie n’Egypt n’oge ugbu a. O nwere ike ịtụ gị n'anya na ewereghị ya dịka oke mmadụ n’oge ochie nakwa edenyeghị aha ya n’ọtụtụ ndetu aha ndị eze mgbe ochie. Ma ka o si dị, nchọpụta ebe olili ya n'afọ 1922 mere ya onye ịrịba ama. Mgbe a na ezu ebe olili mgbe gboo ohi, emetụghị nke a aka. Ọtụtụ ihe ejiri lie Tụtankamun bụrụ ihe echekwara ọfụma, n'ime ndị a bụ nde kwuru nde ọrụ nka esiri n'ọla dị oke ọnụ ahịa mepụta. Mmepụta ọtụgharị nwere eze mere ka ụgbọịnyịnya ndị Asịrịa dị ferefere, na-agbalite ọsọ, ma ka dị nkwadebe ịgbakarị ndị agha na ụgbọịnyịnya ndị ọzọ n'ọsọ. Uta site na akota ha n’egbu-egbu nwere-ike mifere ngwa-agha ndi agha ndi na emigede ha. ihe dika 1000 B.C., ndi Assyria bu ndi mbu weputara ndi agha n’anya inyanya. Kalvarị bu ndi agha na-alụ agha ịnyịnya. Emepụtabeghị sadụl mgbe ahụ, ya mere kalvarị Asịrịa busoro agha n'elu azụ ịnyịnya ha. Anyị maara ọtụtụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọka mmụta sayensị, na ndị omenka buụ ndị mba Gris. Onwere ike onye akacha mara aha ya n'omenala a bụ Homa, onye ode abụ kpara ike, onye dere akwụkwọ kacha ibe ya abụọ n'ederede Gris: abụ Iliad na Odisi. Sophocles na Aristophanes ka bụ ndị na-egwuri egwu na-ewu ewu ma a na-ewere egwuru egwu ha dị ka otu n'ime ọrụ akwụkwọ kachasị mma n'ụwa. Onye Griik ọzọ ama ama bụ onye mgbakọ na mwepụ Pythagoras, onye amakarịrị maka tiori ya wuru ewu gbasara ụmụ mmetụta nke akụkụ nke trayangụlụ chewere ihu n’elu. Amaghị kpọmkwem mmadụ ole na-asụ Hindi. A na-aka na ọ nọ n'etiti ọnọdụ abụọ na anọ n'asụsụ ndị akacha asụ n'ụwa. Onu ogugu nwaafọ ndị na-asụ asusu ahụ dịgasị iche na-ndabere na ma ọ bụrụ na aguru ma olumba ndị nwere mmetụta chiri anya. Itunye-onu ga adi n’etiti ndi nkwusa nde 340 ruo nde 500, ma ihe ruru nde mmadu 800 nwere ike ighota asusu ahu. HIndi na Urdu yitere na okwu ma ha di iche n’odide; na mkparita uka nkiti, ndi asu asusu abuo a nwere ike ighota onwe ha. N'ihe dị ka narị afọ nke iri na ise, Ebe ugwu Estonia hụtara oke mmetụta nke ọdịnala mba Germany. Ufodu ndi monk ndi Germany choro ka ndi bu nwaafo obodo ruo chukwu nso, ya kpatara ha ji meputa asusu ana akpo Estonian Literal language. Ọ bụ mkpụrụ edemede Jemani ka elere anya wee mepụta ya ma gbakwunye otu mkpụrụ edemede "Õ/õ". Ka oge gachara, ọtụtụ okwu si n'asụsụ Jamani jikọrọ ọnụ. Nke a bu mbido ọmụma. N'omenala, onye nketa ocheeze ga aba n'ọrụ onye agha ma ọgụchahaa akwụkwọ. Kaosinadị, Charles gara mahadum na Trinity College, Cambridge ebe ọ gụrụ Anthropology na Archaeology, na mgbe e mechara, ọ nwetara akwụkwọ nzụlite 2: 2 (okirikiri nke abụọ). Charles bụ onye mbụ n’ezinụlọ ọchịchị Britain nke natara digrii ngụcha akwukwo. Iropian Tọki (ọwụwa anyanwụ Tres maọbụ Rumelia n'ime ala mmiri Balka) so na pasent 3 nke obodo. Okeala Turkey karịrị kilomita 1600 (1000 mi) n'ogologo na kilomita 800 (500 mi) n'obosara, ma nwekwaa akụkụ anọ. A gụnye ọdọ mmiri ga, mba Tọki nwere nha sụkwịya kilomita 783,562 (sụkwịya maịlụ 300,948), nke sụkwịya kilomita 755,688 (sụkwịya maịlụ 291,773) nọ na ndịda ọdịda anyanwụ Eshia, ma sụkwịya kilomita 23,764 (sụkwịya maịlụ 9174) anọrọ na Yuropu. Nha ebe Tọki mere ya mba kachasị ibu n'ụwa nke iri atọ na asaa; ma ọ ha ka ebe e jikọtara ọnụ Obodo Frans Mepere Emepe na United Kingdom. Tọkị bụ oke osimiri gbara ya gburugburu n'akụkụ atọ: Oke osimiri Aegean n’ọdịdaanyanwụ, Oke osimiri Ojii n’ugwu na Oke osimiri Mediterranean na ndịda. Luzembọọgụ nwere ogologo agụgụàlà mana nnwere onwe ya gbara afọ sitere na 1839. Akụkụ Beljọm ga nke ugbua bụbu akụkụ Lukzembọọgụ n’oge gara aga mana mechaa bụrụ Beljian mgbe e nwere mgbanwe ọchịchị n’ike nke Beljian n'afọ 1830 ga. Luxembourg na-agbalị kwa mgbe ị bụ obodo nọrọ onwe ha mana adakpọ gidere ya ma n’oge Agha Ụwa I na II site n’aka ndị Gamani. N'afọ 1957 Lukzembọg sooro na ndị tọrọ ntọala nzukọ amaara ta ka njikọ Iroopu. Drukgyal Dzong bụ ebe ewusiri ike ebibiri ebibi bụrụkwa ebe obibi ndị mọnk n'efe Buda n'akụkụ elu nke distrikti Paro (n'ime obere obodo Fondi). A sị na n'afọ 1649, Zhabdrung Ngawang Namgyel rụrụ ebe mgbaba a iji cheta mmeri ya megide ndị agha Tibetan-Mongol. N'afọ 1951, ọkụ ọgbụgba mere ka sọ ihe onwunwe ole m'ole nke Drukgyal Dzong fọ, ihe dị ka onyonyo Zabdrung Ngawang Namgial. Mgbe ọkụ ahụ rechara, echekwara ma chedo ebe ahụ ewusiri ike, nke fọrọ ịbụ otu n’ime ihe ndọta kachasị emetụta nke Bhutan. Na narị afọ iri na asatọ, Kambodia hụtara onwe ya n'etiti agbatobi abụọ dị ike, Taịland na Vietnam. Ndị Taị lusoro Kambodịa agha ọtụtụ mgbe n’ime narị afọ nke iri na asatọ ma n’ime 1772 ha bibiri Phnom Phen. Na ngwụcha afọ ndị dị na senchuri nke iri na asatọ, ndị Vietnam wakpokwara Kambodia. Pasentị iri na asatọ nke Ndị Venezuela enweghị ọrụ, ma ọtụtụ n’ime ndị nwere ọrụ na-arụ ọrụ n’ebe ndị n'adabanyeghi n’akụnụba mba. Ụzọ abụọ n’ụzọ atọ ndi Venezuela na aru oru na-eme etu ahụ na ngalaba oru, ihe fọrọ obere ka o ruo otu ụzọ n'ụzọ anọ n’ime ulo oru na oru nke ise n'ime oru ugbo. Ụlọọrụ dị mba Venezuela mkpa bụ ụlọọrụ mmanụ, ebe mba ahụ na ebupụ mmanụ n'igwe, n'agbanyeghị na ọ bụ naanị otu pasentị na-arụ n'ụlọọrụ mmanụ. Na mbụ na nnwereonwe mba ahụ, ọkachamara nke Ubi Botaniik Sịngapọọ nyere ha aka ịgbanwe agwaetiti ahụ ghụọ Obodo Ubi nke ebe okpomọkụ. Na 1981, Vanda Miss Joaquim, otu ngwakọ ifuru, bụ nke ahọrọ dị ka ifuru nkeobodo nke mba ahụ. Kwa ahọ ebe ọnwa Ọktoba, ihe anụ n'eri ahịhịa ruru otu nde n'okara n'aga njem site n'ugwu ruo n'ebe ndịda, gafee mmiri Mara, maka mmiri ozuzo. O sizie n'ọdịda anyanwụ laghachi n'ugwu, gafee osimiri Mara ọzọ, mgbe mmiri zochara n'ihe dị ka ọnwa Eprel. Mpaghara Serengeti gụnyere Serengeti Nashọnal Pak, Mpaghara Nchebe Ngorongoro na Maswa Gem Rịzav nọ na Tanzania na Maasai Mara Nashọnal Rịzav na Kenya. Ịmụta ka esi emepụta ihe mgbasa ozi mmekọrịta chọrọ nka dị iche iche ma ngwa ọrụ amụtara n'ụlọ nkụzi mmekọrịta (ndezi ọdiyo na vidiyo, ịkọ akụkọ n'ihe ndị ọzọ) Nruputa akpariri-akpari ga-acho ka itulegharia uche-obi banyere oru mgbasa-ozi n’ikuku ma muta iche echiche n’uzo na adighi otu. Ọrụ mkpakọrịta chọrọ ka akụrụngwa nke arụmarụ jikọta onwe ha, ma nweekwa mpụtara ma ha kwụrụ n'onwe ha. Ihe ọghọm dị na zoom lens bụ na focal complexity ya na ọnụọgụgụ lens elements kwesịrị ka ejiri ya nweta a range of focal lengths karịrị na prime lenses. Nke a na-abuzi obere nsogbu maka na ndị na-arụpụta enyoanya enwetala ụkpụrụ dị elu na mmepụta enyoanya. Nke a enyela enyoanya mbugharị ohere iji mepụta fòto nke ịdị mma ya bụ nke yiri nke ahụ enyoanya mezuru n'iji ofu etiti nchakwasa. Ihe ọghọm ọzọ nke mbugharị ihunyo gasị bụ na oghere nkachasị (èkwòmọsọ ya) nke ihunyo na-adịkarị ala ala. Nke a na-eme ka o sie iji enyo anya dị ọnụ ala eme ihe n'ebe obere ọkụ dị na-ejighi ọkụ flash. Otu n’im ensogbu a kacha ahụkarị mgbe a na-anwa ịgbanwe otu ihe nkiri gaa na nhazi DVD bụ nnyocha-keukwuu. A na eme igwe onyonyo ka n'ọnụ ọgụgụ otu ọ ga-esi amasị ọha n'eze. Maka nke a, ihe niile ihuru na TV ebere oke ya ebe, elu, ala na akuku. A na eme ya ka ihe ngosi wee juputa ihuenyo. Nke ahụ ka a na-akpọ ovaskan. Mana ọ dị mwute na ị mee DVD, oke ya nwere ike ịpụ, ọ bụrụ na ihe ngosi vidiyo ahụ nwere edemede nkọwa nọ n'okpuru ihe ngosi, ọgaghị egosi ha nke ọma. Kasụl omenala mgbe ochie akpaliela echiche ndị mmadụ ruo oge dị anya, na-etinye n'uche ha oyiyi mmemme añụrị, oriri na nkwari na Atọrịan Shivalrị. Ọbụna ma akwụrụ n'etiti mkpọmkpọ ebe nọrọla puku afọ ọ dị mfe itụgharị uche n'ụda ma isi agha a lụrụ oge gara aga, ọ fọdụ obere ịnụ ụda ụkwụ ịnyịnya ma nụkwa isi ụjọ si n'olulu ekuli. Mana echiche anyị ọ dabeere n’eziokwu? Gini mere eji wuo ụlọ kasụl na mbụ? Kedụ otu esi see ma wuo ha? Áụkarịrị maka oge ahụ, Nnukwu ụlọ Kirby Muxloe dịkarịrị ka ụlọ echekwara echekwa karịa otu nnukwu ụlọ n’ezie. Windo ukwu ya e tere ihe na ahụaja ya tara ahụ ekwesịghị inwe ike igbochi otu mwakpo ekpebisiri ike ruo ogologo oge. N'afọ 1480 n'ibe ya, mgbe Onye nwe Hastins bidoro ịrụ ya, obodo nọ n'udo ma sọ mgbachite onwe bụ n'imegide obere igwe ndị ohi. Nhazi ike ọchịchị bụ usoro mba ndị dị na Yuropu gbasoro iji jigide ikike nnọrọonwe nke mba niile dị na Yuropu. Echiche butere nke a bụ na obodo Yuropu niile chọrọ ka a ghara inwe otu obodo kacha ibe ya ike, nke a mere ndị isi ọchịchị na-agbanwe njikọ aka ha n'obodo dị iche iche ka ejigide nhazi. Agha nnọchiteanya nke mba Spein gosiri agha izi nke nsogbu butere ya bu nhazi ike. Nke a gosipụtara mgbanwe dị mkpa, ka ndị ike mba Iroopu enwezighi ike iji okpukpe eme ihe ngọpụ eji ebido agha. N'ihi nke a, agha alụrụ ahọ iri atọ ga abụ nke ikpeazụ akpọrọ agha okpukpe. E bibiri ụlọ nsọ nke Artemis nọ na Ephesus na Julaị 21, 356 BCE n’omume ịgba ihe ọkụ nke emere site n’aka Herostratus. Dịka akụkọ a si gaa, ihe na-akpali ya bụ etu ọ ga-esi bụrụ onye a maara aha ya, n'agbanyeghi ihe ọ ga-efu. Ndị Efesọs, jiiri iwe maka ya kwubie na agaghị edetu aha Herostratus ma ọlị. Strabo onye Gris bụ onye ọkọ akụkọ ihe mere eme mechara detuo aha ahụ, ya mere anyi jiri mara taa. Ebibiri ụlọ okpukpe n'añasị amụrụ Aleksada d Gret. Mgbe Alexander bụ eze, ọ sị ka ọ kwụọ ụgwọ ịrụgharị ụlọ nsọ, mana e kweghị. Mgbe Alexander mechara nwụọ, a rụgharịrị ụlọ nsọ na 323 BCE. Gbaa mbọ hụ n’aka gị na-ezu ike dị ka o kwere omume ma na-akụkwa nootụ ndị ahụ nke ọma - gbalịkwaa ghara emela ọtụtụ mmegharị ahụ na-abaghị uru n’iji ụmụ mkpịsị aka gị. Otu a, ike agaghị agwụ gị ọsịsọ. Chetakwa na ọ dịghị mkpa imefu ike n'ịkpa ya aka ka inweta oke olu dịka osi dị na piano N'ụbọ ehwu ahụ, iji nwetakwuo ụhàraụdà, ị ga-eji ọfụ ikuku ndị ahụ n'ijikwu ọkwụkwa ma ọ bụ ekwomọsọ. Ihe mmụọ bụ ọgịga nke mmekọrịta nwere, njirimara nwere, maọbu ị mara nnụọ na ihe a dị adị, chi, mmụọ eziokwu, maọbụ Chineke. Onye ahụ kwenyere na-achọ ahụmihe izi ụzọ, nsinammụọ, ma ọ bụ nghọta n’ime nsiridị Chukwu/chi ahụ ma ọ bụ chi ndị ahụ. Ndị na-eso ụzọ na-achụ ụfọdụ ụzọ esi ebi ndụ, ma ọ bụ ụmụ mmewe eburunuche na ọ ga-elekọta anya ahụmihe ndị ahụ E nwenwuru ike ịmata ihe dị iche na Okwuke Ihe Omimi ya na ụdị okwukwe okpukpe ndị ọzọ na ofufe site na nkwusi ike ya na kpọmkwem ahụmihe keonwe nke otu ọnọdụ pụrụ iche nke nsụhọ, tụmadị ndị nke agwa keudo, kenghọta, na-enye obi ụtọ, ma ọ bụ nke oke obi ụtọ. Sikizm bụ okpukpe si mba India. O bidoro na mpaghara Pụnjab n'ahọ nke narị iri na ise site na nkesa ngalaba n'etiti omenala Hindu. Ndị Sikh ga-agwa gị na okpukpe ha na okpukpe Hindu abụghị otu ihe, mana ha kweere na ọ bụ n'okpukpe Hindu ka nke ha si pụta. Ndị Sikh na-akpọ okpukpe ha Gurmat, nke pụtara "ụzọ nke guru" na Punjabi. Guru so na ntọala nke okpukpe niile na India mana na Sikhism, ọ biaziri baa uru pụrụ iche nke gbasara isi okwu nke okwukwe ndị Sikh. Guru Nanak (1469–1539) bụ onye bidoro okpukpe a n'afọ narị iri na ise. Ndị guru itoolu sotere ya n'azụ. Agbanyeghị, na Juun 1956, ụmụ nkwa Krushchev ka e tinyere n’ule mgbe ọgbaaghara dara na Poland, ebe ndị ọrụ nọ na-eme ngagharị iwe gbasara ụkọ nri na mbelata ụgwọ ọrụ, ghọrọ ngagharị iwe izugbe megide Kọmunizim. Ọ bụ eziokwu na na ngwụcha, Krushchev zigara ụgbọ agha igwe ka ha wetaghachi udo, okwenyekwara na ụfọdụ ntuziaka ọchịchọ akụ ma tinyekwa Wladyslaw Gomulka n'oche ọchịchị nke praịm minista. Mmepeanya Ndagwurugwu Indus bụbu mmepeanya Afọ Ọla na mpaghara ugwu ọdịdaanyanwụ okpuru kọntinent India nke gụnyere ọtụtụ Pakistan nke oge a na mpaghara ụfọdụ na ugwu ọdịdaanyanwụ India na n’ebe ugwu ọwụwaanyanwụ Afghanistan. Mmepeanya gara nke ọma n'ụsọ osimiri nke Indus ebe o si nweta aha ya. N’agbanyeghi n’ufodu oka mmuta n’atulee uche na asi n’ebe o bu na mmepeanya di na bezin nke Sarasvati River nke mmiri ya tacha goru, ekwesiri ikpo ya Indus-Sarasvati Civilization ma ufodu n’akpo ya Harappan Civilization na ncheta Harappa, ebe izizi ebu uzo were gwuo n’oge 1920. Ụdịdị agha nke alaeze Rome nyere aka n'ịkwado ọganihu na ngalaba ahụike. Eze gburugburu Ọgọstus bidoro na-ewe ndị dibia n'ọrụ ma bido rịị Roman Medịkal Kọọz nke mbụ ga-arụ ọrụ nlekọta mgbe alụsiri agha. Ndị dọkịta na-awa ahụ mabu maka ọtụtụ ọgwụ ụra dịka mọfịịn e si na mkpụrụakụkụ pọpị enweta na skopolamiin e si na mkpụrụakụkụ habenụ enweta. Ha bịara dị mma na mbepụ ụkwụ iji chebe ndị ọrịa gangrene yana tourniquets na arterial clamps iji gbochie ọbara ọgbụgba. Dịka ọtụtụ narị afọ gafere, alaeze Rom wetara maka nnukwu uto na ngalaba ọgwụgwọ ma chọpụtakwa ọtụtụ ihe ọmụma anyị maara taa. Pịọland origami bụ nke nwere iwu mgbochi sị na sọ otu mpịaji ka enwere ike ime kwa mgbe, anaghị anabata mpịaji ndị ka mgbagwoju anya, ma mpịaji nile nwere ọnọdụ were anya. Ọ bụ John Smith mepụtara ya n'afọ 1970 ga iji nyere folda ndị na-enweghi ahụmihe aka maọbụ ndị nwere obere nka n'ịnya moto. Ụmụaka na-ewuli amamihe banyere agbụrụ na ịkpa oke n'ihi ndịiche agbụrụ mgbe ha ka dị obere ma ịkpa oke agbụrụ ndị a na-emetụta akparamaagwa. Iji maa atụ, ụmụaka ndị si agbụrụ nwere ọnọdụ ntakịrị nke a na-ahụta ka ndị na-anaghị eme nke ọma n'ụlọ akwụkwọ ga-ebido mewe njọ n'ụlọ akwụkwọ ozugbo ha matara otu ndị mmadụ si ahụta agbụrụ ha. MaịSpes bụ webụsaịtị nke ịtọ akacha eji mere ihe na mba Yunaịted Steeti ma onwekwara profaịlụ nde iri ise na anọ ugbua. Amasaịba ndị a adọtala mmasị ndị mmadụ ebe ọ dị ukwuu, ọkachasị n'ebe mmụta. Enwere uru webụsaịtị ndị a na-aba, dịka peeji klaasị ọhụrụ nke nwere ike ịnwe blọg, vidio, foto, na ihe ndị ọzọ. E nwere ike inweta òhèrè ihuakwụkwọ a na mfe site n’inye naanị otu adreesị weebụ, nke na-eme ka ọ dịrị mfe icheta na mfe ịpịnyere ụmụ akwụkwọ ndị nwere ike inwe nsogbu iji ụgbọọtụgwo ahụ ma ọ bụ na nsụpe. E nwere ike ịhazigharị ya ka o nwee ike dị mfe ịgụ nakwa iji nnukwu ma ọ bụ obere agba dị ka achọrọ. Adịghị otu o kwesiri nke uche, "bụ ọrịa ụbụrụ nke nkọwa agba ochie ya na-egosipụta ihe njirimara ya atọ nke gụnyere inwe mkpalite mberede, mkpafu akọnauche, na imebiga ihe oke maọbụ inwe ike gafere oke". Ọ bụghị nkwarụ ọmụmụ ihe, ọ bụ nsogbu mmụta; "ọ na-emetụta ụmụaka ruru pasentị ato ruo ise, onwekwara ike metụtaruo ụmụaka mba Amerịka ruru nde abụọ". Ụmụaka n'arịa ọrịa ADD na-enwe nramahụ ịgbado anya n'ihe dịka ọrụ ụlọakwụkwọ, mana ha nwere ike ịgbado anya n'ihe ha n'enwe ọñụ ime dịka egwuregwu m'ọbụ ile onyonyo ụmụaka nke na-amasị ha m'ọbụ ide ihe n'enweghị ntụpọ. Umuaka na abawakari nime otutu nsogbu, nihi na ha "na etinye onwe ha na akparamagwa di-egwu, na aba n’ogu, ma na-ama ikikere ochichi aka n’ihu" ebe ha na acho ikpali uburu ha, ebe-obu na akpaliteli uburu site na uzo esi eme ya. ADD na emetuta mmekorita ndi ogbo maka na umuaka ndi ozo agaghi aghota ihe kpatara ha ji eme ka ha si eme, ihe kpatara ha ji asupe ka ha si asupe ma o bu na ntozu oke di iche. Dịka ikikere ịnweta ihe ọmụma na ịmụta ihe gbanwere etu e gosigoro ebe a, ego ọ na-efu ịmụta ihe gbanwere. Usoro e ji echeta ozi dị iche. Ọ bụghịzị ịcheta mmadụ ka onye ọbụla na-ekwu okwu ya, kama ọ bụ ikikere ịcheta edemede ka etinyeziri uche. N’eziokwu, oge renaissance gbanwere etu esi amuta ihe na ka esi agbasa ozi n’uzo puru iche. N’adịghị ka praịmetị ndị ọzọ, hominids anaghịzi eji aka ha aga-ije ma ọ bụ ibu ihe ma ọ bụ ịwụgharị n’etiti ụmụ osisi. Aka na ukwu adaka ahụ yiri na nha na ogologo, na-egosi ojiji aka ya maka ibute ibu nọ n'ime ije njikọ mkpịsịaka. Aka mmadụ dị mkpụmkpụ karịa ụkwụ, ya na ụmụ ọkpụkpọ mkpịsị aka kara kwụ ọtụ. Ụmụ ọkpụkpọ aka fosil gbara afọ nde abuo rue nde ato na-ekpughe ngbanwe a na ọkachamara nke aka ahụ site na ngagharị rue mmegharị. Ụfọdụ ndị mmadụ kweere na ịnwe ọtụtụ nrọ nlezianya nke mmadụ kpatara na-agwụ ike. Ihe kachasị akpata nke a bụ na nrọ ndị ahụ doro anya na-amụba oge dị n'etiti ọnọdụ REM dị iche iche. N'ilegharị anya ngwangwa kwa abalị, ọnọdụ a nke ị na-anọ n'ụra n'ezie ma ahụ gị agbakee na-adịkarị obere nke ọ gaghị abụrụ nsogbu. Nke a bụ ihe na-agwụ ike dịka ọbụrụ na ị na-etete n'ụra nkeji iri abụọ m'ọbụ atọ ọbụla ile igwe onyonyo. Mmetụta ahụ nọ na ndabere n’ugboro ole ụbụrụ gị na-anwa ịrọ nrọ nke ị mara onwe gị n’ime ya kwa abalị. Ihe agaghị nke ọma maka ndị Itali n’ime Ugwu Afrịka ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ site na mbido. N’ime otu izu nke nkwupụta agha nke Itali na Juun 10, 1940, Hussars nke iri na otu nke ndị Britenụ eweghaara Fort Capuzzo n’ime Libya. N'agha mberede n'ebe ọwụwa anyanwụ Bardia, ndị Britain jidere n'agha Onye isi Injinia nke Ndị agha Nke iri nke Italy, General Lastucci. Na Juun 28, Marshal Italo Balbo, onyeisiala mba Libya na onye nsote Mussolini nwụrụ site n'ọgbụgba nke ndị otu ya n'amaghị ama ka ọ na-achọ ịkwụsị na Tobruk. Egwuregwu fensịn nke ọgbọ a bụ nke a na-egwu n'ọtụtụ ogugo, site n'ụmụ akwụkwọ mahadum ruo na ndị ọkachamara n'ịsọmpi olimpik. A na-egwu egwuregwu ahụ n’isimbụ na nhazi nke asọmpi mmadụ abụọ, otu onye egwuregwu ọgụ mma na-alụsị anye ọzọ. Gọlf bụ egwuregwu ebe ndị na-agba ya na-eji osisi akụbanye bọọlụ n'oghere dị n'ala. A na-egwu oghere iri na-asato na egwuregwu nkiti, ndi egwuregwu n’ebidokari na oghere nke mbu na koosu were mechie na nke iri na-asato. Onye okpukpo piara ntakiri stroku ma obu fere klob obere karia mgbe o na agaghari n’ebe egwuregwu bu onye meririnu. A na-agba egwuregwu a n'elu ahịhịa, na a na-eme ahịhịa gbara olulu gburugburu, nke a na-akpọ griin, ka ọ dị mkpụmkpụ karịa. Ikekwe ụdị njem nlereanya akacha mara bụ ihe ọtụtụ mmadụ na-etinye ya na njem n'otu: Njem ntụrụndụ. Nke a bụ mgbe ndị mmadụ na-aga ebe dị iche nke ukwu site n’ebe ha na-ebikarị ndụ ụbọchị-ruo-ụbọchị ha iji zuo ike ma nwee an̄ụrị. Ụsọ mmiri nlepu anya, ogige ntụrụndụ na ogige ọnọdụ bụ ebe ndị njem nlegharịanya ntụrụndụ na ejekarị. Ọ bụrụ na ebumnuche nke ọbịbịa mmadụ na otu ọ ga - eme bụ ịmara akụkọ ya na ọdịnala ya, a na - akpọ ụdị njem nlere anya dị ka njem nlegharị anya. ndi nje-nlere-anya nwere iga hu otutu ihe putara ihe di iche-iche nke obodo obula maobu ha nwerekwara ike ihoro nnoo ilekwasi anya n’otu ebe. Ndị mbịarachịwa, dịka ha hụrụ ihe omume a, kpọkwara maka ndị enyemaka. Otu ndị amị gara ikwado ndị nọ n'ihu agha gụnyere regiment mmadụ 200 nke mbụ na nke atọ Niu Hampshire, n'okpuru ọchịchị Kolonel Jọn Stak na Jems Riid (ha abụọ mechara ruo ọkwa Jeneral). Ndị nwoke Stark guzoro n'akụkụ nsu n'akụkụ ebe ugwu nke ọkwa Colonist. Mgbe ebili mmiri dị ala mepere oghere n'agịga mmiri Mistik n'agịga ugwu ọwụwa anyanwụ nke ala mmiri gbara ogige, ha mere ngwangwa ịgbatị mgbidi ahụ ruo n'ugwu kwụsị n'ọnụ mmiri. Gridley ma ọ bụ Stark gwunyere otu osisi ọdịka ụzọukwu 100 (m 30) n’ihu mgbaaja ahụ ma nye iwu ka a ghara inwe onye ga-agbanụ ruo mgbe ndị na-agafekarị ebe ahụ gafechara ya. Atụmatụ Amerịka dabeere na ijikọ aka wakpoo, site n'akụkụ atọ dị iche iche. Ọchịagha Jọn Kadwọlda ga ebuso ogige Briten agha mbugharị na Bọdintaụn, ka onwee ike igbochi mkwado ọbụla. Onye ọchịagha James Ewing ga-ewe ndị agha narị asaa n’ofe osimiri ahụ na Trenton Ferry, dọnara akwa mmiri ahụ n’ofe Assunpink Creek ma gbochie ndị agha onye iro ọ bụla ịgbalaga. Isi ndị agha mwakpo nke ụmụ nwoke 2,400 ga-agafe osimiri ahụ maịlị itoolu ugwu nke Trenton, ma mgbe ahụ kpọwanye n’òtù abụọ, otu n’okpuru Greene na otu n’okpuru Sullivan, ka e nwee ike ibuso otu agha tupu chi abọọ. Ya na ngbanwe site n'ịgba ọsọ nkeji iri na ise ruo ọkara maịlị, mkpa èkwòmọsọ adịzie nnọọ obere ma ntachi obi na-abụ ihe dị oke mkpa. Otu okwesiri onye oka-ibe na igba okara-maili, otu nwoke bu onue nwere ike imeri nkeji abuo, ga enweriri oke osiso di nma, mana nnagide ka aga azuriri nime ihe mmeru-ahu obula. Ụfọdụ ịgba ọsọ n’ofe mba n’oge oyi, ejikọtara ya na ọrụ mgbatị ahụ maka akụkụ ahụ nke elu, bụ njikere kachasị mma maka oge agbamọsọ ahụ. Sọ oriri na-edozi ahụ agaghị eweta maka arụmọrụ pụrụ iche, mana onwere ike ịmetụta ọdịmma onye egwuruegwu gburugburu. Idowe ọnọdụ ike nke dị ahụ mma, iñụ mmiri nke ọma, na ịghọta ngalaba dị iche iche dị na mgbakwunye ihe oriri nwere ike inyere ndị egwuregwu aka iwelite arụmọrụ ha ma welitekwa obi ụtọ ha na-enwe n'egwuregwu ahụ. Ọsọ na-adịchaghị anya bụ egwuregwu na-anaghị efu ego dị ka ndị ọzọ; mana enwere ọtụtụ nghọtahie gbasara ngwa ole na ole ọ ga-ewe isonye na ya. E nwere ike ịzụta ngwa ahịa dịka esiri chọ, mana ọtụtụ n'ime ha ga enwe mmetụta arụmọrụ pere mpe m'ọbụ ha agaghị enwe mmetụta m'ọlị. Ndị egwuregwu nwere ike nwee mmasị maka otu ngwaahịa, ma ọ bụrụgodi na onweghi uru ọbụla ọ bara. E nwere ike ịtụle na atọm bụ otu n'ime ihe nkịtị eji ewu ihe niile. Ọ bụ ihe dị oke mgbagwoju anya nke mejupụtara na, dịka ihe atụ nke Bohr dị mfe si wee gosi, nuklịọs nọ n'etiti nke ụmụ elektrọn na-agba okirikiri, dịtụ ka ụmụ planet na-agba anyanwụ okirikiri - lee eserese 1.1. Neuklọs ahụ bụ ahụ ihe abụọ mejupụtara ya - neutrọn na protọn. Protọn gasị nwere chaajị eletriki dị ọma ebe nutrọn gasị enweghị chaajị. Elektrọn gasị nwere chaajị eletriki dị ọjọ. Tupu ị gaa lelee onye e merụrụ, i ga-ebu ụzọ nyochaa gburugburu ebe ihe mere iji hụ maka nchekwa gị. Ikwesiri ịmara ọnọdụ onye ihe metụtara ka ị na eru ya nso ya na ihe ịdọ aka na ntị ọbụla. Ọ bụrụ na ị merụọ ahụ ebe ị na-achọ ịnye aka, ị ga-eme ka ihe dịwanye njọ naanị. Ọmụmụ ahụ chọpụtara na ịda mba, ụjọ na ị na-eche ihe mbibi banyere n’etiti mmetụta nke ụfụ na ndị na-arịa onwunwe nkwarụ n’ụfụ ala azụ Ọ bụghị egwu maọbụ ịda mba, kama ọ bụ naanị mmetụta nke iwebiga ihe ọjọọ karịa oke ka nnọkọta PA ahaziri ahazi kwa izu na-akpata. Ndị na-eme emume site na mgbe ruo na mgbe chọrọ enyemaka karịa n'ogbe inwe mmetụta ụfụ ekwesịghị, ịkọpụta ọdịiche dị n'etiti mgbu alaghịala na mmekpaahụ, mmetụta na mmegharị ahụ nkịtị. Ọhụhụ, ma ọ bụ enwemike ịhụ dabere na ọganụ ahụ kesensọ sistemụ ọhụhụ ma ọ bụ anya. eyes. E nwere ọtụtụ ọrụrụ nke anya dị iche iche, sitere na ọdịdị nke dabere na ọcịchọ nke ihe ahụ dị ndụ. Ihe dị iche iche a na-arụ nwere ikike dị iche iche, na-enwe mmetụta dịgasị iche iche na akwara ha di na ogo di iche, ha na-ejikwa nhazi dị iche iche iji mepụta echiche nke ntinye ahụ na ọnụọgụ dị iche iche iji rụọ ọrụ ọfụma. Pọpụleshọn bụ nchịkọta ihe nwere otu ụdị n'ebe ọbụla ekepụtara. Mgbe mmadụ nile n'otu ọnụ ọgụgụ nwere otu ihe metụtara otu omume phenotypic ahụ, a maara ha dịka monomorphic. Mgbe ndị mmadụ na-egosi ọtụtụ ụdị nke otu agwa kpọmkwem ha bụ polimọfik. Ndị agha ndanda na-aga njem na-akwụ n'ụzọ dị iche iche. N'oge ngagharị n'uto ha, ụmụ agbụsị na-agagharị n'abalị ma na-anọ otu ebe n'ụbọchị. Òtù anụmanụ ahụ na-amalite usoro nwagharị mgbe nri dị adị gbadatara. N’oge usoro a, ò̀tù anụmanụ ahụ na-eme akwụ nwa oge nke a na-agbanwe kwa ụbọchị. Nke ọbụla n'ime ngagharị ike maọbụ ije ndị a na-aga n'ihu ruo abalị 17. Gịnị bụ seelụ? Mkpụrụ okwu ahụ sitere na ọnụokwu Latịn nke bụ "sela", nke pụtara "obere ụlọ", ọ bụ onye nyocha nje nke anya anaghị ahụ anya bu ụzọ kpọọ ya aha ahụ mgbe ọ na enyocha nhazi mpe mpe osisi. Mkpụrụ ndụ bụ isi nkeji nke ihe niile dị ndụ, na ihe niile dị ndụ bụ otu mkpụrụ ndụ ma ọ bụ karịa mejupụtara ha. Mkpụrụ ndụ dị oke mkpa na ọmụmụ gbasara ndụ, n’ezie, a na-akpọkarị ha “ntọala obibi nke ndụ”. Sistemụ Irighiri Akwara na-ejisi homeostasis ike site na izipu mkpali akwara gazuru ime ahụ niile iji mee ka ọbara na-asọ nke ọma yana enweghi nsogbu. Enwere ike iziga mmetụta akwara ndị a ngwa ngwa ruo ahụ niile nke na-enye aka ịchekwa ahụ n'ihe egwu ọbụla. Ajọọ ifufe Tonedo na-efetu obere ebe ma ịtụnyere ya na ajọọ ifufe ndị ọzọ, mana ha nwere ike imebi ihe niile nọ n’ụzọ ha. Ajọ ifufe na efolite osisi, tirie ulo, ma felie ụgbọala n'ime igwe. Ajọ ifufe ndị kacha njọ bụ pasentị abụọ na-anọ karịa awa atọ. Ikuku oke ifufe ndị a na-erucha 480 kilomita kwa awa (133 maịlụ kwa nkeji; 300 maịlụ kwa awa) n'ọsọ. Mmadụ anọwo na-eme ma na-eji anụ anya dị elu maka ọtụtụ puku afọ na puku afọ. Kaosinadị, ezi teliskop izizi ndị ahụ bụ ndị e mepụtara na Yurop na ngwụsị narị afọ nke iri na isii. Teliskop ndị a jiri njiko ihe onuonyo abụọ ime ka ihe dị anya dị ka ọ dị nso ma ma buo ibu. Anya ukwu na ọchịchọ onwe naanị ga adịgide n'etiti anyị ma ọbụkwa ihe na-esote imekọ ihe ọnụ na mgbe ndị ka n'ọnụ ọgụgụ ritere uru, a ga enwerịrị ihe nrite n'uru dị nụ nke a ga eritenwu n'obere oge ma akpaa agwa ọchịchọ onwe naanị. A na-ele anya na ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọpụta na ihe kaara ha mma, maka ogologo mgbe, bụ ịrụkọ ọrụ ọnụ. Otutu mmadu n’aro nro otu ubochi mgbe mmadu ga ejenjem na kpakpando ozo ma kwa choputa maka uwa ozo, ufodu ndi mmadu n’aju gini di ebe ahu ufodu kwetere na ndi obia ma obu ndu ozo nwere ike ibi na uwa ndi ozo. Mana, ọ bụrụ na nke a mee mgbe ọ bụla o nwere ike ọ gaghị eme ọzọ ruo ogologo oge. Kpakpando ndị ahụ kesara nke ukwuu ebe ahụ nke mere na ọ dị maịlị ọtụtu puku ijeri n’etiti kpakpando ndị bụ “agbata obi”. Ikekwe otu ụbọchị ụmụ ụmụ ụmụ gị ha ga na-ebi n'ụwa gbanwere agbanwe na-eche maka ihe ndị nna nna ha dị ka? Ọtụtụ seelụ bụ ihe mejupụtara anụmanụ. Ha na-eri ihe ma gbazee ha n'ime. Anụmanụ ndị ka n'ọnụ ọgụgụ nwere ike ịga ije. Sọ anụmanụ nwere ụbụrụ ( kama ọbụghị anụmanụ nile; jelifish bụ ọmụma atụ nke a). A ga ahụta anụmanụ gburugburu ụwa nile. Ha na-egwu ala, gwuo mmiri n'oke osimiri, ma fekwaa n'ikuku. Sel bụ ihe nhazi na ihe na-arụ ọrụ nke kachasị ntakịrị n'ihe ọbụla dị ndụ. Seelụ si n'okwu Latịn bụ sela nke pụtara obere ụlọ. I nyochaa ihe dị ndụ n'okpuru maịkroskopu, ị ga ahụta ọtụtụ obere bọọlụ. Robert Hooke, ọka mmụta ihe banyere ndụ si na Ịnglandị, hụrụ obere ǹkomgbaànoǹhà n’ime okwuchi n’iji otu mikroskopu. Ha dị ka obere ụlọ. Ya bụ onye mbụ nyochara seelụ nwụrụ anwụ. Ihe njiama ga na kọmpandù nwere ike isi n'otu steeti gaa n’ọzọ n’enweghị agbanwe. Nitrogen dika ikuku nwekwara otu udi akparamaagwa ka Nitrogen dika mmiri. Nke mmiri ya ka di aru mana kpuru ya bukwazi otu ihe ahu. Mmiri bụ ọmụmaatụ ọzọ. Atọm haịdrojin abụọ na otu atọm ọksigin bụ ihe mebere mmiri. O nwere otu ụdị ọdịdị nke mọlekụụlụ n’agbanyeghị na ọ bụ ikuku, mmiri, ma ọ bụ ihe siri ke. N'agbanyeghi na mpụta ihe ya nwere ike ịgbanwe, ọnọdụ kemịkal ya na-anọkwa etu ọ dị. Oge bụ ihe nọ anyị niile gburugburu, ma na-emetụta ihe niile anyị na-eme, mana ọ na-ara ahụ ịghọta. Ndị ọkachamara okpukpe, echiche, na sayensị a mụọla oge ruo ọtụtụ puku afọ. Anyị na-enwe ahụmihe oge dị ka ụmụ usoro emume na-agafe site n’ọdịnihu gafere oge ugbu a garuo n’oge gara aga. Oge bụkwa etu anyị si atule oge (ogologo) mmemme gasị. Ị nwere ike ịka ngafe nkke oge n’onwe gị site n’ileru anya mmegharị ọzọ nke otu emume saịklikalụ. Emume saịklikalụ bụ ihe na-eme ugboro ugboro oge niile. Eji igwe komputa taa emeghari ihe onyonyo foto na nke vidio. E nwere ike iwube ntinyendụ ọkaibe gasị n'ụmụ kọmpụta, a na-ejiwanye ụdị ntinyendụ a na telivishọn na ụmụ ihe nkiri. A na-edekọkarị egwu n’iji kọmputa ọkaibe iji hazie ma wụrikọta ụda ọnụ. N’otu ogologo oge n’ime ụmụ narị afọ iri na itoolu na iri abụọ, e kwenyere na ndị mbụ biiri na Niu Ziilandị bụ ndị Maori, ndị chụrụ nta nnukwu nnụnnụ a kpọrọ moas. Nkwuwe okwu ahụ wee guzobe exhiche ahụ nke sịrị na ndị Maori si Polinesia kwagharịa n'igwe were n'apụ ndị Moriori obodo Niu Ziland, were guzobe ọha mmadụ na-arụ ọrụ ugbo. Mana, ihe akaebe ọhụrụ na-egosi na ndị Mariori bụ otu ndị Maori ndị si na Niu Ziland pụọ gaa n'Agwaetiti Chatham, kepụta omenala udo nke ha di iche. Enwekwaziri agburu ozo no mba-mmiri nke Chatham ndia bu Maori bu ndi sitere na mba New Zealand. Ha kpọrọ onwe ha Moriori e nwere ọgụ ole na ole ma na ngwụcha ya, e kpochapụrụ Moriori ahụ Ndị mmadụ ndị o metụtara kemgbe ọtụtụ afọ iri nyere anyị aka inye ike anyị ekele na ọchịchọ obi anyị dị ka a na-enyocha n’eziokwu ụmụ ihe isi ike nakwa ọdịda. Ka anyị na-ege ndị mmadụ nti ka ha na akọpụta akụkọ ha, ezinụlọ ha na njikọ aka ha, anyị mụtara ihe nke ukwu gbasara oge gara aga makwa ụfọdụ ndị mmadụ ama ama metụtara omenala nzukọ ahụ nke ọma maọbu nke ọjọọ. Ọ bụ eziokwu na ịghọta ihe mere abụghị mmadụ ịghọta omenala, mana ọ na-enyere ndị mmadụ aka ma enweghi ihe ọzọ ịmatatu ebe ha dabanyere n’ime ihe mere nke ụlọọrụ ahụ. Ka a na eleba anya n'ọganihu ndị ahụ ma na-enwekwa owuweanya ọdịda, ndị mmadụ na achọpụta n'ụzọ kara mie emi ụkpụrụ, ozi na ihe nkwado nzukọ ahụ. N’ọnọdụ a, icheta mgbe ndị mmadụ mere ihe n'ụzọ na-abụghị omenala na otu o si wee rụpụta ihe ọma mere ka ndị mmadụ dị nnabata nye mgbanwe ọhụrụ na ntụzịaka ọhụụ maka ụka obodo. Akụkọ ọganihu dị otu a weturu egwu ihe ntụgharị, ma mekwaa ka enwee olileanya di mma n'ebe mgbanwe dị n'ọdị n'ihu. Ụkpụrụ ntụgharị uche na-atụ aka ofu ebe bụ usoro esi edozi nsogbu nke na-ejikọ echiche dị iche iche were nweta azịza. Ebe udi uche a gbadoro anya bu na ime ngwa ngwa, ezi uche na izi ezi nakwa ichoputa nijirimara ihe mere eme, itinyeghari usoro di adi, ichikota ozi. Ihe kachasị mkpa n'ụdịrị echiche a bụ: enwere naanị otu ụsa. Sọọsọ ihe abụọ ị ga na-eche bụ: ọ bụ ya ka ọ bụghị ya. A na-ele ụdịrị echiche a anya dịka ihe ụfọdụ ezi usoro maọbụ usoro sayensị. Ndị nwere ụdịrị ezi echiche a na-enwe ike ibu usoro n'isi, dozie nsogbu ma rụọ ọrụ n'ule sayensị gasị. Ndị mmadụ bụ okike kachasị tozuo oke n'ịchọpụta ebumnuche ndị ọzọ. Nke a pụtara na anyị nwere ike ịkọ ihe ndị mmadu ọzọ na-ahụta, chọrọ ime, kweere, maara maọbu nwere mmasi na. N'ime ikikere a niile, ọ dị nnọọ mkpa ịghọta ebumnuche ndị ọzọ. Ọ ga-enye anyị aka ka anyị ghara ịghọtahie omume ha. N'ọmụmatụ, ọbụrụ na Ị hụ ka mmadụ na akụwa mgbupu ụgbọala, Ị nwere ike izube na ọ chọrọ izu ụgbọala mmadụ. Ọ ga-ekwesị ka e kpee ya ikpe iche ọ bụrụ na ọ tufuru igodo ụgbọ ala ya ma ọ bụrụkwa ụgbọ ala nke ya ka ọ na-achọ itibanye n’ime ya. MRI dabeere na Nuklia Magnetik Rezonans (NMR) na fiziks, nke Felix Bloch (na-arụ ọrụ na Mahadum Stanford) na Edward Purcell (si na Mahadum Havad) chọpụtara n'afọ 1930 ga. Na rezọnansị a, fild ndọta na ifufe redio na-akpata ụmụ atọm inyefụ ụmụ ntakịrị mgbaama redio. N'afọ 1970, Remond Damadian, bụ dibia bekee na onye nchọpụta ihe sayensị, chọpụtara ntọala iji osise foto magnetik rezonans mere ngwa ọrụ dibia bekee eji enyocha ahụ. Afọ anọ gachara e nyere otu patentị, nke bụ patentị mbụ n’ụwa enyere na fịịldị nke MRI. N'afọ 1977, Dkt. Damadian rụchara igwe nnyocha MRI "nke ahụ niile", nke ọ kpọrọ "Indọmitebul". Mkparịtaụka anaghị emekọta otu oge na-akwalite iche echiche ma zaghachi ndị ọzọ. Ọ na enye ụmụ akwụkwọ ohere ka ha rụọ ọrụ ka osi dị ha mma ka ha nwee njikọ n'ebe ozi nkuzi dị. Na mgbakwunye, e nwere mgbochi oge kara dị ole na ole ya na ịpụ omume nke ụmụ oge ọrụ enwere ike ịgbanwe. (Bremer, 1998) Iji ịntanetị mere ihe na-ekwe ka ndị na-achọ ịmụta ihe nwee ohere inweta ozi mgbe nile. Ụmụ akwụkwọ na-enye ndị nkụzi ajụjụ oge ọbụla n'ụbochị ma nwee olileanya inweta nzaghachi ọsịsọ, karịa iche mgbe ha hụrụ ihu n'ihu. Usoro mmụta nke agba ochie na-enye ohere ịmụta ihe site n'ụzọ ọbụla. E nweghi otu ụzọ ka mma isi mụta ihe. N'eziokwu, onweghi otu ihe dị mma ọmụmụ. Ọmụmụ bụ ihe na-eme mgbe onye na-amụ ihe na ihe ọmụma nwere mmekọ. Ahụmahụ anyị nwere ugbu a na 'ime-ya-n’onwe gị' na ihe niile ị na-egosi, telivishọn mmụta na-akụzi na-egosipụta isi okwu a. Ọtụtụ n’ime anyị na-ahụ onwe anyị na-ele otu ihe ngosi televishọn na-agwa anyị maka otu usoro ma ọ bụ ahụmihe n’ime nke anyị agaghịrị esonye ma ọ bụ tinye ihe ọmụma ahụ n’ọrụ. Anyị agaghị anwa ịtọpụghasị otu ụgbọ ala, rụọ otu isi iyi n’azụ ụlọ anyị, gaa njem na Peru iji nyochaa ndị mkpọmkpọ ebe ochie, ma ọ bụ mezigharịa ụlọ agbatobi anyị. Ekele dịrị ọwa nkwurita okwu ruru Yuropu na ihe mgbasa ozi ikuku, Grinlandị bụ ebe ya na ndị bi na ya ruru pasenti iri itoolu na atọ nwere ezigbo njikọ sitere n'ịntanetị. Ụlọ nkwari akụ gị maọbụ ndị nnabata gị (ọ bụrụ na ị nọ n'ụlọ nkwari akụ maọbu ụlọ konwe) nwere ike inwe igwe kọmputa keonwe nwere waịfaị maọbụ njikọ ịntaneetị, ebe obibi niile nwere ọnọdụ ịntaneetị maọbụ waịfaị dịịrị ọha. Dịka e si kwuo n'elu, n'agbanyeghi na a ka nabatara okwu a bụ "Eskimo" na Amerịka, ọtụtụ ndị Aktiki n'abụghị ndị Amerịka ọ kachasị na Kanada hụtara ya dịka mkparị. N’agbanyeghị na ị nwere ike ịnụ Ndị mba Griinlandị iji mkpụrụokwu a, ojiji ya kwesịrị ịbụ nke ndị mba ọzọ ga-ezere. Ndị obodo bi na Greenland na-akpọ onwe ha Inuit na Kanada na Kalaalleq (nke karịrị otu Kalaallit), onye Greenland, n’ime Greenland. Mpụ, na ịnwe atụmatụ ọjọọ megide ndị ala ọzọ, anaghị eme na Greenland chaachaa. Ma n'obodo ha, enweghị "ogbe isi mgbaka." Oyi bụ sọ ihe ize ndụ ndị na-adịghị njikere ga agabiga. Ị gaa ileta Grinland n'oge oyi (itinye n'uche na ka ị na agbago ugu, ka oyi na akarị), ọ dị mkpa iji akwa nchụ oyi. Oke ogologo ụbọchị nọ n’oge ọkọchị nwere ike ibute nsogbu inweta ụra zuru ezu na ụmụ nsogbu ahụike metụtaranụ. N'oge sọma, kpachara anya maka ụmụ anwụnta nọdik. Ọ bụ eziokwu na ha anaghị ebufe ọrịa ọbụla, mana ha nwere ike ịmekpa mmadụ ahụ. N'agbanyeghi na ego obodo San Fransisko si na ya ịbụ obodo nlereanya, ụzọ nweta ego ya bara ụba. Ngalaba ndị kachasị ewe ndị mmadụ n'ọrụ bụ ejemozi ọkachamara, gọọmenti, akụ, ahịa, na njem. Ngosipụta ya ugboro ugboro n’egwu, ihe nkiri, edemede na omenaala ama ama nyere aka mee ka amata obodo ahụ na ihe nhụmaama ya n’ụwa niile. San Francisco emepụtala nnukwu akụrụngwa ndị njem nleta ya na ọtụtụ ụlọ nkwarị akụ, ụlọ nri gasị, na ebe ọgbakọ mmemme dị ezigbo mma. San Fransisko so n'ebe kachasị mma iri nri ndị mba Eshia n'obodo: Nke mba Koria, Taị, India na Japaanụ. Ịga Wọlt Dizni na-egosipụta oke njem n'ebe ọtụtụ ezinụlọ mba Amerika nọ. Nleta "nkịtị" ahụ na-agụnye ifeba n'Ọdụ Ụgbọ Elu Ụwa Nile Nke Ọlando, baa bọọsụ gaa n'Ụlọ Nkwari Akụ Dizni nọ n'ebe mepere emepe, nọọ ihe dị ka otu izu na-apụghị n'ala Dizni, ma wee laghachi ụlọ. Enwere otutu ihe di iche iche o nwere ike i bu mana nke a bu ihe otutu mmadu bu n’obi ma ha n’ekwu maka “i ga Uwa Disney”. Ọtụtụ akwụkwọ njem a na-ere n'ikuku n'ebe dịka eBay maọbụ Kraigslist bụ ndị ejitụrụ mee ihe. N’agbanyeghi na otutu ndi mmadu n’eme ya , Disney anaghi ekwe: i gaghi enye onye ozo tiketi gi. Njem ọnụnọ ọbula a na-eme n'okpuru ọnụ Gụrandị Kenyọnụ kwesịrị ka onye njem nwee nkwado imeobodo. Ikikere nwedebere ike ichekwa ndida ahu, ma diri-adi na ubochi mbu nke onwa, onwa ano tupu mbido onwa ahu. Ya bụ na ikike azụụlọ maka ụbọchị mbido ọbụla na Mee ga-adị na Jenụwarị 1. Ohere maka ebe ndị a kacha mara ama, dịka Ala kampụ Bright Angel chewere ihu n’akụkụ Ebe a na-azụ ụmụ anụmanụ Phantom, na-ejukarụ n’ọnụ site n’arịrịọ anatara n’ụbọchị mbụ ha mepere nye ndopụta. Enwere oke nye akwụkwọ ikike nkwado maka njem nkwugharị nke a na enye ndị bu ụzọ bịa. Iji ụgbọ ala abanye na Ndịda Afrịka bụ ụzọ dị ịtụnanya iji hụ mma mpaghara ahụ niile yana ịbanye ebe ndị na-adịghị n'ụzọ a na-esikarị eme njem nlegharị. Enwere ike ime nke a na moto nkịtị ma a kpachara anya tụọ atụmatụ mana ọ ga-aka nnọọ mma iji moto nwere ohere wiili 4x4, nakwa ọ bụ naanị ụdịrị moto a nwere ike ịbanye ụfọdụ ebe. Dịka ị na-atụ atụmatụ, buru n'uche na ọ bụghị obodo niile gbara Sawụt Afrịka gburugburu kwụsiri ike dịka ha. Ihe ọchụchọ na Visa na-adà ọnụahịa dị iche site na mba ruo na mba ma metụta kwa site n’obodo i siri bịa. Mba ọbụla nwekwara iwu pụrụ iche nke na-ekwu ngwa mberede nke aghaghị idi n'ụgbọala. Victoria Falls bụ obodo nọ n'akụkụ ọdịda anyanwụ Zimbabwe, ma agafee oke obodo site na Livingstone, Zambia, na nsonso Botswana. Obodo ahụ nọ ozugbo n’akụkụ iyi si ugwu awụpụta, ma ha bụ nnukwu ihe ndọta, mana ebe njem nleta a ama ama na-enye ma ndị na-achọ njem ma ndị bịara elekiri ihe ọtụtụ ohere maka ịnọkwu. N’oge udu mmiri (Nọvemba ruo Maachị), ibu mmiri ahụ ga-akarịkwu ma Ozizo mmiri ga-esikwa ike. Ekwela nkwa na ị ga-enwe mmiri ma ọ bụrụ na ị gafee àkwà mmiri ma ọ bụ na-aga n'okporo ụzọ ndị na-aga n'okporo ụzọ Mmepe. N'aka nke ọzọ, ọ bụ kpomkwem n'ihi na ụhàraòhèrè mmiri dị oke elu nke na nlele gị nke Mmiri na-asọ asọ n'ezie bụ ihe ọ ga-ekpuchi—site n'aka mmiri ahụ niile! Ebe olili Tụtankamun (KV62). KV62 nwere ike ịbụ ebe olili akacha mara aha ya na-ndịda, ebe Hawọd Kata chọpụtara ebe olili a na emetụghị aka nke eze nwata n'afọ 1922. E jiri ya tulee ili eze ndị ọzọ, o nweghi ihe mmadụ na-aga ịhụ n'ili Tutankhamun; o pere mpe karịa ma nwekwaa obere ịchọ mma karịa. Onye-obula nwere mmasi ihu ihe-akaebe nke mmebi ozu ahu mgbe ana anwa iwepu ya na igbe-ozu ahu ga enwe mmechu-ihu dika na obu nani isi ya na ubu ka ana ahuzi anya. Ọtụtụ ihe oke ọnụ ahia nọ n'ili a anọghịzị na ya, kama e wegala ha na Ijipshịan Muziọm nọ na Kairo. Ọ ga-akara ndị ọbịa nwere obere oge mma ka ha nọrọ ebe ọzọ. Fnọm Krọm, 12 km na ndịda ọdịda anyanwụ Siem Rip. Arụrụ ebe ofufe a dị n'elu ugwu na ngwụcha afọ nke narị itolu, mgbe Eze Yasovaman na-achị Ọnọdụ ihu igwe gbachapụrụ agbachapụ nke ụlọ nsọ ahụ na nlele anya na ọdọ mmiri Tonle Sap na-eme ka ịrịgo ugwu ahụ dị ọnụ ahịa. Enwere ijeko jem ịga ebe ahụ na njem ụgbọ mmiri na-enweghị mmekpa ahụ. Ngafe Angkọ bụ ebe a ga agaferịrị ịbanye ebe ofufe n'ihi nke a echefukwala iweta akwụkwọ akwụkwọ ngafe gị ma ị na-aga Tonle Sap. Jerusalem bụ isiobodo na obodo kachasị ukwu nke Israel, n'agbanyeghị na ọtụtụ n’ime mba ndị ọzọ na United Nations amataghị ya dị ka isiobodo nke Israel. Obodo ochie ahụ nọ n’ụmụ Ugwu Judịa nwere akụkọ ihe gara aga ruru ọtụtụ puku afọ nke na-adọrọ mmasị. Obodo ahu di nso n’anya ndi otu uzo okpukpe ato kwere na enwere otu chukwu - Judaism, otu Kristi na ndi alakwuba o bu obodo eji mere ebe isi ihe ime mmuo, okpukpe na omenala. Nihi mputa-ihe okpukpere-chi nke mba ahu, ya na kpom-kwem otutu ogbe nke obodo ochie ogbe ahu, Jerusalem bu ot nime ebe bu isi nke njem-nlere-anya na Israel. Jerusalem nwere otutu ebe ihe mere mgbe ochie na ebe omenala, makwa nwee ebe ana azu ahia, ebe ana ere nri na cafe n’ekwo ekwo. Mba Ekụadọ na-achọ ka ndi obodo Kuba nata akwụkwọ nnabata tupu e si ọdụ ụgbọelu maọbu ụzọ mbata ndị ọzọ amaara amara bata Ekụadọ. Ụlọọrụ Ekuwadọ na-ahụ maka mmekọ ha na mba ndị ọzọ ga-akwado leta a, ọ ga-ahụkwa na ọ gbasoro usoro niile o kwesiri ịgbaso. Ihe ndị a achọrọ ka e mewere inye usoro nkwagharị ala ahaziri ahazi n'etiti mba abụọ ndị ahụ. Ụmụ amaala Cuba bụ ndị nwere akwụkwọ ikike kaadị ndụ ndụ nke US kwesịrị ịga n'Ụlọ ọrụ Consul Ecuadorian iji nweta nkwenye mwepụ maka ihe a chọrọ. Akwụkwọ ngafe gị ga adịrịrị ire opekarịa mpe afọ isii karịa oge njem gị. Akwụkwọ njem kennabata n'obodo ị na-aga dị mkpa igosipụta ogo ị ga-anọ. Njem nleta kara dị ọnụ ala maka òtù buru ibu, ya mere ọ bụrụ na ị nọ n’onwe gị ma ọ bụ gị na naanị otu enyi, gbalịa zute ndị ọzọ ma wube otu òtù nke mmadụ anọ ruo isii maka ọnụego ka mma kwa-otu-onye. Agbanyeghị, nke a ekwesịghị inye gị nsogbu, n'ihi na ọtụtụ oge, a na-ewegharị ndị njem iji mejuo ụgbọ ala. Ọ dị n'ezie ka ọ bụ nnọọ otu ụzọ e ji aghọgbu ndị mmadụ ikweta na ha kwesiri ịkwụkwu ụgwọ. Dịrị ogologo gafee ebe ugwu nke Machu Picchu bụ ugwu mkpoda a, ọtụtụ mgbe na-abụkarị ndabere nye ọtụtụ fòto nke mkpọmkpọ ebe ndị ahụ. Ọ dị tụ ka ihe nkụda mmụọ ma esi n'ala lee ya, ọ ga-arakwa ahụ nrigo, mana ọtụtụ ndi ahụ siri ike kwesịrị iji ihe dị ka nkeji iri anọ na ise rigoo ya. A na-etinye ọtụtụ okwute n'okporo ụzọ, na mpaghara ala nke eriri igwe na - enye aka ijide onwe gi ofuma. Ebe ekuola nke ahụ, na-atụ anya ịpụ n’ume, ma ledo onwe gị n’ime oke ndị kara kpodaa, tụmadị mgbe dị mmiri mmiri, dị ka o nwere ike ịbụ ihe egwu ngwa ngwa. Enwere obere ọgba dị nso n’elu a na-aga-agaferịrị, ọ dị ala ma na-agbatị karịa. Ihu ogige ahu na anu-ohia nke Galapagos kacha nma ino n’ugbo mmiri, dika nnoo Charles Darwin ji wee mee na-afo 1835. Ụgbọ mmiri karịrị iri isii na-akwọfe mmiri Galapagos - nha ndị njem ha sitere na asatọ ruo narị. Ọtụtụ ndị mmadụ na-akwụdobe ụgwọ ọnọdụ ha akwụdobe (dịka na ụgbọmmiri na-ejukarị eju n'oge nnukwu njem) Kpachara anya hụ na ejenti ị ga-eji akwụ ụgwọ bụ onye maara Galapagos ọfụma ma mara ọtụtụ ụgbọ mmiri di iche iche. Nkea ga agbambo hu n’etikotara mmasi gi na/ma o bu ihe ji gi iga na ihu n’ugbo kwesiri ha. Tupu Ndị Spen abịarute na narị afọ iri na isii, ebe ugwu Chile nọ n’okpuru ọchịchị Inca ebe ndị amaala Araucanian (Mapuche) biri n’etiti na ebe ndịda Chile. Ndị Mapuche bụkwa otu n'ime ndị amaala ikpeazụ Amerịka nwerela onwe ha, nke anabatabeghị kpam kpam n'okpuru ọchịchị ndị na-asụ asụsụ Spanish ruo mgbe nnwere onwe Chile gasịrị. N’agbanyeghị na Chile kwupụtara nnwereonwe ha na 1810 (n’etiti ụmụ agha Napoleon nke mere na Spenụ enweghị gọọmentị etiti n'afọ olenaole gaa), e nwetaghị mmerị mkpebi megide ndị Spenụ ruo na 1818. Republiki Dominica (Asụsụ Spaini: República Dominicana) bụ Mba Karibbiin nke nọrọ n’ọkara ebe ọwụwa anyanwụ nke agwaetiti nke Hispaniola, nke ya na Haiti kekọrịtara. E wezụga aja ọnụmmiri ọcha na ala ugwu, mba ahụ bụ ebe obibi nye obodo Europe kacha ochie n'ime Americas, ugbu a bụ akụkụ nke Santo Domingo. Ndị Taịnos na Karibes bu ụzọ biri na usuo ahụ. Ndị Karibes bụ ndị na-asụ asụsụ Arawakan bịara ebe afọ dịka nde iri tupu amụọ Kristi. N'ime afọ ole na ole na-eso mbịarute nke ndị na-eme nchọpụta na Europe, e belatara nke ukwuu onu ogugu ndi mmadu nke Tainos site n'aka Ndị mmeri ndị Spain Na ndabere na Fray Bartolomé de las Casas (Tratado de las Indias) n’etiti 1492 na 1498 ndị mmeri Ndị Spen gburu ihe dị ka Ndị Taínos 100,000. Jardín de la Unión. A rụrụ ohere a dịka atrium maka otu kọnventị narị afọ iri na asaa, nke bụ na Templo de San Diego bụ naanị ụlọ ka guzoro ruo ugbu a. Ọ bụzi plaza izugbe, ebe ọtụtụ ihe na-eme n'ụtụtụ ma n'abalị. Enwere ọtụtụ ụlọ nri gbara ogige ahụ gburugburu, a na enwe ihe omume nkere anya n'ehihie ma na mgbede. Callejon del Basso(Alley of the kiss). Mbara ihu abuo sonso ihe kewara ha bu 69 centimeters bu ebe otu akuko ihunanya ndi mgbe ochie mere. Maka peeni ole na ola ụfọdụ ụmụaka ga-agwa gị akụkọ ahụ. Agwaetiti Bowen bụ njem ụbọchị maọbụ njem mmụta nke ngwụcha izuụka ama ama na-enye egwuregwu ụgbọamala, ije ogologo ije, ụlọahịa, ụlọ oriri na ọn̄ụn̄ụ, na ndi ozo. Ezigbo obodo a dị na Howe Sawụndụ ma a gasịa Vankuva, ma ọ dị mfe iji tagzi na-agba na mmiri enweta ya site n'agwaetiti Granville n'ogbe Vankuva. Nye ndị ahụ ihe omume mpụta ezi na amasi, njem akụkụ oke osimiri ruo ebe ngafe elu. Ofu-opi (awa 1.5 ikwa-ugbo site na Vancouver) di oke-onu mana ama ya ama n’ihi asoroma-mpi olimpic nke Winta 2010. N’oge oyi, nụrị ụtọ ụfọdụ egwuregwu skii kacha mma n’Ugwu Amerịka, ma n’ime oge ọkọchị nwaa ụfọdụ ezigbo ịgba ígwè n’ugwu. A ga-edote akwụkwọ nkwado n'ọdịnihu. Ị ga-enwerịrị akwụkwọ nkwado ma ọbụrụ na ị ga-anọfe abali na Sirena. Sirena bụ sọ ụlọ nchekwa ọhịa na-enye ndị njem ebe ọnụnọ ma nri. La Leona, San Pedrilo, na Lọs Patos na-enye sọ ebe ọnụnọ n'enweghị nri. A ga-enwetali ikike idọsa moto n'aka Renja Steshọn na Puerto Jimenez, mana ị gaghị ejili kredit kad akwụ ha ụgwọ. Ụlọọrụ na-elekọta ogige ahụ (MINAE) anaghị enye ikike mbata n'ogige ahụ karia otu ọnwa tupu ịbata. E nwere ike ịkwụ CafeNet El Sol ụgwọ n'ihu oge n'ọnụ US$30, maọbụ $10 maka tiketi otu ụbọchị; mụtakwuo maka nke a na peeji Kọkovado ha. Isuo Kuk bụ obodo isuo nọ n'etiti ndịda oke osimiri Pasifik, nke dị na Polinesia ya na obodo Niu Zilandị gbara ogige nwere onwe. Ọ bụ agwaetiti nwere isuo iri na ise gbasara ihe karịrị kilomita nde abụo na puku abụọ n'elu mmiri. Ha no n’otu oge ka Hawaii, ya mere na oge ufodu ana eche maka agwaetiti ndi a ka ha bu “Hawaii gbadara n’okpuru”. N’agbanyeghị na ọ kara dị obere, ọ na-echeta ndị nleta Hawaii ndị kara nka tupu ọ ghụọ mba onwe ya na-enweghị ụmụ nnukwu họteelụ ndị nleta niile na mmepe ndị ọzọ. Agwaetiti Osi nri ndị ahụ enweghị obodo ọ bụla mana ọ bụ agwaetiti dị iche iche iri na ise mejupụtara ya. Ndị isi ha bụ Rarotonga na Aitutaki. Na mba ndi mepere-emep taa, iweputa akwa-ndina nke ndi-ukwu na nri-ututu ka eweliri ruo ihe di na udi-nka. Na mpara elu-elu, na ihe ahu anya B&Bs na amarita-aka karia nime ihe abuo putara-ihe: ndina na akwa na nri ututu. N'ihi ya, n'ụlọ ọrụ ndị kachasị mma mmadụ ga-achọrịrị ihe eji achọ ihe ndina kachasi nma, ọ nwere ike bụrụ nke ejiri aka mee ma ọ bụ ihe ndina ochie. Nri ụtụtụ nwere ike ịgụnye nri ụtọ n'oge nke mpaghara ahụ ma ọ bụ nri pụrụ iche nke onye nnabata. Mwube ahụ nwere ike ịbụ otu ụlọ kara nka keakụkọala nwere ụmụ ntinye ihe ime ụlọ nke mgbe ochie, ala awụrụmaziri nke ọma na otu ebe igwu mmiri. Ibanye na moto gi gawa ogologo njem na enye obi uto n’agbanyeghina o di mfe. N'adịghị ka nnukwu ụgbọ ndị ọzọ, ịnya ụgbọ ala gị nwere ike ọ maala gị ahụ Ị makwaara ebe ike ya ruru Iwube ụlọikwuu n’ala mmadụ ma ọ bụ n’ime otu obodo nwere nha ọ bụla nwere ike ịdọta na mfe anya a na-achọghị. Na mkpirisi, njem na aka mma n'ụgbọala nke onwe n'ihi na ya onwe ya bụ ụdị "njem nnọgharị". Njem nnọgharị ụgbọala kwere omume ma I nwee nnukwu ụgbọala, ọkwụ ọtọ ekele eze maọbụ ụgbọala oche ya nwere ike idina ala. Ụfọdụ ụlọ nkwari akụ nwere ihe nketa si n'oge ụgbọ oloko na oke ụgbọ mmiri wuru, tupu agha zuru ụwa ọnụ nke abụọ, na afọ nke narị iri na itolu maọbụ isi mbido nke narị iri abụo. Ụlọ nkwari akụ ndị a bụ ebe ndi bụ mmadụ n'oge ahụ ga-anọ, ma nwee oriri na nkwari na ndụ abalị. Ntinyegasi ndi agba-ochie, enweghi ihe ndi eji ebi ugbua, na otu ime-okenye na amara bu kwa otu nime akparama-agwa ha. N'agbanyeghị na ọ na-abụkarị ihe onwunwe nke otu onye, ụfọdụ oge ha na-anabata ndị isi obodo na ndị a maara aha ha bụ ndị ọbịa. Onye njem nwere nnukwu ego nwere-ike chee banyere ifeghari uwa nile, kujisichaa ahu na onino nime otutu ulo-oriri ndia. Njikọ mgbanwe nke ile ọbịa bụ nzụkọ na ejikọ ndị njem na ndị obodo n’ime ụmụ obodo ndị ha na-aga eleta. Isonye n’ụdị netwọọk na-achọkarị fọm nke ndịnọrụ; na-agbanyeghị n’ụfọdụ netwọọk na-enye maọbụ chọọ nkwenyeeziokwu ọzọ. A ga-enyekwa, n'akwụkwọ na/maọbụ n'ịntanetị, aha ụfọdụ ndị dị njikere ịnabata; ụfọdụ oge a ga-etinye ama ndị njem ha nabatagoro mgbe gara aga. E bidoro Kaụchsọfịn n'ọnwa Jenụwarị nke afọ 2004 mgbe onye n'ede usoro ọrụ kọmputa bụ Kasi Fentụn chọtara njem ụgbọelu dị ọnụ ala ịga obodo Aịsland mana onweghi ebe ọ ga-anọ. Ọ zitere ụmụakwụkwọ ozi-e na mahadum ma ọ natara ọnụọgụ nke enweghị atụ nke onyinye maka ụlọ obibi n'efu. Ulo-obia na elekota karisia ndị na-eto eto – ndi obia na abiakari no n’afo agbata iri-abuo – mana inwere ike ihuta ndi njem ozo ebe ahu kwa mgbe. Anaghị ahụtakarị ezinụlọ chị ụmụ, mana ụfọdụ ebe ọnụnọ na-enye ha ụlọ nkeonwe. Obodo Beijing di na China ga bu obodo ga afu maka Egwuregwu Oge Oyi Olympic na 2022, nke a ga-eme ya o buru obodo izizi fugoro maka Olympics nke oge okochi na nke oge oyi. Beijing ga-eme mmemme mmeghe na mmechi ya na ihe omume ais nke ime ụlọ. Ihe omume igba-igwe mmiri ndi ozo ga adi na ogbe igwe mmiri Taizicheng di na Zhangjiakou, ihe dika 220 km (mailu 140) site naBeijing. Ọtụtụ n’ime ụlọ nsọ nwere otu ememme Kwa afọ na-ebido site na ngwụcha Nọvemba ruo N’Etiti nke Mee, nke dị iche na-ndabere nke Kalenda kwa afọ nke ụlọ nsọ ọ bụla. Ọtụtụ n'ime mmemme ebe ofufe ahụ ka a na-emenyere mmemme ncheta ụlọ ofufe maọbụ mmemme ncheta ọmụmụ chi ha maọbụ ihe omume ọbụla dị ịrịba ama n'ụlọ ofufe ahụ. Mmeme ulo-okpukpere Kerala di ezigbo uto nlele, na nzom-ije mbata nke enyi ejikwara ngwa, ngwa-uri ulo-okpukpere na emume ndi ozo. Mgbasa ozi-ahia nke mba uwa (onye-obula na akpo Ngosiputa mba Uwa, maobu ebe odimfe Ngosi) bu nnukwu mmemme nka na uzu nke obodo na obodo nile nke mba uwa Obodo ndị na-esonye na egosi ngosi nka na nkụzi iji gosipụta ihe na-eme n'ụwa maọbụ omenala obodo na akụkọ ihe mere eme. Ngosipụta okooko osisi nke mba ụwa bụ mmemme ndị pụrụ iche ebe a na-egosipụ ifuru, ubi mkpụrụ osisi na ihe ọzọ ọbụla gbasara osisi. Agbanyeghị n’ime tiori ha nwere ike imeli kwa afọ (ọ bụrụhaala na ha nọ na mba dị iche iche), na omume ha anọghị ya. Emume ndị a na-anọtekarị aka oge ọ bụla nọ n’etiti ọnwa atọ ruo isii, ma a na-eme ha n’ebe na-adịghị obere karịa hekta 50. E nwere usoro ihe nlele dị iche iche eji mere ihe n'oge gara aga. Ihe nlele tozuru oke nke mm35 (negetivu 36 ga na 24) bụ nke dị ebe niile. Enwere ike imejugharị ya na-enweghi mmekasị ahụ ma ọgwụ ma o nwekwara ngosipụta ihe dị ka nke DSLR. Ụfọdụ igwe foto ọkara nwere akụkụ sentimita 6 n'elu 6, ya bụ negetiv nwere milimita 56 n'elu 56, ikwu ya kpọmkwem. Nke a na-enye ụcha ngosịpụta ihe ruru ugboro anọ nke ihe otu 35mm odi iche (3136 mm2 vesọs 864). Anụ ọhịa so na mọtif ndị kachasị ata akpụ nye onye na-ese fòto, ma chọrọ mgwakọta nke ihu ọma, ndidi, ahụmihe na ngwaọrụ dị mma. Osise foto anụ ọhịa na-abụkarị ihe ejighị kpọrọ ihe, mana dị ka osise foto n'ozuzu ya, otu foto bara uru ruru otu puku okwu. Foto anụ ọhịa na-achọ ogologo oghere telephoto, n’agbanyeghi ihe dika igwe nnụnụ maọbụ obere okike choro oghere ndi ozo. Ọtụtụ mgbe, ọ na-ara ahụ ịchọta ụmụ anụmanụ ọpụrụiche, na ụfọdụ ogige anụmanụ nwere iwu maka ise ha foto a ga-etinye n'ihe ọbụla a ga-ere ere. Anụ ọhịa nwere ike na-eme ihere maọbụ na-alụso ọgụ. Gburugburu ya nwere ike dị oyi, ọkụ, maọbụ dị njọ. Asụsụ karịrị puku ise dị n'ụwa, ma nwekwaa ihe karịrị iri abụọ nke ndị na-asụ ya nwere ike ịkarị nde iri ise. Edemede na-adịkwakarị mfe nghọta karịa okwu ekwuru ekwu. Nke a bụ eziokwu n'ebe agwamokwu nọ; ha na-esikarị ike ịkpọpụta ọfụma. N'ọtụtụ mba dị iche iche, mmadụ niile maara asụ oyibo ọfụma, ma na mba ndị ọzọ, a ga-enwe ndị matụ obere oyibo - ọkachasị ndị na-eto eto. Cheegodu ya, maoburu na inwere ike, onye Mancunian, onye Bostonian, onye Jamaica na onye Sydneyside nnoro okpokoro okirikiri na eri nri anyasi na Toronto. Ha na-eleta onwe ha anya site n'ịkọ akụkọ si n’obodo ha ga, ha ji ndebeolu ha pụrụ iche na olu otu ha wee na-akọ ya. Igo nri na nnukwu ụlọ ahịa supamaket na abụkarị usoro ka ọnụ ala ịzụ onwe nri. Ebe ohere isi nri adịghị, enweghị nhọrọ ọzọ karịa nri esigoro esi. Nnukwu ụlọahịa gasị na-ewetazi mpaghara dị iche iche ndị nwere nri e siri esi. Ụfọdụ na-ewepụtakwa ihe eji esitụ nri n'ọkụ. Na mba ufodu ma o bu na’ufodu ulo ahia enwere na opekata mpe otu ebe a na-ere nri, oge ufodu o na abukari ebe nkiti anaghi agara onu. Mepụta ma na-ebugharị akwụkwọ amụma gị ya na akara njimama onye mkpuchi gị. Ha kwesịrị igosi adreesị ozi ịntanetị onye mkpuchi na akara ekwentị n'egosi obodo osi maka ndụmọdụ na nzọrọ. Ị ga-enwe akwụkwọ ọzọ nke ga-adị n'akpa gị na nke ị ga-etinye n'ịntanetị (zigara ya onwe gị dịka mgbakwunye, maọbụ ịchekwaa ya na "ọwa nchekwa ikuku"). Oburu na imewe njem jide igwe laptopu maobu ekwe-nti tableti, chekwaa oyiri n’ime ucje ya maobu diski (enwere-ike inweta ma ejighi intaneti). Nyekwuo nn̄omi gasị nke iwu/mkpọtụrụ nye ndị enyi ndị njem na ikwu ma ọ bụ ndị enyi nọ n’ụlọ na-achọ inye aka. Moose (amakwara dị ka elk) enweghị mburu pụta ụwa ịgha eze mana ha ga-aga chedo onwe ha ma ha hụta otu ihe ize ndụ. Mgbe ndị mmadụ ahụghị anụ ọhịa muz ka ihe nwere ike ikpata ihe ize ndụ, ha nwere ike ịbịaru ya nso karịa ka ha kwesịrị were tinye onwe ha n'ọnọdụ ize ndụ. Añụfela mmanya ike oke. Mmanya ike na emetụta ndị mmadụ n'ụdị dị iche iche, ịmara oke gị dị oke mkpa. Ụmụ ihe omume ogologo oge ahụike kwere omume sitere n'ịn̄ụ oke mmanya nwere ike ịgụnye ọrịa dị ka mmebi umeji, nakwa ọ bụna ikpu isi na ọnwụ. Ihe ize ndụ nwere ike ime na-amụbanye ma a na an̄ụ mmanya ike a rụpụtara n'ụzọ megidere iwu. Ụfọdụ mmanya ike ndị megidere iwu nwere ike nwee ọtụtụ ihe adịghị mma n'ime ha na-agụnye metanọl, nke nwere ike ịkpata ikpu ìsì ma ọ bụ ọnwụ n'ime nha ndị dị obere. Ugogbe anya nwere ike ịdị ọnụala karịa na mba ofesi, ọkachasị n'obodo na-erite obere ego, ebe ụgwọ ọrụ pere mpe karịa. Tulegodu inweta nyocha anya n’ụlọ, tụmadị ma ọ bụrụ na mkpuchite ahụike ekpuchighị ya, na iwetakwa ndenye ọgwụ a ga-enye ya ebe ọzọ. Okpokolo aha-brandi ogo-elu dị dị n’ụdị ebe ahụ nwere ike inwe nsogbu abụọ; ụfọdụ nwere ike ịbụ adịgboroja, ma ezigbo ya ebubatara nwere ike inwe ịdị dị oke ọnụ karịa n’ụlọ. Kọfi sọ na ihe kachasị aga ahịa n'ụwa, I nwekwara ike ịchọta ọtụtụ ụdịdị ya n'ebe isi. N’agbanyeghị, e nwere ọtụtụ ụzọ pụrụiche ịn̄ụ kọfị gburugburu ụwa nke kwesịrị ka e nwee ahụmihe ha. Ime egwuregwu n'ime ndagwurugwu (maọbụ: ime njegharị n'ime ndagwurugwu) bụ ihe gbasara ịga n’ala ala ndagwurugwu, nke nwere ike ịdị ọkọrọ maọbụ juputa na mmiri. Egwuregwu kanyọnịn na-ejikọta njìmebe ndị si na igwu mmiri, ịrị elu na ịwụ elu--mana chọtụ obere ọzụzụ ma ọ bụ ọdịdị mma nke anụ ahụ imalite (n'ịtụnyere ịrị elu okwute, iji skuba amanye na mmiri maọbụ ime skii ugwu, maka ọmụmaatụ). Mkpagharị bụ ihe omume anm na eme n'iro nke ihe sonyeere ya bụ ịga ije eke dị gburugburu, karicha n'ụzọ eji aga ije. Ịgagharị n’ọhịa n’ụbọchị metụtara ntoanya dị obere karịa otu maịlị ruo ntoanya ndị enwere ike ịgarụ n’otu ụbọchị. Maka ịrị ugwu n'ụbọchị site n'okporo dị mfe obere nkwadobe ka ọ ga-ewe, ma onye ọbụla ahụ gbasituru ike ga-ekpori ndụ na ha. Ezinụlọ ndị nwere obere ụmụaka nwere ike ịchọkwu njikere, mana otu ụbọchị n’ezi dị mfe omume ma ọ bụrụgodu n’agụnye ụmụ ọhụrụ na ụmụaka ọtakara. Gburugburu ụwa, e nweruru ụlọọrụ njegharị ịgba ọsọ narị abụọ. Ọtụtụ n'ime ha na-arụ ọrụ nke onwe. Ndị nnọchiteanya Global Rọnịn Tọọz, Go Rọnịn Tọọz na ejikọta ọtụtụ ndị nweta mmemme ọsọ na kọntinent anọ. O bidoro site na Running Tours Barcelona na Running Copenhagen nke Copenhagen, mana o gbughi oge Running Tours Prague nke nọ na Prague na ndị ọzọ esonye ya. Onwere ọtụtụ ihe ị kwesịrị itule tupu ị gaa njem ebe ọzọ. Ị gaa njem, dị njikere na ihe agaghị adị ka ọ dị "n'ụlọ" Agwa, iwu, nri, ụzọ, ebe ezumike, ụkpụrụ, asụsụ ma dịrị gawa ga enwe ka ọ ga-esị adị iche na otu osiri dị n'ebe ibi. Nke a bụ ihe ikwesịrị ibu n'uche ka Ị ghara inwe ngharịpụ maọbụ obi mgbarụ n'ebe usoro esi eme ihe dị. Ụmụ ụlọ ọrụ njem anọọla ya kemgbe narị afọ nke iri na itoolu. Otu onye ụlọ ọrụ njem na-abụkarị nhọrọ dị mma maka njem nke gafere karịa ahụmihe gara aga nke onye njem nke ụwa, omenala, asụsụ ma ọ bụ mba ndị nwere obere ego mkpata. Obu ezie na ihe-ka-na-onuogugu ulo nnochita-anya di njikere iwerekwu ohere-ka-na-onuogugu otutu ndi nnochita-anya na elekwasi anya na otu udi ime-njem,ogo nhzi na ebe-ana-aga. Onwere ike ka nma iji onye nnochita-anya onye gana edebere gi ohere ime njem kwa mgbe yiri nke gi. Lee anya na ihe njem oje ozi na ebuli elu, ma o bu na webusaiti ma o bu na windo ulo ahia. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgagharị akụkụ ụwa di iche iche n'emefughi oke ego, ikekwe maka ịghaghị ime ya, maọbụ maka ụdịrị ndụ i na-ebi, maọbụ naanị dịka ịma aka, enwere etu a ga-esi eme ya. N'ụzọ bụ isi, ha dabara n’ụdị abụọ: Ma ọ bụ rụọ ọrụ dị ka ị na-eme njem ma ọ bụ gbalie ma belata mmefu ego gị. Edemede a gbadoro anya na nke ikpeazụ. Maka ndị dị njikere ịhapụ nkasi obi, oge na mmadụ ịkọ ihe ha ga-eme ka ha wee nwee ike ịkwụ naanị obere ụgwọ, lee ụgwọ njem kachasị nta. Ndụmọdụ a zubere na ndị njem anaghị ezu ohi, jehiee ụzọ, tinye aka na ire ahịa megidere iwu, rịọọ arịrịọ, maọbụ rigbuo ndị ọzọ maka ọdịmma nke ha. Ebe nnyocha njem mbata na ọpụpụ na-abụkarị ebe nkwụsị mbụ mgbe a na-apụta n'ụgbọelu, ụgbọmmiri, maọbụ n'ụgbọ ọzọ. N’ufodu ugbo oloko n’agafe mba di iche iche ana enyocha ha mgbe ha na gbaa, ya bu na ikwesiri ijide njirimara bara uru mgbe iga abanye otu n’imeugbo oloko ahu. N'ụgbọoloko abalị a na-arahụ ụra na ya, onye nhazi ụgbọ nwere ike ịnara gị akwụkwọ ikike ime njem gị ka a ghara inye gị nsogbu ka ị na-arahụ ụra. Ndebanye aha so n'ihe a na-achọ n'usoro ịnweta visa. Na mba ụfọdụ, ị ghaghị ịdebanye ọnụnọ gị na adresi ebe i bi na nke ndị isi ala. Nke a nwere ike ịchọ idejupụta otu fọọm gị na ndị uwe ojii keobodo ma ọ bụ otu nleta na ụlọ ọrụ mbata na ọpụpụ. N'ọtụtụ obodo nwere iwu dị otu ahụ, ụlọ nkwari akụ dị gburugburu ga-ahụ maka ndebanye aha (hụ na ịjụrụ ese) N'ọnọdụ ndị ọzọ, naanị ndị na-anọ na mpụga nke ụlọ ndị njem nleta bụ aghaghị ịdebanye aha. Agbanyeghị, nke a mere ka iwu dịkwuo mgbagwojuanya, ya mere chọpụta tupu oge eruo. Architecture n’afu maka iru ulo n’udi ulo. Architecture ebe obula bu ihe nkiri n’onwe ya. Ọtụtụ ụlọ na-ama mma ile anya ma isi na nnukwu ụlọelu maọbụ site na windo e dobere nke ọma nwere ike ịbụ ihe dị mma ile anya. Imewe ọrụrụ ụlọ gwakọtara nke ukwuu na ogige ndị ọzọ gụnyere ịtụ atụmatụ obodo, mmụta sịvịl injinịa, ụmụ nka eji achọ mma, imewe ime ụlọ na imewe odida obodo. Ka ebe ahụ siri dị ọtụtụ ndị pueblos bụgasị, ị gaghị enwe ike ịchọta etu ndụ abalị ebe ahụ siri dị ma ọbụghị ma ị gara n’Albuquerque maọbụ Santa Fe. N'agbanyeghị nke a, ọfọrọ obere ka kasino nile edepụtara na enye mmanya, ọtụtụ n'ime ha na ewebata ihe nlereanya amaara amaara (karịchaa ndị nọ Abụkuki na Santa Fe nso). Uche gị dị ya: ụlọ mmanya ndị obere abụghị ebe dị mma ka onye mbịa mbịa nọrọ. Ugwu Niu Megziko nwere nnukwu nsogbu gbasara ịnya moto n'oge mmanya obubu, na ọnụ ọgụgụ ndị ọkwọ ụgbọala mmanya na-egbu ka nkụ na nsonso ụmụ obere ụlọ mmanya nọ n'obodo. Ihe eserese na ahuaja maobu idegheri ana achoghi bu ihe amaara dika ide ihe na ahu aja. N'agbanyeghị na obidoghị taa, ọtụtụ mmadụ nwere ike itunyenyere ya ndị ntorobịa ji agba na-emebi ihe ọha na nke onye. Kaosinadị, ụbọchị ugbu a e nwere ọtụtụ omenkà eserese ewubere, emume eserese ga n’ọgbà "iwu" gasị. Etemụàgbà eserese n’ọnọdụ a mgbe ụfọdụ na-egosipụta ǹkàọrụ karịa igosi ụmụ taagị ezighi ezi. Ịtụ atụ nke boomerang bụ nka ama ama nke ọtụtụ ndị njem nleta chọrọ inweta. Ọbụrụ na ị chọrọ ịmụta ka esi atụ bumerang nke na alaghachikwute gị ma Ị tụpụ ya, gbalịa hụ na Ị nwere nke na alaghachikwute alaghachikwute. Oka-na-onuogugu igba-okirikiri di na mba Australia bu n’ezie nke na anaghi alaghachi azu. Okacha nma nke ndi n’ebido-ebido ghara inwa itubata ikuku. A na-esi Nri Hangi n’ime olulu dị ọkụ nọ n’ime ala. A na-eji okwute si n'ọkụ eme ka olulu a dị ọkụ, maọbụ n'ụfọdụ ebe ọkụ si n'ime ala n'eme ka ala dị ọkụ n'onwe ya. A na-ejikarị hangi ahụ isi nri abalị otu ụdị ahụrụahụ keọdịnala. Ọtụtụ ebe na Rotorua na enye jiotemal hangi, mana enwere ike ilele hangi ndị ọzọ na Kraịstchọch, Wellịntụn na ebe ndị ọzọ. MetroReel nwere ngalaba abụọ n'ụgbọ oloko njem n'ime ma na gburugburu Kep Taụn: MetroPlọs (nke a na akpọkwa ngalaba nke izizi) na Metro (nke a na akpọ ngalaba nke atọ). MetroPlus ka mma maka ezumike ma nwekwaa ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ pere mpe karịa, mana ọ dịtụ ọnụ karịa; n'agbanyeghi, ọ ka dị ọnụ ala karịa akwụkwọ njem metro na Yurop. Ụgbọ oloko ọ bụla nwere ma MetroPlus ma Koochi gasị; koochi MetroPlus ndị ahụ na-anọkarị n’ọdụ nke ụgbọ oloko kacha nso na Cape Town. Ị na-ebe maka ndị ọzọ - Ekwela ka anya gị pụọ n’akpa gị, tụmadị mgbe ị na-agafe oke ala mba ndị ọzọ. I ga-ahụtali onwe gị ebe e ji gị eme onye na-ebu ọgwụ n’amaghị ụma, nke ga-edubali gị na nnukwu nsogbu. Nke a gụnyere iche n’ahịrị, dị ka enwere ike iji nkịta ndị na-esipụta ọgwụ n’oge ọ bụla na-amaghị ọkwa. Ụfọdụ obodo nwere ntaramahụhụ mmebi iwu siri oke ike ma nyekwa ndị ọbụ mbụ ha imebi iwu; ndị a nwere ike ịgụnye ịtụ nga karịa afọ iri maọbụ ọnwụ. Akpa na-enweghị onye na-elekọta ha na-abụ ihe ebumnuche maka izu ohi ma na-adọtakwa uche ndị ọchịchị na-atụ egwu bọmbụ. N’ụlọ, n'ihi otu e si ebute nje keobodo mgbe niile, o were anya n'ebe ọ dị ukwuu na ị dịrịlarị nwee ahụ mgbochi maka ha. Mana n'ebe ndị ọzọ n'ụwa, ebe ụdị nje bakteria bụ ihe ọhụrụ, ị kara nwee ike ịdaba na nsogbu. Nakwa, n’ebe enwere okpomoku ihu igwe nje n’etoo osiso ma kwa n’ebite aka mgbe onoghi n’ahu mmadu. Ya mere, ihe otiti nke Delhi Belly, Abụmọọnụ nke Fero, Mmegwara nke Montezuma, na ọtụtụ ndị enyi ha. Ka esi enwe nsogbu iku ume na obodo oyi na-atu, nsogbu eriri afo hirine na obodo di oku ma otutu oge ha na akpasu iwe ma odicahghi ize ndu. Ọ bụrụ na imewe njem izizi n'ime obodo na-emepe emepe - maọbụ na mpaghara ọhụụ e kepụtara n'ụwa - elelikwala ihe iju anya nke omenala i nwere ike ịhụta. Ọtụtụ ndị njem rijuru afọ bụ ndị njem n'ụwa ka na emepe emepe juru anya, ebe ọtụtụ obere mgbanwe omenala nwereike ịghọ ihe ukwu n'obere oge. Okacha na mbido, nwaa ibi ndu ka onye bekee, omaricha ulo ezumike, ezigbo nri na inweta ezigbo ndi nnedo anya n’enyere aka imeda obi. Arahụla n’elu matraasi ma ọ bụ n'elu paadị mgbe ị nọ n'ebe ị na-amaghị ala. Ọ bụrụ na ị ga-ama ụlọikwuu n’ezi, weta ihe ndina mara ụlọikwuu ma ọ bụ hammock iji gbochiri gị agwọ, akpị na ndị dị otú ahụ. Were isi kofi mejuputa ulo gi n’ututu were kwazia chamomile n’akwado ezumike mejuo ya n’abali. Mgbe ị nọ na ezumike ime ụlọ, i nwere ohere ịlezi onwe gị anya ma were elekere ole na ole isipụta otu ihe pụrụ iche. Ọ bụrụ na aka na-akọ gị ọkọ karịa, were otu aka ahụ pịchaa maọbụ kwọọ ụfọdụ mkpụrụ osisi: o nwere ike i ga-achọpụta ihe ọṅụṅụ i nwere ike iji mee nri ụtụtụ mgbe ị gachara ihe dịịrị gị kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na i bi n’obodo nwere ọdịnala ịn̄ụ mmanya dị iche iche, gaa n'ụlọ mmanya ma ọ bụ ebe ịn̄ụ mmanya na mpaghara ị na-anaghị aga ọtụtụ oge. Maka ndị na-aghọtaghị ụdịrị mkparịta ụka nke ndị dibia bekee, ahịrịokwu okwu "infectious" na "contagious" nwere mpụta dị iche iche. Ọrịa na-efe efe bụ otu nke patoginụ kpatara, dị ka nje, bakterium, nje ero ma ọ bụ parasaịtị ndị ọzọ. Ọrịa na-efe efe bụ ọrịa mmadụ nwere ike ibute site n'ịnọ na gburugburu onye na-arịa oria ahụ. Ọtụtụ gọọmenti na mba dị iche iche nwere iwu na onye ọbụla na-abata maọbụ na-apụ n'obodo ha ga-ebu ụzọ gbaa ọgwụ mgbochi megide ụfọdụ ọrịa dị iche iche. Ihe ndị a na-achọ nwere ike idabere na mba ndị onye njem gagoro maọbụ ndị ọ chọrọ ịga. Otu n'ime ihe mere Chalọt, Nọt Karolaina jiri kara ibe ya bụ na o nwere ọtụtụ nhọrọ dị́ mma ma dị elu dịịrị ezinụlọ. Ndị bi n’obodo ndị ọzọ na-arụtụkarị aka na nnabata ndị ezinaụlọ dịka isi ihe na-akpata ịkwaga ebe ahụ, ndị ọbịa na-ahụkarị obodo ahụ dịka ebe di mfe inwe obi ụtọ ma gi na ụmụaka gi soro. N'afọ iri abụọ gara aga, ọnụ ọgụgụ nhọrọ dịịrị ụmụaka mma na Ọptaụn Chalọt amụbaala nke ukwu. Ezinụlọ ndị bi na Chalọt anaghị aba tagzi, kama n'ọnọdụ dị añaa ha nwere ike jiri ha mee ihe. Enwere ụgwọ mgbakwunye dịịrị ibukarị ndị nje abụọ, ya mere nhọrọ nke a nwere ike ịdị ọnụ karịa ka okwesiri. Antatika bụ ebe kacha atụ oyi n'ụwa, ọ gbakwara isi ụwa nke ndịda ogige. Nleta nke ndị njem nleta dị oké ọnụ, chọrọ ahụike anụ ahụ, nwere ike ịme naanị n'oge ọkọchị Nov-Feb, ma ejedebere ha n'ụzọ dị ukwuu na Peninsula ahụ, Agwaetiti na Oke Osimiri Ross. Ndị ọrụ puku ole na ole na-ebi ebe a n'oge sọma, n'ime ihe dị ka ụlọ iri anọ na asatọ nke ọtụtụ n'ime ha nọ n'akụkụ ndị ahụ; ndị ụfọdụ na-anọ n'oge oyi. Ime Obodo Antarctica bụ elu ugwu larịị tọgbọrọ n'efu nke aịs ruru kilomita 2-3 kpuchiri. Ọkachamara mgbe ụfọdụ nke njegharị n'ikuku na-aga n'ime ime obodo, maka ihe omume iri elu ugwu ma ọ bụ ịgarute na Polu, nke nwere nnukwu ntọala. Njem ngafe (ma ọ bụ Okporo ụzọ awara awara) Okporo Osisi ala nke Ndịda bụ okporo ụzọ dị kilomita 1600 site na Ọdụ ụgbọ McMurdo nọ na Oké Osimiri Ross ruo Okporo Osisi ala. Sno ya kpụkọtara ọnụ nwere ọtụtụ oghere nke e jiri ọtụtụ ọkọlọtọ sụjuo ma mee akara. Ọ bụ naanị ụgbọndọkpụ pụrụiche, sledị e ji ebu ihe nwere ike ịgafe na ya n’iji mmanụ ụgbọala na ngwaahịa. Ndị a anaghị agbasi ọsọ ike ya mere ụzọ ije ya ga agba gburugburu ugwu Transatik wee bịa na ala ugwu. Ihe na akpatakarị ihe mberede n'oge oyi bụ ụzọ n'achị achị. Ma ọ pekarịa mpe, nwee akpụkpọ ụkwụ nwere okpuru kwesịrị ekwesị. Akpụkpọ ụkwụ sọma na-amịkarị amị nke ukwuu n'elu aịs na sno, ma ụfọdụ akpụkpọ ụkwụ wịnta agaghị adị mma. Nhazi ya kwesịrị imi emi ọfụma, 5 mm (1/5 inchi) maọbụ karia, nakwa akwa ya aghaghị idi nro ọfụma n'oge oyi. Ụfọdụ buutu nwere stọọdụ ma e nwere akụrụngwa mgbakwunye stọọdụ maka ọnọdụ na-amị amị, nke dabara adaba maka ọtụtụ n’ime akpụkpọ ụkwụ na buutu, maka ikiri ụkwụ ndị ahị ma ọ bụ ikiri ụkwụ na ọbọụkwụ. Ikiri akpụkpọ ụkwụ kwesịrị ịdị ala ma saa asaa. Aja, okwute maọbụ nnu (kalshium kloraịdị) bụ ihe a na awụsakarị n'elu ụzọ iwedata ọchịchị ha. Avalanche abụghị ihe egwu; mkpọda ugwu nwere ike ijide naanị oke sno ọ ga-ejideli, nke fọrọ afọ ga-agbadata dị ka avalanche. Ihe bụ nsogbu bụ na sno na-amapawa amapawa, ya mere ọ na-achọtụ mkpachara tupu ọ gbadata, ma ụfọdụ sno ịgbadata nwere ike bụrụ ihe mkpachara ga-eme ka ndị nke fọrọ afọ soro. Mgbe ụfọdụ ihe omume mbido na-akpalite bụ anyanwụ na-ekpo sinoo ọkụ, mgbe ụfọdụ mmiri ozuzo sinoo na-ezokwu ọzọ, mgbe ụfọdụ ihe omume eke ndị ọzọ, na-abụkarị mmadụ. Oke ifufe tonado bụ ikuku kwụ ọtọ ma na-atụgharị, nke nwere obere preshọ, ma na-amịkpu ikuku dị ya gburugburu baa n'ime na n'elu. Ha na ebupute oke ikuku (ọtụtụ mgbe maịlụ 100-200 kwa awa) ma nwee ike ibuli ihe ndị dị arọ n'ikuku, na-eburu ha dịka oke ifufe tonado na-aga. Ha na-amalite dị ka fọneelụ si n’igwe ojii oké mmiri ozuzo agbada, ma bụrụzie “ụmụ ajọọ oké ifufe” mgbe ha metụrụ n’ala. Ndị nnyem VPN (virtual private network) keonwe bụ ezigbo ụzọ ịgbanaha ma mgbochi ke ọchiọhcị na mgbochi IP ọha keala mba. Enwere ọtụtụ ihe mere ha ji kara web prọgzi mma: ha na-agbanwe ụzọ trafik ịntanetị niile, ọ bụghị naanị http. Ha na-enyekarị bandwidth dị elu karịa na saviisi ka mma. Ekpuchiri ha ekpuchi ya mere o siri ike inyota ihe dị ha n'ime. Ụlọ ọrụ ngosi ihe na-atụ asị kwa mgbe gbasara ihe nke a na-arụ, na-asị na ọ bụ "igbochi mmegharị n'enweghi ikike mmegharị". N’ezie, koodu mpaghara enweghị mmetụta na nkọpi iwu megidere; nkọpị diski ga-akpọ ọfụma n'igwe ọbụla ebe nke ezigbo ya ga-akpọ. Uru ọ bara n'ezie bụ ịme ka ụlọ ọrụ gasị nwee ikikere ebe ahịa ha nọ; Ihe a na-ele anya bụ ị na-esere ego dịka mmiri. Maka a na-eduzi ọkpụkpọ n'ofe ịntanetị, ị kwesịghị iji ụlọ ọrụ ekwentị nọ n'ebe ị bi ma ọ bụ ebe ị na-aga njem. Ọ bụghịkwa iwu na ị ga-anara nọmba ekwentị obodo ebe i bi; i nwere ike ịnweta njikọ ịntanetị satịlaịt n'ọzara Chikin n'Alaska ma họrọ nọmba ekwentị na-ekwu na ị nọ n'okpuru anwụ Arizona. Ọtụtụ mgbe, ị ga ekwesị igo akara ekwentị zuru oha iche ka ekwentị PSTN nwee ike ịkpọ gị. Ebe akara ekwentị sị na-eme ihe dị iche nue ndị na-akpọ gị. Ụmụ ngwa nsụgharị ngwe keezigbo-oge – ngwa ndị nwere ike ịsụgharị nkebi ngwe zuzu ezu n’ezigbo-oge site n’otu asụsụ banye n’ọzọ. Ụfọdụ ngwa nọ n’òtù a nwere ike ịsụgharị ngwe ndị nọ n’asụsụ mba ofesi nọ n’ụmụ nrụaka ma ọ bụ ihe ndị ọzọ n’ime ụwa n’ezie mgbe òjìàrụ ahụ chewere ekwentị-maihe ihu gakwuru ihe ndị ahụ. Njin nsụgharị asụsụ agbanweela nke ọma nke ukwu, ka ha na enyezi nsụgharị ziri ezi (makwa ndị bna enweghị isi ọtụtụ mgbe) mana okwesiri nleba anya, n'ihi na ha nwere ike ịda ya. Otu n'ime ihe eji eme nke a bụ Ntụgharị Kegugulụ, nke na-enye ohere ime ntụgharị na-anọghị n'ịntanetị ka e budatachara asụsụ a chọrọ. Iji ngwa GPS n'ekwentị gị nwere ike bụrụ ụzọ kachasị mfe iji gagharịa mgbe ị na-anọghị n'obodo gị. O nwere ike ichekwa ego n’ofe ịzụ ụmụ maapụ ọhụrụ maka otu GPS, ma ọ bụ otu ngwaọrụ GPS nkwụnotu ma ọ bụ ịgbazinye otu site n’otu ụlọ ọrụ mgbazinye ụgbọala. Ọ bụrụ na ịnweghị njikọ data n'ekwentị gị, maọbụ mgbe ha nọ n'ọpụpụ ogbe njikọ ahụ, arụmọrụ ha nwere ike dị obere maọbụ ọgaghị adị chaa chaa. Ahịa nkuku juputara na kaadị mkpọtụ ekwentị akwụgo ụgwọ enwere ike iji site na payphone ma ọ bụ igwe nkịtị. N'agbanyeghị na ọtụtụ akwụkwọ akara njiarụ ekwentị dị mma ịkpọ oku ekwentị gaa ebe ọbụla, ọrụ pụrụ iche ụfọdụ n'ime ha na-arụ bụ ime ka ọnụ ọkpụkpọ oku gaa ụfọdụ obodo dị ala. Inweta òhèrè n'ọrụ ndị a bụ site n'akara ekwentị n'akpọ oku n'efu nke e nwere ike isi n'ọtụtụ n'ime ekwenti kpọọ ya na-akwụghị ụgwọ. Iwu na-achị esem foto na-achịkwa esem vidiyo, onwere ike karịchaa na ya. Ọ bụrụ na iwu megidere ise ihe foto, ikwesidighi ịnwa ime ya vidio. Ọ bụrụ na iji drone arụ ọrụ, tulee n’oge dịka ihe e nyere gị ikikere iseta maọbụ ikikere maọbụ ikikere ọzọ gasị achọrọ. Ife ngwa dron fefee ọdụ ụgbọelu maọbụ igwe mmadụ na-abụkarị ihe ọjọọ, ma ọ bụrụ rịị na o megideghi iwu n'ebe ịnọ. N'oge ugbu a njem ụgbọ elu bụ naanị na ọ na-ara ahụ tupu e tinye akwụkwọ ya ozugbo site na ndị ụgbọ elu na-ebughị ụzọ chọọ ma tụnyere ọnụ ahịa. Oge ụfọdụ otu njem ụgbọelu nwere ike inwe ọnụahịa dị iche iche site n'aka ọtụtụ ndị nchịkọ ma ọ ga-abara gị uru ma ọ bụrụ na itule ọnụahịa ndị a ma leekwa anya n'amasaịba ụgbọelu ahụ tupu ịgbara tiketi. Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị iwu inwe visa tupu a gaa ụfọdụ mba maka ọnụnọ obere oge dịka njem nlereanya maọbụ azụmahịa, mana ịga gụọ akwụkwọ ebe ahụ pụtara na ọnụnọ gị ga-ete aka karịa nke onye njem nlereanya nkịtị. N’izugbe, ịnọ na mba ofesi ọbụla ruo ogologo oge ga-achọ ka ị nweta visa n'ọdịnihu. Visa ụmụ akwụkwọ nwere ihe ọchịchọ dị iche ma usoro ngwa dị iche na nke onye njem nkịtị maọbụ visa ọrụ. Nye ututu obodo ka n’onu-ogugu, iga enwe mkpa inweta akwukwo-ozi nke onyinye sitere ulo-akwukwo ha choro iga, ya na ihe ngosi ego nkwado iji kwadoo onwe gi ihe dika opekata mpe otu afo aguma akwukwo gi. Jụọ ese maka ihe ndị ọzọ achọrọ n'ụlọ akwụkwọ nakwa na ngalaba mbata na ọpụpụ nke mba ebe ị chọrọ ịgụ akwụkwọ. N'abụghị ma ị bụ onye nnọchiteanya mba, ịrụ ọrụ n'ofesị mmiri pụtara na ị ga-akwụ ụgwọ ụtụ isi n'obodo ibi. Obodo di iche iche na-ahazi ụtụ isi ha n'ụzọ nke ha, nakwa ụgwọ ụtụ isi na etu e si ahazi otu ndị na-akwụ ya dị iche site n'otu mba ruo n'ọzọ. N'ufodu mba nwere goomenti etiti dika United States na Canada, ana anako utu isi ego ma na goomenti etiti na kwa na mpaghara ya kpatara na onuego n’aka mgbodo ya ji di iche iche na mpaghara obula. Dịka nnyocha mbata na ọpụpụ anaghị adịkarị ya maọbụ ọ dịrị n'ụdị a sịkwa ka emee mgbe ị batara n’ala nna gị, njikwa ndị kọstọm nwekwara ike inye nsogbu. Kpachara anya ịmara ihe a ga-ekwe gị webata na nke iwu megidere ịwebata ma gwa ha ma ị nwee ihe ọbụla iwu akwadoghi. Ụzọ kachasị mfe ibido ọrụ edemede gbasara njem bụ ịmụta na webụsaịtị na-ede gbasara njem. Mgbe o dochaa gị anya etu e si agbanwe ma na-ahazi ihe n'ịntanetị ka onye siri chọọ, i nweziri ike gaa n'ihu rụọ weebụsaịtị nke gị. Ọrụ afọ ofufo mgbe i na eme njem bu uzu di ukwu iji mee ihe di iche ma obughi so n’inye ihe. Ibi na ịrụ ọrụ afọ ofufo na mba ofesi bụ ezigbo ụzọ a ga-esi mata omenala dị iche, zute ndị mmadụ ọhụrụ, mụọ maka gị, nweta mmetụta nke echiche ma nwetakwa ụmụ nka ọhụrụ. O nwekwara ike bụrụ ezigbo ụzọ iji gbatịa nhazi mmefu ego inye ohere ịnọtukwu ogologo oge n'otu ebe ebe ọ bụ na ọtụtuụ ọrụ akwụghị ụgwọ na-enye ọnụụlọ na ụgbọ ma ole na ole na-akwụ obere ụgwọ ọnwa. Ndị Vaịkịngị ji ụzọ mmiri ndị Rọshịa were ruo osmiri na Osimiri Ojii na Osimiri Kaspịanụ. A ka na-esi ụfọdụ ụzọ ndị a ruo taa. Jụọ ase maka inweta ikike pụrụ iche, nke nwere ike ịra ahụ inweta. Ụzọ mmiri Waịt Sii-Baltik jikọrọ Oke osimiri Aktik na Oke osimiri Baltik, site n'Ọdọmmiri Onega, Ọdọmmiri Ladoga na Saint Petersbourg, site n'osimiri na ọdọmmiri ọtụtụ mgbe. Ejikọkwara Ọdọ mmiri Onega na Volga, ya mere ịbịa site na Oke osimiri gafee Rọshịa ka kwekwara omume. Mara amara n’ozugbo iruru n’isi mmiri ihe niile ga-edo gi anya. I ga ahu ndi ozo n’acho ugbo mmiri ha ga banye, ha ga-agwa gi ihe gbasara onwe ha. N'ụzọ bụ isi, ị ga na-etinye ọkwa nke na-enye enyemaka gị, na-ejegharị ije na dọọkụ, na-agakwuru ndị mmadụ na-ehicha ụgbọ mmiri ha, na-anwa ịkpọtụrụ ndị ọkwọ ụgbọ mmiri nọ n'ụlọ nkwụ ha, wdg. Nwaa igwa ka ha ra bu madu ole inwere ike igwa okwu. Obere oge mmadu nile amata gi ma tupenyere gi azu banyere ugbo-mmiri nke n’acho mmadu. Ị kwesịrị ịkpachapụ anya ịhọrọ ndị ụgbọ elu ị Na-esonyekarị Efe Mgbe Niile n'otu njikọ aka. Agbanyeghị na inwere ike iche na o sinammụọ isonye ndị ụgbọ elu ahụ ị na-esokarị ọtụtụ mgbe. Ị kwesịrị ịmara na ikike a na-enye na-adịkarị iche ma ebe ndị a na-agakarị nwere ike imesapụkwụ aka n’okpuru ụgbọ elu n’otu nkwekọrịta ahụ. Ụlọ ọrụ njem ụgbọelu dịka Emirets, Etihad Eewez, Katar Eewez, Tọkish Eewez ebidola ịrụ ọrụ n'Afrịka karịa, na-eme ka ndị mmadụ si na nnukwu obodo Afrịka gaa n'ọzọ n'ọnụ ahịa ka nke ụlọ ọrụ njem ụgbọelu ndị ọzọ si Yurop mma. Ụmụ Ụlọọrụ ụgbọelu ndị Tọọki na-efe gaa ebe ije iri atọ na itoolu n’ime mba Afrịka iri atọ dị ka na 2014. Ọ bụrụ na ị ka nwere oge njem, lee anya ka ị mara otu ego niile ọ ga-eri gị ịga Afrịka sị dị ma a tulee ya na ego ọ ga-efu gị ịgagharị ụwa gburugburu. Echefula igbakwunye ego ole ọzọ ụmụ visa ọzọ, ụtụ isi ọpụpụ, njem ụgbọ ala, dgz. ga-efu maka ebe ndị ọzọ ahụ niile na mpụga Afrịka. O buru na ichoro ifegheghari na ndida emisfee, i gaghi enweta mmasi gi na ugbo elu ma o bu ebe ije maka na enwere uko uzo transocean. Onweghi nkwekorita ụgbọ elu na-ekpuchi ngafe oke osimiri atọ niile na Mpaghara Okpu Ndịda (ma SkyTeam anaghịkwa ekpuchi ngafe ọ bụla ahụ). Agbanyeghi, Sta Alayans na-ahụ maka ihe niile belụ sọọsọ akụkụ ọwụwa anyanwụ Pasifik Ndịda site na Santiago de Chile ruo Tahiti, nke bụ njem ụgbọelu LATAM Otuụwa. Ọ bụghị naanị njem ụgbọelu a dị, ma ọ bụrụ na ị chọghị igafe Pasifik Ndịda na akụkụ mmiri ọdịda anyanwụ nke Amerịka Ndịda. (lee anya n'okpuru ebe a) N'afọ 1994, ndị Negorno-Karabakh, ndị agbụrụ ha si mba Amenịa, buru agha megide ndị Azebaịjan. Site na nkwado mba Amerịka, ejere mba ọzọ. N'agbanyeghị nke a, onweghị mba guzobere onwe ya - ọbughị ma mba Amenia - nabatara ya. Arụmụka ọchịchị obodo ka na emebi mmekọ Amenia na Azabaịjan. Mpaghara Kanal (Dọch: Grachtengordel) bụ mpaghara narị afọ 17 a maara aha ya, gbara Binenstad nọ n'Amstadam gburugburu. UNESCO edetuola aha mpaghara niile a dịka Ebe Nketa Ụwa maka uru ọ bara nye omenala na akụkọ ụwa, nakwa ụlọ kacha dị ọnụ ebe ahụ karịa ebe ndị ọzọ n'obodo. Obodo ndị nọ n'ụsọ oke osimiri bụ Riomaggiore, Manarola, Kọniglia, Venaza and Monteroso ka a na-akpọ Sinque Terre, nke pụtara Ala Ise, nke dị na mpaghara Itali nke Liguria. E debara aha ha na ndekọ Wọld Heritej List nke UNESCO. Ka afọ na-aga, ndị mmadụ arụọla ụzọ ngafe n'ala mkpọda nke juputara na nkume ruo n'ọnụ ugwu nke lepụgara anya n'oke osimiri. Otu n'ime ihe mere ndị mmadụ ji nwee mmasi na ya bu na o mepebeghi emepe. Okporo ụzọ, ụgbọ oloko na ụgbọ mmiri jikọrọ obodo ndị dị na ya. Ọzọ, ụgbọala enweghị ike isi n'ezi bata ya n'ime. Ụdị asụsụ French dị iche iche nke a na-asụ na Belgium ma na Switzerland dị iche na nke a na-asụ na France, mana ha yiri onwe ha ruo oke na onye ghọtara otu ga-aghọta ndị ọzọ. Kpọmkwem, sistemụ ọnụ ọgụgụ n’ime ndị na-asụ Frenchị n’ime Belgịọm na Switzerlandị nwere ụfọdụ ndịiche ndị dị iche site na Frenchị a na -asụ n’ime Fransị, na mkpọpụta ụfọdụ mkpụrụ okwu dịtụ iche obere. N’agbanyeghị, Ndị Belgịọm na Swiiz niile na-asụ Frenchị agagọrọ ịmụ Frenchị izugbe n’ụlọ akwụkwọ, ha ga-enwe ike ịghọta ihe ị na-ekwu ma ọ bụrụgodu na ị jiri sistemụ ọnụọgụgụ Frenchị izugbe. N'ọtụtụ ebe n'ụwa, ife aka bụ emereme nnabata, nke na-egosipụta "ndeewo." Ma na, na mba Malesia, n'etiti ndị Males, ọ pụtara "bịa" dịka mgbe rọgharịrị mkpụrụ aka nke izi ịtụ onwe aka, akara e ji mere mkparịta ụka n'ọtụtụ obodo, ma bụrụ sọ ihe eji ya eme. N'otu aka ahụ, onye ome njem Britenụ nọ na Spenụ nwere ike ịghọtaghie ofufe aka "ka ọdị" nke ihu aka chere onye na-efe ya ihu (kama onye a na-efere aka) ka ọ na-asị ya lọghachi. Ụmụ asụsụ inyeaka bụ asụsụ nke akamere ma ọ bụ asụsụ ndị ewuru ewu e kere n'ebumnuche nke ime ka mkparịta ụka dị n'etiti ndị gara-enwe nsogbu ikwurita okwu. Ha dị iche site na lingua franca, ndị nke bụ asụsụ ụwa ma ọ bụ nsinụwand ndị mechara wụọ nnọchike maka otu ihe mkpata ma ọ bụ nke ọzọ dị ka ụzọ nke nkwukọrịta n’etiti ndị na-asụ asụsụ ndị ọzọ. Na ughu ọkụ nke ụtụtụ, ndị njem nwere ike ịhụ mịraj nke na-eme ka ọdị ka mmiri (maọbụ ihe ọzọ) ọ dị n'ụzọ. Ihe ndị a nwere ike ịgbawa obi ma onye njem gaa chụwa ihe efu a, na-emefusi ike a ga-eji eme ihe dị mkpa, ya na mmiri fọrọ afọ. Ọ bụrụgodina ọzara kacha ekpo ọkụ nwere ike ịjụ oke oyi n’abalị. Hypothermia bụ ihe ize ndụ dị ire ọ bụrụ na enweghị akwa na-ekpotụ ọkụ. Karịchaa n'oge ọkọchị, Ị kwesịrị ịnọ na nche maka anwụnta ma ọbụrụ na I kpebie ịga mkpagharị n'ọhịa udummiri. Ọbụrụgodi na iji ụgbọala agbafe ọhịa udummiri, nkeji ole m'ole ụzọ ghere oghe mgbe ị na-aba ụgbọala ezuola anwụnta iso gị bata. Bird flu, ma ọ bụ ezigbo aha ya avian influenza, nwere ike imetụta ma ụmụ nnụnụ ma ụmụ anụmanụ. Akpabatabeghị ikpe okwu fọrọ obere ghara eru otu puku n’ụmụ mmadụ, mana ụfọdụ n’ime ha anwụọla. Ndị ka n'ọnụ ọgụgụ etinyela ndị ọrụ ọzụzụ ọkụkọ n'ọrụ, mana obere ihe ize ndụ dịịrị ndị na eledo nnụnụ anya. Na mba Nọọwe, enwere mkpọda ugwu na ndịda ugwu na anọkata ghọrọ ala dị elu ma dị larịị. Ala ndị a dị larịị ka a na akpọ "vidde" nke pụtara ebe dị obosara, ghee oghe, dị mgbasa dị egwu ma ghara inwe osisi. Na Rogaland na Agda a na akpọkarị ha "hei" nke pụtara ala dị larịị na enweghị osisi. Akpụrụ mmiri ebe ahụ anaghị anọ otu ebe, kama ọ na-eruda ugwu. Nke a na-ebute maka mgbaka na mpio nke akwa sno nwere ike ikpuchido. Mgbidi na mkpuchi elu nke ọgba akpụrụ mmiri nwere ike ịda ma mechie mgbawa. N'ọnụnụ akpụrụ mmiri, akpụrụ buru ibu na-agbakapụ, daa nwekwaa ike tụgharịa daje oteaka ọnụnụ ya. Oge nlere anya ugwu na abụkarị n'oge ọkọchị India. Mana, ha nwere mma dị iche n'oge oyi, mgbe sno na-ada n'ọtụtụ ugwu were nyefe efe msks ihe omume dịka skiyin na snobọdịn. Naanị ụfọdụ ụlọ ọrụ njem ụgbọelu ka na-enye ụgwọ nnwụnahụ, nke na-ewepụtụ ego n'ụgwọ njem akwamozu a na-eme na ngwụcha oge. Ụgbọelu ndị na enye ihe ndị a bụ Air Kanada, Delta Air Laịns, Luftansa maka nfegharị bidoro na U.S. maọbụ Kanada, na WestJet. N'ọnọdụ niile, i ga-ejiriri ekwentị gị akwụ ụgwọ ọnọdụ gị n'ụlọ ọrụ ụgbọelu a.