evaluation/ig-en/flores-test.ig (1,012 lines of code) (raw):
Ugbu a, anyị nwere ụmụ oke ọnwa anọ na-arịabu ọrịa shuga mana ha anaghị arịazi ya.
Dr. Ehud Ur, ọkammụta nke ọgwụ na Mahadum Dalhousie nọ na Halifax, Nova Scotia na onye isi oche nke ngalaba ụlọ ọgwụ na sayensi ahụ nke Òtù Ọrịa Shuga ndị Kanada dọrọ aka na ntị na nnyocha ahụ ka nọ n’oge ndị mbụ ya.
Ka ndị ọkachamara ndị ọzọ, o kwenyeghị na a ga agwọtanwu ọrịa shuga, o depụtara na ihe nchọpụta ndị a enweghị mmetụta nye ndị nwere ọrịa shuga Taịp 1.
N'ụbọchị Mọnde, Sara Danius, onye odeakwụkwọ Nobel kọmitii maka akwụkwọ agụmagụ n'ụlọ akwụkwọ Swidin, kwuputara n'ihu ọha na ihe omume redio na Sveriges Redio dị na Swidin, mgbe o siere kọmitii ahụ ike inweta Bob Dilan gbasara mmeri na ihe nrite Nobel na mpaghara Akwụkwọ agụmagụ nke afọ 2016 o nwetara, na ha ahapụlarị mbọ ha na-agba inweta ya.
Danius si, "Ugbu a anyị anaghị eme ihe ọbụla. Akpọọlam oku ma zijere onye ya na ya kacha arụkọ ozi ịntaneetị ma nwetekwa ụsa nnabata. Ugbua nke ahụ zuru oke."
Na mbu,onye isi Ring, Jamie Siminoff, kwuru na ulo oru ya bidoro mgbe onughi mgbirigba ya n’ulo ahia ya di na ime ebe o na adoba ugboala ya.
O kwuru na ọ rụrụ mgbịrịgba ụzọ ji WiFi arụ ọrụ.
Siminoff sị na orire ahịa gbaliri elu ka ogosichara n'ihe nkiri Shak Tank n'afọ 2013 ebe ndị ndozi ihe ngosi jụrụ itinye ego na mbido.
Na ngwụcha 2017, e gosiri Siminoff na chanel igbe onyonyo QVC.
Ring dozikwara otu ikpe ha na ụlọ ọrụ ọzọ na-ahụ maka nchekwa, ADT Corporation nwere.
Ọ bụ eziokwu na otu ọgwụ mgbochi aka na-ele anya egosila na o nwere ike ịbelata oke ndị mmadụ ji anwụ n'ihi ọrịa Ebola, mana ruo ugbu a, enwebeghi ọgwụ ọbụla gosiri hooha na o nwere ike ịgwọ onye bu ọrịa a.
Otu antibọdi, ZMapp, gosiburu olileanya, mana ka elebakwuru ya anya, achọpụtara na ọbaghị uru na-igbochi ọnwụ ka esiri chee.
Na nnwale PALM, eji ZMapp mere ihe nruba ama, nke a putara na ndi sayentist jiri ya mee baseline tunyere ogwugwo ato ozo.
USA Jimnastiks kwadoro ozi Olimpik Kọmitii Amerịka dere ma kwere kwa na oge eruola mgbe onye ọbụla na-eme Olimpiks aghaghị ịrụkọ ọrụ ọnụ ịhụ na ndị egwuregwu anyị niile nọ na nchekwa.
Anyi kwere na ihe USOC dere na odimma ndi egwuregwu anyi na klob ha nakwa egwuregwu ga enweta uru n’ihu karia ma o buru na enwe mgbanwe n’ulo oru anyi kama inapu ndi mmadu asambodo ha.
Mpaghara jimnasktik nke obodo USA kwadoro nlebara anya nke onwe nke nwere ike igosi ka mmegbu nke ndị lanarịrị ihe mberede Larị Nassar kọwapụtara nwere ike ịbụ ihe metere aka a na-amaghị maka ya na anabatakwa mgbanwe ndị kwesịrị ekwesị.
Egwuregwu Jimnastik nke mba USA na ndi USOC nwere otu ebumnobi - ime egwuregwu jimnastik, na ndi ozo, enweghi iyi-egwu dika ike kwere nye ogwu egwu isoro nro ha n’uzo n’enweghi iyi-egwu, ziri-ezi na gburu-gburu akwadoro akwado.
Na 1960 ga, Brzezinski rụụrụ John F. Kennedy ọrụ dị ka onye ndụmọdụ ya ma mechaa rụọkwa otu ihe ahụ n'oge ọchịchị Lyndon B. Johnson.
N’ime nghọpụta nke 1976, ọ dụrụ Carter ndụmọdụ gbasara iwu ndị mba ofesi, wee rụzie ọrụ dịka Onye ndụmọdụ Nchekwa Mba (NSA) site na 1977 ruo 1981, na nnọchi Henry Kissinger.
Dịka NSA, o nyere Carter aka n’ijikwa ihe omume mbaụwa n’ụzọ kwesiri ekwesi, dị ka Nkwekọrịta Kampụ Devidi, 1978; ihazigharị mmekọrịta US–Chaịna n'afọ ndị dị na ngwụcha agbata afọ 1970 na 1980; Mgbanwe ọchịchị Iran, nke butere nsogbu njigide Iran, 1979; mbuso agha nke Sọviet n’ime Afghanistan, 1979.
Aghoputara ihe nkiri ahu Ryan Gosling na Emma Stone no n’ime ya maka nturu ugo di iche iche.
E deturu aha Gosling na Stone n'otu ndị nwere ịnweta akara nturu ugo Best Aktọ na Best Aktres, n'otu n'otu.
Nhọrọ ndị ọzọ gụnyere Foto Kacha, Onye nhazi, Ọrụ nkiri fiim, Nhazi Kọstuum, Ọrụrụ fiim, Exigbo Egwu fiim Mbu, Nhazi mmeputa, Ọrụrụ Ụda, Mwụghari Ụda na Ezigbo Mmemme mbu.
Abụ abụọ sitere n’ihenkiri ahụ, Ọdishọn (Onye Iberibe Ahu Rọrọ Nrọ) na Obodo Kpakpandu gasị, nwetara aha maka abụ mbụ kacha mma. N’ihe nlere nke Lionsgate natara ntinye aka 26 — karia ihe ndi a.
Ka ụbọchị Sọnde nọ na ngwụcha, Onye isi ọchịchị obodo Yunaịted Steeti bụ Donald Trọmp, kwuru n'ozi e nyere site n'aka onye ode akwụkwọ ndị nta akụkọ, nke sịrị na ndị agha obodo US ga ahapụ Sirịa.
E kwuputara nke a mgbe Trump na Onyeisiala mba Tọkị bụ Rejep Tayyip Erdoghan nwechara mkparịtaụka n'ekwentị.
Mba Turkey ga-anarakwa ichebe ndị agha ISIS enwudere ndị, ozi ahụ kwuru, na mba ndị dị na Europe ajụla ịnabata ha ọzọ.
Nke a na-egosi na, opekata mpe, ụfọdụ daịnosọọ nwere abụba; ọtụtụ ndị mmadụ nwere echiche a taa, mana ihe ọzọ bụ na ọ na-egosi anyị ihe fosịl enweghị ike igosi, dịka agba na nhazi akụkụ-atọ.
Ndị ọka mmụta sayensị kwuru na abụba anụmanụ a nwere mgbe ọ na-acha aja aja n'elu ma na-acha ka karotenọịd n'okpuru.
Ihe nchọpụta ahụ nyekwara ntụziaka gbasara mmalite ipu nku n'ụmụ nnụnụ.
Maka na nku ajọ anụ daịnosọ enweghị akụ toro nke ọma, nke a na akpọ rachis, ma na o nwere ihe ndị ọzọ nke na-enwe - dịka barbs na barbules - ndị nchọpụta ihe kwuru na ọdịka rachis ọbụ ihe mechara si n'ihe ndị ọzọ a were toputa.
Nhazi nku ha gosiri na ha ejighi ya efe efe kama ha ji ya edokwa okpomọkụ maọbụ eme ihe ngosi. Ndị nchọpụta ihe tụrụ aro sị na, n'agbanyeghị na nke a bụ ọdụ daịnosọ na-eto eto, ihe ngosi ahụ gosiri nku anụ tochara etocha na-abụghị nku nwa anụ.
Ndị nchọpụta ihe tụrụ aro sị na, n'agbanyeghị na nke a bụ ọdụ daịnosọ na-eto eto, ihe ngosi ahụ gosiri nku anụ tochara etocha na-abụghị nku nwa anụ.
Otu bọmbụ gbawara n'isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii n’ime Gaziantep, Tọkii ụtụtụ ụnyaahụ na-egbu ndị uwe ojii abụọ ma merụọ ahụ ihe karịrị ndị mmadụ ọzọ iri abụọ.
Ụlọ ọrụ gọvanọ kwuru iri na itoolu na ndị merụrụ ahụ bụ ndị uwe ojii.
Ndị uwe ojii sị na ha na-enyo otu onye a na-ebo ebubo na ọ bụ onye agha nnupuisi Daesh (ISIL) dịka onye mere mwakpo ahụ.
Ha chọpụtara na Anyanwụ na-arụ ọrụ n’otu ụdị isi iwu dịka kpakpandu ndị ọzọ: A chọpụtara na omume kpakpandu niile nọ na sistemụ bụ onwunwu ọkụ na ntụgharị ha na-anya ha, ma ọ nweghị ihe ọzọ..
A na-ejikọta ọnụ ọnwụnwụ ọkụ na ntụgharị ya amata akara Rossby nke otu kpakpando, nke metụtara na ọwụwụ plasma.
Ka akara Rossby na-adị obere karịa, ka arụmarụ na-adịkwu obere nke kpakpando n’ikwanye ugwu nye ụmụ ntụgharị nke ihendọta.
Na njem ya, Iwasaki banyere na nsogbu ọtụtụ mgbe.
Ndị ohi ụgbọ mmiri zuri ya ohi, nkịta ara lụsoro ya ọgụ, o siri na-alụm di na nwunye gbalaga na Nepal a tụọ ya nga na India.
Oke 802.11n na arụ ọrụ ma na frikwensi nke 2.4Ghz na nke 5.0Ghz.
Nke a ga-enye ya ohere ka dịrị na ndakọta nlaghachi azụ na 802.11a, 802.11b na 802.11g, ma ọ bụrụhaala na isi ebe ahụ ụgbọigwe na-anọ nwere redìò abụọ.
Na 802.11n, ọsịsọ ya ji nnukwu ihe kara nke ndị bu ya ụzọ; ya mere, ọrụ ọ na-arụpụta ga-eru 600Mbit/s.
Duval, bụ onye lụgoro nwanyị ma mụta ụmụ abụọ bụgoro okenye, a hapụghịrị Mila onyere akọọrọ akụkọ nnukwu ihe nlere anya.
Mgbe a sị ya kwuo okwu gbasara ihe mere, Mila kwuru, "Mike na-ekwu ọtụtụ okwu mgbe a na-eme ọnụnụ ahụ...anọ m na-akwado ya mere na anụghị m ihe ọ na-ekwu."
Anyị ga-agba mbọ belata ikuku kabon dioxide kwa nke Mkpokọta ihe nrụpụta obodo site na oke 2020 site n'ọkwa 2005, Hu kwuru.
O kwughi oke a ga-akwụ, kama ọ sị na a ga-ele anya na nrụpụta akụ na ụba China wee kwụọ ụgwọ.
Hu gbara obodo ndị na emepe emepe ume "ka ha ghara itinye aka n'usoro omume mgbe ochie bụ ibu ụzọ metọọ were kpochawa ma emechaa."
O tinyekwara na "ha ekwela ka adị ha buru ibu karịrị ogugo uto na ike ha."
Òtù Mmụta Irak ahụ gosipụtara nchọpụta ya na 12.00 GMT taa.
Ọ dọrọ aka na ntị sị na onweghị onye ga-ekwe nkwa na usoro ọbụla e jiri mee ihe na mba Aịrak ugbu a ga-akwụsị agha otu, ntolite ihe ike, maọbụ ndabanye n'ọgbaghara.
Di Rịpọt bidoro site n'ịkpọ oku ka onye ọbụla nwee mkpakọrịta ụka ma nwee nkwekọrịta n'Amerịka gbasara etu aga na-esi akpaso ndị Etiti Ọwụwa Anyanwụ agwa.
Ọ fọrọ obere ka mkpesa ahụ kwuo okwu ofụma gbasara akụkụ nile nke iwu ndị isi n'ebe mba Aịrak nọ ma ọ na-akwado mgbanwe ụzọ ozigbo ozigbo.
Nke izizi n'ime nkwado iri asaa na asatọ ya bụ na a ga-eso usoro ọchịchị ọhụrụ tupu ọgwụgwụ afọ ị hụ na echebere oke ala Aịrak megide ndị ọchọ okwu ma wughachikwa mmekọrịta ọchịchị ha na agbataobi ha.
Onye omeiwu nakwa nwunye onyeisiala mba Argentina bụ Cristina Fernandez de Kirchner mara ọkwa na mgbede ụnyahụ na La Plata, obodo nọpụrụ kilomita 50 (maịlụ 31)site na Buenos Aires na ọ ga-eso zọọ ọkwa onyeisiala mba Argentina.
Ọ bụ n'Ajentaịn Tiyeta ka Lọọlọ Kirchner kwuputara ebumnuche ya ịzọ maka ọkwa onye isi ala, otu ebe ahụ ọ ji bido kampen ya maka ọkwa Sịnetọ na 2005 dịka onye otu nke ndị mpaghara Buenos Aires zigara.
Ọ bụ esemokwu maka mmefu ego na nkwado na nrụgharị e mere mgbe Oke ikuku Katrina gasịrị kpatara arụmụka a; ụfọdụ ndị kweere na iji nwayọ emefụ ego steeti akọwaala mmefụ a n'ụzọ ntọrọmọchị dịka "Nkwekọrịta Niu Ọlịns nke Bush mere".
Nnyocha nke mgbalị nrụgharị chere ihu na-enye ndị e chere na ha bụ ndị si Wọshịntịn ọrụ nrụgharị.
Ihe karịrị nde mmadụ anọ gara Rom maka olili ahụ.
Ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ nọ ebe n'ahụ dị ukwuu nke na o kweghị mmadụ niile omume inwèta òhèrè n'olili ozu na St. Peter Square.
Etinyere ọtụtụ nnukwu igwe onyonyo n'ọtụtụ ebe na Rom, ka ndị mmadụ nwee ike kirie mmemme ahụ.
N'ọtụtụ obodo Itali ndị ọzọ ma na uwa nile, ọkachasị na Poland, emere nkwazi dị ka ibe ya, nke ọtụtụ mmadụ hụrụ.
Ndị akụkọala akọtọla ụmụ iwuikikere FBI ndị gara aga maka ịgbado anya akụrụngwa n’ụmụ okwu ndị dị mfe ikpezi, tụmadị ụmụ okwu ụgbọ ala ezuru ezuru, n’iji ebumnobi nke ịkwalite nsìàga ọganihu ha.
Nzukọ omeiwu bidoro ikwado nnyocha ihe ndị dị aṅaa na fiskal n'afọ 2005 ma kwukwaa kpọmkwem na ngalaba FBI ga ewepụtarịrị ndị ozi iri maka ihe ngosi na-akpali agụụ mmekọrịta nwoke na nwanyị.
Robin Uthappa nwetara akara kachasị na innings, ọsọ 70 n’ime naanị ụmụ bọọlụ 41 site n’ịkụ anọ ugboro 11 na isii ugboro 2.
Ndị na-eji batị akụ n'usoro etiti, Sachin Tendulkar na Rahul Dravid rụrụ ọrụ nke ọma ma mee otu nrụkọọrụ nke ọsọ-otu narị.
Mana, mgbe ha dara wicket India naanị mere 36 gbara ọ tọpụ wicket 7 iji kwụsị innings.
U.S. Onye isi oche Jiọj W. Bush batata Singapọ n'ụtụtụ ụbọchị nke iri na isii nke ọnwa Nọvemba, iji malite njem njegharị mba Eshia nke ga-anọzu otu izuụka.
Onye na-esote onye isi iche mba Sịngapọ bụ Wong Kan Seng nabatara ya ma ya na onye isi oche mba Sịngapọ bụ Lee Hsien Loong kparịtara ụka gbasara ahịa na ihe iyi ọha egwu.
Mgbe otu izu gasịrị ebe ọ dara ada na ntuliaka ọkara oge, Bush gwara ndị na-ege ya ntị maka mmụba nke azụmahịa n'Eshia.
Onye isi oche Stivin Hapa ekwetala iziga iwu ọhụrụ nke ikuku ọcha nke gọọmenti ebe a ga elebara ya anya, tupu nleba anya nke abụọ, ma emechaa nzukọ ga-ewe ya na onye isi NDP bụ Jak Leeton nkeji iri abụọ na ise n'ụbọchị Tuzde na PMO.
Layton arịọla maka mgbanwe nye akwụkwọ iwu gburugburu ebe obibi nke ndị otu ọdịkaọgadị mgbe ya na PM nwere nnọkọ, na-arịọ maka "ndezigharị zuru oke nke zuru ezu" nke iwu gburugburu ebe obibi nke ndị otu ọdịkaọgadị
Kemgbe gọọmenti weere ọnọdụ ịkwụ ụgwọ ụlọ ọgwụ Mersey na Devọnpọt, Tasmania, gọọmenti steeti na ụfọdụ ndị ome iwu gọọmenti etiti ekwuola okwu megide omume a sị na ọ bụ mere mere n'ihu maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị gọọmenti etiti na-abịa na Nọvemba.
Mana Prime Minista John Howard ekwuola na ihe a mere bụ naanị ka ichebe ụmụ akụrụngwa nke ụlọ ọgwụ ahụ site n'aka mwedàta siri n'aka gọọmentị Tasmania, n'inye mmezi nke nde AUD$45.
Dika obere akwụkwọ akụkọ kachasị ohuru si kwuo, ogugu oke osimiri gosiri na oke ikuku malitere. O doro anya na enwere oru oke ikuku na mpaghara Pago Pago na Niue.
O nweghị nnukwu mmebi ma ọ bụ mmerụ ahụ akọrọna n’ime Tonga, mana e were ọkụ nwa oge, nke a kọrọ gbochiri ndị ọchịchị Tongan ịnata ịdọ aka na ntị maka ajọ ebili mmiri PTWC ahụ nyere.
Ụlọ akwụkwọ iri na anọ na Hawaii ndị nọ na ma ọ bụ na nso akụkụ mmiri bụ ndị e mechiri na Wenezdee niile na-agbanyeghị ndọ aka na ntị niile ewepụrụ.
Onyeisiala mba Amerịka bụ George W. Bush nabatara ọkwa ahụ.
Gọdọn Jọndro onye na-ekwuchitere Bush okwu kpọrọ nkwa Nọt Koria bụ "nzọụkwụ dị oke mkpa na ịnweta mwepụ were anya nke ngwa agha nuklia ndị Koria."
Oke ifufe nke iri abụrụ aha nke oge oke ifufe Atlantik, Oke ifufe akpọrọ Jeri, gbakọrọ n'oke osimiri atlantik taa.
Ụlọọrụ Etiti na-ahụ maka Ajọ ifufe (NHC) kwuru sị n’oge a Jeri abụghị ihe iyi egwu nye ala.
Ụlọ Ọrụ nke Ndị injinia nke U.S. mere atụmatụ na mmiri mmiri dị inchi isii nwere ike ịgabiga ihe mgbochi ide mmiri e mebibiri na mbụ.
Ward Itoolu, nke hụrụ oke ide mmiri ruru ihe dị ka feet iri abụọ n'oge Ajọ Ifufe Katrina, nọ na nnukwu mmiri na eru ukwu ma gafere akwa levee nọ nso.
Mmiri n’aghafu n’otu akuku levee obodobo ya di 100feet.
Onye nchikwa commons Adam Cuerden gosiputara iwe ya n’elu ihe eghichapuru mgbe ogwara Wikinews okwu n’onwa gara gara.
O (Wales) n’ezie turu anyi asi site na mbido. Mbu, site na ikpa-agwa ka ihe a bu okwu iwu, Nke abuo, site na igho-aghugho na ona ege anyi nti, ruori mgbe ehichapuru nka ya.
Mkpadu iwe obodo butere maka mgbali ide iwu gbasara ihe ngosi mmekọahụ na webụsaịtị na-egosi ọtụtụ ihe.
Ọrụ arụrụ bụkarịrị nke iwu a ka na enyocha enyocha, mana edere usoro omume ihe ahụ ka o gosipụta ihe ahụtara ụyọkọ kpakpando Sajiterius.
Mmetụta otu ahụ nọ na-achọ ga-esite n'aka ikikere taịdị ndị dị n'etiti mata ojii nke galaxy na mata ojii nke Milky Way.
Dị ka ọnwa na etinye ndọta n’ụwa, na-akpata elili mmiri, etu ahụ ka Milky Way ahụ si etinye ike na galazi Sagittarius ahụ.
Ndị ọka mmụta sayensị nwere ike kwubie na dak mata na emetụta dak mata ibe ya otu mata si eme.
Tiori a na-ekwu na imirikiti mata dị oji gburugburu otu ụyọkọ kpakpando dị na gburugburu otu ụyọkọ kpakpando n'otu ụdị halo, ma e mejupụtara ya site n'ọtụtụ urughuru dị obere.
Ụmụ akụkọ si telivishọn na-egosi anwụrụ ọcha si n'igwe nrụpụta ahụ apụta.
Ndị isi obodo na-adọ ndị bi n'obodo gburugburu igwe ọrụ ahụ aka na ntị ka ha nọrọ n'ime ụlọ, gbanyụọ ntụ oyi ma ghara iṅu mmiri na-agba n'ụlọ.
Na ndabere nke ụlọ ọrụ nuklia Japan, a chọpụtawo n'ụlọ mmepụta cesium na ayodiin dị redioaktivu.
Ndị isi chere na nke a na-egosi na o nwere ike gbọmgbọm ndị ji mmanụ ụgbọ yurenium agbawaala ma na-ehi ehi.
Dr. Toni Moll chọpụtara nje Tubakụlọsis (XDR-TB) nke na-emegide ọgwụ na ngalaba Sawụt Afrịka nke KwaZulu-Natal.
N'otu ajụjụ ọnụ, ọ sị na bke ọhụrụ a na enye "oke nsogbu ma bụrụkwa ihe egwu n'ihi ogugo ọnwụ dị elu si na ya abịa."
Ụfọdụ ndị ọrịa enweela ike ibute ọrịa ahụ n'ụlọ ọgwụ, Dr. Moll cheere, ma ihe dị ka abụọ bụ ndị ọrụ ụlọ ọgwụ.
Na otu afo n’abia abia, onye butara nje nwere ibunye ya mmadu 10 ruo 15 n’eru ya nso.
Agbanyeghị, pacentị nke XDR-TB nọ n’ime òtù niile nke ndị nwere ụkwara nta ka yiri ka ọ dị obere; 6,000 nke mpokọta ndị mmadụ 330,000 nwetere ọrịa ahụ n’oge ọ bụla n’ime South Afrịka.
Satịlaịtị ndị ahụ, abụọ nke na-anyị arụ karịa nke gafere paụnd 1,000, ma na-ekwo ọsọ n’ọdịka maịlị kwa awa 17,500, sukọrọ ọnụ maịlị 491 n’elu Eluụwa.
Ndị ọka mmụta sayensị sị na mgbasa nkụkọta isi ahụ butere dị ukwu.
Ha ka na anwale ịchọpụta etu ibu mkpọka ahụ dị ma etu ọ ga-esi emetụta Uwa.
United States Strategic Command nke ụlọ ọrụ Ngalaba Nchebe U.S. na-esochi irighiri ihe ahụ.
A ga-ezìga ozī nyocha nke nkata akpara n'otu weebụsaịtị ọha.
Otu dibia-bekee onye rubuuru oru ulo-ogwu umuaka nke pittsburgh, Pennysylvania ka aga ekpe ikpe banyere igbu-mmadu nke akpasuru-iwe ka ahuchara nne ya na azu ugbo-ala na-onwu n’ubochi Wednesde, ka ndi isi no na Ohio kwuru.
Ahuru Dr. Malar Balasubramanian, 29, na Blue Ash, Ohio otu sobob di nso 15 miles n’ebe ugwu Cincinnati ka o dine n’ala n’akuku okporouzo naani ihe oyi bu tshirt na uwe ime, otu osi noro gosiri na ono n’okpuru ike ogwu.
Ọ dụrụ ndị ọrụ nche gaa na Oldsmobile Intrigue ojii ya nke nọ n’ụzọukwu narị ise n’itoanya.
Achọtara ozu Saroja Balasubramanian, onye dị afọ iri ise na atọ, ebe ahụ, ja akwa mkpuchi kpudoro ya.
Ndị uwe ojii kwuru na ahụ ahụ dị ka ọ nọọla ebe ahụ ruo ihe dị ka otu ụbọchị.
Okwu mbu ndị ahụ nke ọrịa ahụ n'oge a bụ ka a kọrọ n'ime ebe ọgwụgwụ May.
Ezi na ebu ọrịa ahụ, nke anwụnta na ebunyezi ndị mmadụ.
Ihe ndaputa a emela ka goomenti mba India bido mebe ihe dika izipu ndi na ejide ezi na mpaghara ometuru hinne, ikesa akwa mgbochi anwu nta makwa igba ogwu na-egbu pesti.
Ọgwụ mgbochi ensefalitis dị nde kwuru nde ka gọọmenti kwere na nkwa, nke ga-akwado ndị ọrụ ahụike maka afọ na-abịa abịa.
E gburu oge ịnye ndị ọrịa kacha metụta n'afọ a ọgwụ mgbochi maka ego adịghị nakwa enwere ọrịa ndị ọzọ ka ya mkpa igbochi.
N'afọ 1956 Słania gara Swiden, ebe afọ atọ gasịrị o bidoro ịrụ ọrụ na ụlọ ọrụ nzipu ozi nke Swiden ma bụrụkwa onye isi mbinye.
O mepụtaara stampụ karịrị 1,000 maka Swidin na mba 28 ndị ọzọ.
Oru ya bunke amaara nke oma na iti igba ma doo kwa anya nke oma na obu otu nime ndi amaara n’ezinulo nile na ndi philatelist. Ufodu lekwasiri anya nnoo na ichikota oru ya nani.
Stampụ ya nke otu puku bụ “Nnukwu Omume nke Ndị Eze Sweden” ahụ dị ebube nke David Klöcker Ehrenstrahl dere na 2000, nke edepụtara na Akwụkwọ Guiness nke Ndekọ Ụwa.
O sokwa na aru ego akwukwo mba di iche iche, otu oru oruru ohuru bu foto Onye isi goomenti Canada etinyeru n’ihu ego ohuru $5 na $100 ndi Canada.
Mgbe ihe mberde ahụ mechara, e buru Gibson gawa n’ụlọ ọgwụ mana ọ nwụrụ mgbe obere oge gachara.
Ọkwọ ụgbọ gwongworo ahụ, nke gbara afọ 64, emerụghị ahụ na mkpọka ahụ.
N'otu ụbọchị ahụ, ebe elekere nke iri na abụọwepụrụ ụgbọ ahụ n'ebe ihe mbere mere.
Otu onye na-arụ ọrụ ebe a na-adọba ụgbọala nọ n’akụkụ ebe ihe mberede ahụ mere kwuru si: "E nwere ụmụaka nọ na-eche ịgafe okporo ụzọ ahụ nakwa ha nille nọ na-eti mkpu ma na-ebe akwa."
Ha niile gbaghachitere azụ site na ebe ihe mberede okporo ụzọ ahụ mere.
Ihe ndi ozo akpara na Bali bu izoputa ohia ndi ozo di n’uwa na ikee nka n’uzu nwere ike inyere ndi mba n’ebilite aka itoo n’uzo ga-akwusi mmeto ikuku.
Ndi U.N. nwekwara olileanya iwepụta ego iji nyere mba niile aka ndị global wọmịn metụtara iji nagide nsogbu o butere.
Enwere ike iji ego agụ rụọ ụlọ ndị mmiri anaghi ebu, njikwa dọtị ka mma, na ọkụkụ ihe dị iche iche.
Fluke dere na mbo ufodu gbara ihu na emechiri onu umunwanyi iji kwusi ha ikwuputa okwu maka ihe gbasara ahuike umu nwanyi agaghi nkeoma.
O ruru na mkpebi a n'ihi ọtụtụ okwu nkwado o nwetara n'aka ụmụnwoke ma ụmụnwaanyị ndị sị ya na ọgwụ mgbochi afọ ime bụ ihe kwesịrị ekwesị.
Oge ya bụ ọgụ gwụchara mgbe e wegara ndị merụrụ ahụ n'ụlọ ọgwụ, ihe dị ka ndị mkpọrọ 40 fọrọ afọ nọọrọ na mpụga, jụ ịlaghachi n'ime ụlọ mkpọrọ ha.
Ndị mkparịta ụka nwara ịweta udo, mana ihe ndị mkpọrọ chọrọ edoghi anya.
N'etiti 10:00 na 11:00 MDT n'abalị, ndị mkpọrọ nọ na mpụta mụnyere ọkụ.
N'oge na-adịghị anya, ndị ọrụ uwe ojii ejikere na gịa ogbaaghara batara n'ime yad ahụ ma jiri gaasị anya mmiri wee gbakọta ndị mkpọrọ n’otu ebe.
Ndị otu mgbanyụ ọkụ mechara gbanyụọ ọkụ ahụ ebe 11:35 nke abalị.
Mgbe aruchara akwa-mmiri ahu na afo 1963, ewee kwusi udu idemiri ahu nke na agbasa unyi na ahu mmiri ahu nile.
Sedimenti a dị mkpa maka ịmepụta ụmụ mgbochi ejiri aja mee ma akụkụ osimiri, nke jere ozi dị ka ebe obibi anụ ọhịa.
N’ihi nke ahụ, ụdị azụ abụọ ekpochapụla, ma abụọ ndị ọzọ abụrụla ndị nọ n’ihe ize ndụ, gụnyere humpback chub.
Agbanyeghi na larịị mmiri ahụ ga-eto elu ụkwụ ole na ole naanị mgbe idei mmiri ahụ gasịrị, ndị isi na-enwe olile anya na ọ ga-ezu iji weghachi ụmụ ugwu aja nke mmiri riri na ndịda ụzọ mmiri.
E nwebeghị ịdọ aka na ntị nke ajọ ebili mmiri enyegoro, ma na-ndabere na ụlọ ọrụ jiofiziz Jakarta ahụ, a gaghị adọ aka na ntị nke ajọ ebili mmiri n’ihi na ala ọma jijiji ahụ eruteghị iheachọrọ nke ịdị ukwuu 6.5.
Agbanyeghị na enweghị ihe n'egosi na a ga-enwe sunami, ndi bi ebe ahụ bidoro tụwa egwu, jiri ọsọ na-ahapụsị ụlọ na ahịa ha.
N'agbanyeghi na Winfrey bu anya mmiri n'okwu ije ọma ya, o mere ka ndị ihe ya na-amasị mata nke ọma na ọ ga-alọghachi.
“Nke a abụghị ịsị ka e mesịa. Nke a bụ imechi otu isi na imeghe nke ọhụrụ.”
Akara nchịkọta ndọrọndọrọ ọchịchị obodo egosila na ahọrọgharịrị onye isi obodo nọ n'ọchịchị bụ Hifikepunye Pohamba.
Otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-achị ugbu a, Sawụt West Afrịka Pịpụls Ọganaịzeshọn (SWAPO), jidekwara ọnọdụ ha dịka otu kacha n'ọnụ ọgụgụ na ntuli aka ndị omeiwu.
Ndị mmekọta na ndị agha Afghan banyere n’ime ebe ahụ ichekwa saịtị ahụ ma ezitela ụgbọ elu ndị mmekọta inyere aka.
Mkpọkasị ahụ mere n'elu ugwu, e kwenyekwara na ọ bụ ya kpatara ajọ ọkụ.
Mgbalị ị na-achọ saịtị okuku ahụ na-emebi ihu igwe site na ihu igwe dị njọ na ala siri ike.
Ụlọ ọrụ enyemaka ahụike Mangola, 'Medecines Sans Frontieres', na Wọld Helt Ọganaịzeshọn na-ekwụ na ọ bụ ntiwapụ ọrịa kachasị njọ ahụrụla na mba ahụ.
Onye nkwuchite maka Medecines Sans Frontiere Richard Veerman kwuru: "Angola na-agaru maka ntiwapụ ya kacha njọ mgbe ọ bụla ma ọnọdụ ahụ ka dịkwa njọ n’ime Angola,” o kwuru.
Egwuregwu ji ihu igwe dị mma bido ebe elekere iri nke ụtụtụ, ewepụ igirigi yọrọ n'ụtụtụ nke gbachara ọsịsọ, ọ bụ ụbọchị zuru oke nye 7's rugbi.
Ndi kachasị elu na asọmpi bu South Africa bidoro na akara nke oma mgbe ha nwere mmeri ntụsara ahụ nke 26 - 00 megide Zambia gbara mkpụrụ nke 5.
N'agbanyeghị na ọ dị ka ndị na emegide ha bụ ndị ndịda ka ha mma, ndị mba Sawụt Afrịka melitere nwayọ nwayọ ka ịsọ mpi gara n'ihu.
Ụzọ mkpachapụ anya ha n’ime mgbochi, ka ha si ejide bọọlụ ma ụzọ nhàzi pụrụ iche mere ha ka ha pụọ iche ma o doro ha anya n’òtù a bụ òtù ha ga-emeri.
Ndị ọrụ maka obodo nke Amstardam na Ebe ngosi ihe ndị mgbe ochie Anne Frank na-ekwu na osisi ahụ ebutela ọrịa n’iji ero ma dịkwa njọ makka ahụike ọha dịka ha na-agbagha na ọ nọbụrụ n’ezigbo ihe ize ndụ nke ịdapụga n’ofe.
Akara ya maka mgbututu n'ụbọchị Tuzde, mana azọpụtara ya ka ụlọ ikpe kpegharịrị ikpe na mberede.
Ụzọ niile dị n'ọgba ahụ a kpọrọ “Ụmụnne nwanyị asaa” dị ihe dịka opekatampe 100 mita ruo mita 250 (fiiti 328 ruo 820) na dayamita.
Ụmụ onyinyo infràreèd na-egosipụta na mgbanwe okpomọkụ ahụ sitere n'ụbọchị na abalị na-egosi na ha nwere ike ịbụ ọgba.
Ha na-adị oyi karịa gburugburu ha n'ehihie ma dị ọkụ karịa n'abalị.
Omume okpomọkụ ha anaghị adịgide ka nnukwu ọgba dị n'ụwa nke na-enwe okpomọkụ na-anaghị agbanwe, mana ọ dị ka ndị a maka na ha bụkwa olulu miri emi n'ime ala," Glen Cushing kwuru, onye United States Geology Survey (USGS) Otu Astrojiọlọji na nke Mahadum Northern Arizona dị na Flagstaff, Arizona.
Na mba Frans, ịtụ ụtụ bụ ihe anaghị eji ike eme: ndị na-atụ ụtụ na ewezuga onwe ha n'otu ụlọ ndo, tinye akwụkwọ ebiri na ndịnihu nke na-egosi onye ha na atụrụ ụtụ n'ime akwụkwọ amachiri amachi.
Ka ndị nchịkọta nyochachara onye na-atụ ụtụ, onye na-atụ ụtụ etinye akwụkwọ ụtụ ya amachiri amachi n'ime igbe nnakọ ụtụ ma bie aka n'akwụkwọ ndị tụrụ ụtụ.
Iwu gbasara ntuliaka na Frans depụtara usoro ikpe kpọmkwem.
Kemgbe 1988, ụmụ igbe ntuli aka ga-abụrịrị ngafe-ahụ-ụzọ ka ndị ntụli aka na ndị nnyota ga-agba akaebe na o nweghị envelopu nọ na ya mgbe a na-ebido ntuli aka nakwa o nweghị envelopu etinyere ewezụga nke ndị agụgwere ọnụ ma nye ikikere nke ọma.
Ndị a na atụrụ ụtụ nwere ike iziga ndị nnọchiteanya ka ha gbaa ama ihe nile mere. Na mgbede, ndị ọrụ efu ga agụkọ ụtụ nile na oke nlegideanya , ma site n'usoro atọrọ atọ.
ASUS Eee PC, ewepụtara ụwa niile na mbụ maka ụmụ ihe nchekwa-ego na arụmọrụ ya, wụrụ isiokwu na-ewu ewu n’Ọnwa IT Taipei 2007.
Mana ogugo ahịa kọmpụta laptop ga-agbanwe ma dị iche ri nne ka ASUS nwetachara Nturu ugo Taịwan Sọstenebụl Awọdụ n'afọ 2007 site n'aka Ezekutiv Yuan si na Repọblik Chaịna.
Webụsaịtị steshọn a kpọrọ ihe ngosi a "ihe ngosi redio ndị mgbe ochie nke osote ya ọhụrụ gbasara ịgba ara akwụkwọ ma dị egwu!"
N’oge mbu ya, ihe ngosi a ka egosiputara n’igwe saịtị intaneti na-agba ọsọ nke TogiNet Radio, ebe a lekwasịrị anya na redio na-ekwu okwu.
N'ọgwụgwụ afọ 2015, TogiNet bidoro AstroNet Redio dị ka mpaghara nọ n'okpuru ya.
Na mbụ, ihe nkiri ahụ gosipụtara ndị omee olu ka bidoro ebido, ndị si n'ọwụwa anyanwụ Tegzas.
A sị na ozuzu ohi gara n'ihu ogologo abalị niile, n'ihi na ndị ọrụ mmanye iwu anọghị n'okporo ama Bishkek.
Otu onye nkere anya kọwapụtara Bishkek dịka ihe na-emikpu n'ọnọdụ "ọgba aghara", ka ndị mmadụ na akpagharị na eburughara ngwa ahịa n'ike.
Otutu ndi bi na Bishkek tara ndi na-eme ngaghari iwe si na odida anyanwu uta gbasara imebi iwu
Mba Sawụtụ Afrịka emeriela Ọl Bụlaksị (Nuu Ziilandị) n'egwuregwu rọgụbi nke Mbanaatọ n'ama egwuregwu Royal Bafokeng nke dị na Rọstenbọgụ, Sawụtụ Afrịka.
N'ikpeazụ, otu ọkpụ ka ha jiri merie ha, ha sara ọkpụ iri abụọ na otu ebe ndị mmegide ha sara ọkpụ iri abụọ. Nke a usoro mmeri iri na ise ndị Ọl Blaks na mmechi.
Maka òtù Springboks ndị ahụ, ọ kwụsịrị na egwuregwu-ise nke ogologo usoro ọdịda.
Ọ bụ ịsọmpi ikpeazụ nke Ọl Blaks ndị merigoro ihe nnweta izu ụka abụọ gara aga.
A ga-agba egwuregwu ikpeazụ nke ogbe a n'Elis Pak na Johanesbọg n'izu na-abịa abịa, mgbe ndị Sprịngbọks ga-agba Ọstrelia.
Ala ọma jijiji dị larịị mara ọdịda anyanwụ Montana jijiji mgba ojiri nkeji asatọ gafee elekere nke iri n'abalị Monde.
Mpaghara mba Yunaịted Steeti na-ahụ maka mmegharị ala (USGS) na mpaghara nke na-ezite ozi gbasara ala ọma jijiji enwetabeghị mkpesa ihe mmebi.
Ala ọma jijiji ahụ nwere etiti ya na ihe dị ka km 20 (maịlị 15) ugwu-ebe ugwu ọwụwa anyanwụnke Dillon, na ihe dị ka km 65 (maịlị 40) ndịda nke Butte.
N'ụbọchị Mọnde, n'ala mpịtọ dị Lyon nso nke dị n'ọwụwa anyanwụ mba Frans, ka achọpụtara na ọrịa gburu otu ọbọgwụ bụ ụdịrị ọrịa nnụnụ nke nwere ike igbu mmadụ, bụ H5N1.
Frans bụ mba nke asaa n'ọgbakọ Iroopu ịta ahụhụ n'ihi ọrịa a; osotere Ọstrịa, Jemani, Slovenia, Bọlgeria, Gris na Itali.
Enwere orịa a ka na-enyo enyo ka ọ bụ H5N1na mba Kroeshia na Denmak.
Chambers gbara Chukwu akwụkwọ maka "ọnwụ zuru ebe niile, mmebi na iyi egwu eyiri nde ka nde mmadụ bi n’ụwa."
Chambers, onye na-ajụkarị oge niile, na-agbagha na ikpe ya "abaghị uru" ma "onye ọ bụla nwere ike ịkụ onye ọbụla ikpe."
Akụkọ egosipụtara na opera french, nke Camille Saint-Saens dere, bụ maka onye na-ese ihe "nke ịhụnanya o nwere maka Japan na ọgwụ ike na-achị ndụ ya."
N'ihi nke a ndị na-eme ihe ngosi na-ese igbo n'ebe ngosi ihe, ndị nwe ụlọ ngosi ihe na-akwadokwa ndị nlere anya ka ha sonye.
Onye na-ekwubu okwu n'ụlọ omeiwu bụ Newt Gingrich, onye isi obodo Tekzas bụ Rik Perị, na onye otu nzukọ omeiwu Mishel Bakmann mechara gba ndị anọ, ise na isii, n'usoro.
Ka akara omume pụtara, Gingrich kelere Santorum, mana ọ gwara Rọmni okwu ike, n'ihi ụdịrị mkpọsa ozi ọ kpọsara megide Gringrich na Ayowa.
Perry kwuru na ọ ga "agaghachị Tekzas ileba anya n'akara omume abalị a, ịchọpụta ma o nwere ọganihu n'ọsọ ahụ", ma na omechara kwuo na ọ ga anọgide n'ọsọ ma sọọ mpi izizi na Karolaina n'ụbọchị nke iri abụọ na otu nke ọnwa Jenụwarị.
Bakman, onye meriri Ntuliaka Ames Strọ n'Ọgọọst, kpebiri ịkwụsị kampen ya.
E bugara onye ahụ na-ese fòto na Ụlọ Ọgwụ Reagan UCLA, ebe o mechara nwụọ.
A kọbụrụ na ọ nọ n’ime ụmụ afọiri abụọ ya. N’otu nkwupụta, Bieber siri "Agbanyeghị na ọ nọghị ma ọ sonyeghị ozugbo ọdachi ihe mberede okporo ụzọ a, echiche na ekpere m nonyere ezinụlọ ndị onye a tara ahụhụ."
Webụsaịtị akụkọ ntụrụndụ TMZ ghọtara onye na-ese fòto ahụ kwụsịrị ụgbọala ya n'akụkụ nke ọzọ nke okporo ámá Sepulveda sara mbara nwere ụmụ osisi akwụwara n'akụkụ ya ma nwaa ị see fòto nkwụsị ndị uwe ojii tupu ya agafee okporo ụzọ wee gaa n'ihu, na-akpali onye uwe ojii Njeghari ilekota Nnukwu okporo ụzọ anya nke California na-eduzi okporo ụzọ iji nyeghachi ya iwu gafeghachị , ugboro abụọ.
Dị ka ndị uwe ojii kwuru, ọkwụ ụgbọ ala ahụ suru onye na-ese fòto eleghị anya ọ gaghị enwe ebubo mpụ ọ bụla.
Ya na naanị medaal iri na asatọ dị kwa otu ụbọchị, ọtụtụ mba adala imepụta ikpo okwu medaal ahụ.
Ha gụnyere mba Nedalands, ebe Anna Jochemsen gbara onye nke itoolu n'egwuregwu nkwụmọtọ ụmụ nwanyị nke asọmpi Super-G ụnyaahụ, na Fịnland ebe Katja Saarinen gbara onye nke iri n'otu egwuregwu ahụ.
Michel Gọrli gbachara Super-G nkwụmọtọ ụmụ nwoke dịka onye nke iri na otu. Oldrich Jelinek, onye Chek rịpọblik gbara onye nke iri na isii na Super-G ọnụnọ ala ụmụ nwoke.
Arly Velaskwez, onye Megziko, gbara onye nke iri na ise na Supa-G ịnọ ọdụ nke ụmụ nwoke. Adam Họl, onye Niu Ziland, gbara onye nke itoolu na Supa-G nkwụmọtọ ụmụ nwoke.
Onye Poland kpuri isi bụ Maciej Krezel na-egwu egwuregwu ski, na onye ndu ya Anna Ogarzynska mechara onye nke iri na atọ na asọm mpi Supa-G. Jong Seork Park onye South Korea mechara onye nke iri abụọ na ano na asọm mpi ụmụnwoke Super-G.
Ndị nchekwa udo UN, ndị lọtara n’ime Haịti mgbe ala ọma jijiji 2010 gachara, bụ ndị a na-ata ụta maka nkesa ọrịa ahụ nke malitere n’akụkụ kampụ ndị agha ahụ.
Na-ndabere n’ikpe ahụ, ehichaghị ọfụma mkpofu si na kampụ UN, nke na-akpata nje ịbanye nna nwaghara ụzọ nke osimiri Artibonite, otu n’ime nke Haịti kachasị ibu.
Tupu ndị agha abịarute, Haiti ezutebeghị nsogbu ndị metụtara ọrịa ahụ kemgbe oge ndị 1800.
Ụlọọrụ ikpe na ọchịchị onye kwuo uche ya na Haiti atụjela aka n'ọmụmụ sị na ndị agha udo UN nke Nepal bubatara ọrịa na Nepal n'amaghị ama.
Danielle Lantagne, otu onye ọkachamara UN n’ọrịa ahụ, kwuru na ntiwapụ ahụ bụ ndị na-eme ụdọ nwere ike ịkpata ya.
Hamilton kwetere na Ụlọ ọgwụ Mahadum Howard nabatara onye ọrịa ahụ n’ọnọdụ ahụ kwụsiri ike
Onye ọrịa ahụ agabuola na Naịjirịa, ebe a na-enwela ụfọdụ ndị bu nje Ebola ahụ.
Ụlọ ọgwụ ahụ esorola ìwuùsòrò maka njikwa ọrịa ofufe, gụnyere iwepụta iche onye ọrịa ahụ site na ndị ọzọ iji gbochie mbufe ndị ọzọ ọrịa nwere ike ime.
Tupu Simpsons Simon Ahụ arụọla ọrụ n’ọtụtụ ihe nkiri n’ọkwa dị iche iche.
N'afọ ndị 1980, ọ rụrụ ọrụ n'ihe ngosi dị ka Tagzi, Cheers, ya na ihe ngosi Tresi Ullman.
Na 1989 ọ nyere aka na mmepụta The Simpsons ya na Brooks na Groening, ọ bụ ya hụrụ maka ịwe ndị otu edemede mbụ nke ihe nkiri a.
N'agbanyeghi na ọ hapụrụ ihe ngosi a n'afọ 1993, ọ ka jidere ọkwa onye isi mmepụta ya, gaa n'ihu na-anara ọtụtụ nde dọla iri kwa sizin n'ụgwọ royalti.
Ụlọ ọrụ mgbasa ozi ndị Chaịna n’oge mbụ kọrọ maka ụgbọ elu a chọrọ izuru.
Ozi ndị ọzọ mechara bata kwuru na ụgbọ elu ahụ natara iyi ụjọ gbasara ogbunigwe ya mere o ji wee lọghachi Afganistan, lotuo na Kandahar.
Mkpesa mbụ kwuru na achụghachiri ụgbọelu ahụ azụ gawa Afghanistan mgbe anapụrụ ya ikikere ịfedà na mberede n’Ürümqi.
Ihe mberede ụgbọ elu, na-eme ọtụtụ mgbe na mba Aịran, nke nwere ụgbọ elu ndị agha na ndị nkịtị kara nka nke anaghị eleọkọta anya nke ọma.
Ntarama-ahuhu nke mba uwa putara na agaghi azutali ugbo-elu ohuru.
Na mbido izu a, helịkọpta ndị uwe ojii kpọkasịrị gbuo mmadụ atọ ma merụọ mmadụ atọ ọzọ ahụ.
N’ọnwa gara aga Iran hụrụ ihe ọdachi ikuku ya kachasị njọ n’ọtụtụ afọ mgbe otu ụgbọ elu na-aga Amenịa kpọkara, na-egbu ndị 168 nọ n’ime ya.
N'otu ọnwa ahụ ka ụgbọ elu ọzọ na Mashhad si n'ụzọ ya gbapụ sụnye isi na mgbidi, were gbuo mmadụ iri na asaa.
Erosmit akagbuola ihe ngosi ha fọdụrụ na njem ha.
Bandị rọk ahụ tozuru oke ịga njem nleta na United States na Kanada ruo Septemba 16.
Ha kagburu njem ngagharị ahụ mgbe onye isi ịgụ egwu Steven Tyler merụrụ ahụ mgbe ọ si n’ebedielu dapụ dị ka ọ na eme emume ngosi na Ọgọst 5.
Emeriri Murray na seti nke mbu na ndorondoro njirimara onye mmeri mgbe umu nwoke abuo jidere bolu ọ bụla n’ime setị.
Del Potro nwere uru dị oge na seetị nke abụọ, mana nke a kwa chọrọ ịchọpụta onye mmeri mgbe eruchara 6-6.
Potro natara nlekota na ubu ya n’oge a mana were ike laghachi azu n’egwuregwu ahu.
Ihe omume bidoro n’elekere 8:30 nke ụtụtụ. oge mpaghara (15.00 UTC).
Ndị ọgụ egwu ama ama n’obodo niile bụkuru bhajan, maọbụ abụ ofufe, nye ụkwụ Shri Shyam.
Onye ọgụ egwu Sanju Sharma bidoro na mgbede, Jai Shankar Choudhary were sote ya. Ọ gụkwara chhappan bhog bhajan. Onye ọgụ egwu Raju Khandelwal sonyekwara ya.
Lakkha Singh wee bido idu n'ịbụ abụ bajan gasị.
Efere 108 nke Chhappan Bhog (na okpukpe Hindu, ihe erimeri 56 dị iche iche, dị ka, swiiti, mkpụrụ osisi, akị, nri dị iche iche wdg. Nke e ji achụrụ chi aja) ka e ji wee nye Baba Sham onyinye.
Lakkha Singh gosirikwara chhappan bhog bhajan. Oguegwu, Raju Khandelwal nọ na-esonye ya.
Na nguputa isi okwu ubochi Tozdee maka Ihe ngosi Egwuregwu Tokyo, onye isi Nintendo Satoru Iwata kpughere controller design ulo oru ya maka njikwa ohuru Nintendo Revolution.
Ngwa Kọntrola, nke yiri rimotu onyonyo, na-eji ihe mmetụta abụọ dị n'akụkụ onyonyo achọpụta ọnọdụ ya n'oghere ọbụla nwere akụkụ atọ.
Nke a ga-ekwe ka ndị na-egwu egwuregwu jikwaa ihe omume na njegharị n'egwuregwu vidiyo site na imegharị ngwa ọrụ ahụ n'ikuku.
Giancarlo Fisichella ejikwalighi ụgbọ ala ya wee si n'ọsọ ahụ pụọ n'isi mmalite ya.
Onye otu ya Fenando Alonso nọ n'isi ọsọ ọtụtụ mgbe, mana nke ahụ kwụsịrị mgbe ọ kwụsịrị ụgbọala ya, o nwere ike ịbụ n'ihi ụkwụ ihu ụgbọala a na-etinyeghi nke ọma.
Michael Schumacher kwụsịrị ọsọ ya n’oge na-etoghị anya mgbe Alonso mesịrị, n’ihi mmebi sọspenshọn n’ime ọtụtụ agha n’ime oge ọsọ ahụ.
Dịka edemede nzukọ nta akụkọ ahụ kwuru, "ọ sị na ọ mara oke mma ma mara ka esi agụ egwu ọfụma".
Ọ metụtara m n'ala ala obi m mgbe ọbụla anyị mere mmegharị nkwado maka nke a.
K’oforo nkeji 3 ka ha fenyie, igwefoto no n’ime ugbo ahu gosirika otutu foam n’ekpuchi ihe kewapuru na tanki mmanu.
N’agbanyegghị, echeghị na ha kpatara mmebi ọ bụla n’ụgbọ njem ahụ.
Onye isi ihe mmemme shọtụl NASA bụ Wayne Hale Jr. kwuru na fom ahụ dara "mgbe oge anyị na-ele anya gasịrị."
Ka nkeji ise gachara e bidoro ihe ngosi a, ikuku ebido kuwe, ka nkeji ọzọ gachara, ikuku a na-eru ọsọ kilomita 70 kwa awa... mmiri ebido zowe, mana o ji iwe bịa, ụdịrị iwe na-eme ka ọ na-adụ gị adụ ka ntu, mkpụrụ mmiri ebido zowe, ndị mmadụ a na-agbagharị, na-atụ egwu, na-eti mkpu.
Nwanne m nwanyị na enyi ya nwụrụ, na dịka m na-aga n'ụzọ, enwere ndị mmadụ abụọ nwere nkwarụ, ndị mmadụ a na-arị ha elu, na-akwagharị ha," Amand Vesachi kwuru.
NHK kwukwara na ulo oru nuklia power plant nke Kashiwazaki Kariwa di na mpaghara Niigata n’aru oru ofuma.
Hokuriku Electrik Pawa Co. zitere ozi na ala ọma jijiji emebighi ihe n'igwe ọkụ nke izizi na nke abụọ n'ụlọ ọrụ ike nuklia dị na Shika nke emechiri emechi.
A kọrọ na ụfọdụ ebeobibi dị 9400 na mpaghara ahụ nọ na-enweghị mmiri ma ihe dị ka 100 na-enweghị ọkụ eletriki.
O mebiri ụfọdụ ụzọ, kwụsịtụ njem ụgbọ oloko n'ebe ndị o metụtara, ma ọdụ ụgbọelu Ishikawa ka mechiri emechi.
Otu ogbunigwe gbawara n'ezi ụlọ ọrụ onye isi ọchịchị.
Ogbunigwe atọ ọzọ gbara na nsonso ụlọ gọọmenti gasị n'ime awa abụọ.
Akụkọ ụfọdụ sịrị na mmadụ asatọ nwụrụ, ma akụkọ gọọmenti sị na ihe ruru mmadụ iri atọ merụrụ ahụ; ma na amatabeghị ọnụ ọgụgụ ikpeazụ.
A chọpụtara ma sayanọriki asidi ma melamini na mamịrị anụụlọ ndị nwụrụ ka ha richara nri anụụlọ merụrụ emerụ.
Ndị nchọpụta na mahadum sị na ihe ndị a na-emekorịta imepụta mkpụrụ nwere ike ịkwụsị ọrụ akụrụ.
Ndị nnyocha ahụ chọpụtara na ọ kpụrụ okwute mgbe e tinyere melamin na siyanurik asid n'ime amịrị buusu.
Ngwakọta nke kristal ndị a dị ka ndị a hụrụ n'amịrị ụmụ anụmanụ ụlọ ndị emetụtara, ma e jiri infrared spektroskopi (FTIR) lee ya.
Amaghị m ma Ị matara nke a ma ọ dịghị, mana ọtụtụ ngwaahịa si Sentral Amerịka batara n'obodo a n'akwụghị ụgwọ mbubata.
Ma a nara ụtụ isi pasentị iri asatọ na ngwaahịa anyị site na ụmụ tarifu na mba Keetiti Amerịka. anyị na-eleta gị anya.
Ọ dịghị m n'anya ka ihe kwesịrị ekwesị; ọ bụghị ezi ihe n'ezie.
Naanị ihe m na-agwa ndị mmadụ bụ na gị meso anyị etu anyị si emeso gị.
Gọvanọ California Arnold Schwarzenegger tiri iwu nke machibidoro iresi ụmụaka maọbụ ịgbazinye ha egwuregwu vidio ihe ike.
Iwu ahụ chọrọ ka egwuregwu vidio ime ihe ike ndị e rere na steeti California ka a mapanye mmewe na-agụpụta "18" na ha ma mere ka ntaramahụhụ maka orire ha nye nwata bụrụ $1000 kwa ịda iwu.
Onye nchịkwa Amamikpe n'ihu ọha, Kier Stama QC, kwuru okwu n'ụtụtụ a ikwusa amamikpe Huhne na Pryce.
Huhne agbaala arukwaghi ma onye ga anochi ya na otu ndi oso-eze achi bu Ed Davey MP. Norman Lamb MP ka ana atu-anya ka owere oru onye ozi azumahia Davey na apu-apu.
Ahazirioge Huhne na Pryce ibia n’ihu oka ikpe n’ulo ikpe nke Westiminster Magistrates Court ubochi onwa Februari ga di na 16.
Ndị nwụrụ na ya bụ Nicholas Alden, dị afọ 25, na Zachary Cuddeback, dị afọ 21. Cuddeback bụ ya nọ na-anya ụgbọ.
Edgar Veguilla merụrụ ahụ n'aka na n'agba ma Kristoffer Schneider bụ onye mmerụ ahụ ya ga-ewe ihe ọwụwa maka ihu ya.
Ngwa agha Uka dara dị ka ọ tụwara ya n’isi ony nke ise. Schneider nwere ụfụ ka na-afụ, anya ọkpụkpọ n’otu anya, akụkụ okpokoro isi furu efu na ihu arụgharịrị site na taịtenọm.
Schnaida ji ihe vidiyo si na ọnọdụ USAF kwupụta okwu.
N’ofe mmemme Wednesdee ahụ, Carpanedo zọrọ asọmpi n’ọsọ ụgbọala abụọ n’Asọmpi Iko ahụ.
Nke mbụ ya bụ Slalom ahụ, ebe o ritara otu Agbachaghị n'ọsọ mbụ ya. Mmadụ 36 n'ime 116 sọrọ mpi ahụ nwetara otu ihe ahụ n'ọsọ ahụ.
N'ọsọ ya nke ọzọ, Giant Slalom, ọ gbachara dị ka onye nke iri n'otu ụmụ nwanyị nọ ọdụ ebe oge ọsọ ya niile bụ nkeji 4: 41.30, nke ji nkeji 2: 11.60 nọrọ n'azụ onye nke mbụ Claudia Loesch onye Austria ma jiri nkeji 1: 09.02 nọrọ n'azụ Gyöngyi Dani onye Hungary gbara onye nke itoolu.
Skiers anọ nwanyị nọ n'otu ụmụ nwanyị dara ịgbacha ọsọ ha, na 45 n'ime skiers 117 nọ na Giant Slalom dara isonye na ndị gbatara ihe n'egwuregwu ahụ.
Ndị uwe ojii Madhya Pradesh weghachitela nkùnụkwụ na ekwentị kengagharị ndị e zuru n'ohi.
Onye na-esote Onye Isi Ndị Uweojii bụ D K Arya kwuru sị, "Anyị anwụchiela mmadụ ise ndị dinara n'ike nwanyị Swiss ahụ ma napụtakwa ekwentị na nkùnụkwụ ya".
Ndị eboro ebubo bụ Baba Kanjar, Bhutha Kanjar, Rampro Kanjar, Gaza Kanjar na Vishnu Kanjar.
Onye isi ndị uweojii Chandra Shekhar Solanki sị na ndị eboro ebubo kpuchiri ihu bịa n'ụlọ ikpe.
Obu eziokwu na mmadu ato no nime ulo ahu mgbe ugbo-ala ahu kuru ya, onweghi onye nime ha meruru ahu.
N'agbanyeghị nke a, onye ọkwọ ụgbọ merụrụ ezigbo ahụ n'isi.
E mechiri nwa oge okporo ụzọ ahụ ebe ihe mberede mere ebe ndị ọrụ mberede tọhapụrụ onye ọkwọ ụgbọ ala ahụ site na Audi TT na-acha uhie.
Ọ nọbu n'ụlọ ọgwụ Jems Pajet dị na Gret Yamawụt.
E mechara kwagarịa ya n’Ụlọ ọgwụ Addenbrooke na Kembriji.
Adekọya anọrọla n'Ụlọ ikpe Obodo Edịnbọg ebe eboro ya ebubo maka igbu nwa ya nwoke.
Atụrụ ya nga ma na-eche ikpe, mana akụkọ ọgba ama ọbụla nwere ike ịbụ nke rụrụ arụ n'ihi na ebipụtara onyonyo ya ọfụma.
Nke a bụ omume a na-ahụkarị ebe ndị ọzọ na UK mana íkpé íkpē Scottish na-arụ ọrụ n'ụzọ dị iche ma ụlọ ikpe eleela mbipụta nke fotò gasị dị ka ihe nwere ike ịbụ ajọ mbunobi.
Ọkachamara Pamela Ferguson nke Mahadum Dundee kwuru "ndị nta akụkọ dị ka ndị na-aga ije n'ebe dị oke egwu ma ọ bụrụ na ha ebipụta foto na ihe ndị ọzọ nke ndị a na-enyo enyo."
Ụlọ ọrụ Krawn, nke nọ n'isi amamikpe, agwala ndị nta akụkọ na ha agaghị ekwu okwu gbasara okwu akpụ n'ọnụ ozo ruo mgbe amara mmadụ ikpe.
Dọkumentị ahụ, na-ndabere na ohihiahụ, ga-arụnye aka na ụmụ mgbagha oke ala ndị ahụ, nke Palestaịnụ chọrọ na-ndabere n’ụmụ oke ala tupu Agha Mideast 1967 ahụ.
Isiokwu ndị ọzọ ekpuchiri gụnyere site n'ihe akọrọ ọdịnihu Jerusalem nke dị nsọ nye mba abụọ ahụ na okwu Ndagwurugwu Jọdan.
Israel na-achọ ka ndị agha nọrọ na ndagwụrụgwụ a ruo afọ iri ozigbo abanyere na nkwekọrịta, mana PA chọrọ ka ndị agha a nọrọ ruo naanị afọ ise.
Ndị nche legidere ndị ọgbaa anya nke ọma ka ha mere nnwale njikwa ọtapịapịa nke ntụkwasị, dịka e lebara anya na nnwale ahụ ma tụlee ma ọ dị ire.
N’ime otu mmekọrịta nke NPWS na Sporting Shooters Association of Australia (NSW) Inc, e were n’ọrụ ndị ọrụ afọ ofufo tozuru oke, n’okpuru mmemme ịchụ nta nke Sporting Shooters Association ahụ.
Dị ka Mik O'Flynn, Onye isi ọrụ na NPWS na-ahụ maka Ndokwa Ogige na Nketa, kwuru, ndị ọgba egbe anọ a họọrọ maka mmemme ọgbụgba nke mbụ bụ ndị akuzigorola nchekwa ma nye ha ọzụzụ.
Martelly n̄ụrụ iyi n’ime otu Kansụl Ntuli aka Kenwa oge (CEP) ọhụrụ nke ndịòtù itoollu ụnyaahụ.
Ọ bụ CEP nke ise nke Marteli n'afọ anọ.
N'ọnwa gara aga ozi sitere n'onye ọchịchị kwadoro ọgbụgba arụkwaghịm CEP nọbu anọ dịka ihe so n'usoro omume ihe ibuje obodo na ntuli aka ọhụrụ
Ntinye ọrụ ahụ bụ azịza Martelly maka ngagharị iwe nke mgbochi ọchịchị zuru ebe niile nke bidoro na Ọktoba.
Ụmụ ngagharị iwe a na-alụ ọgụ mgbe ụfọdụ na ya bụ ọdịda ime ntuli aka kpatara ya, ụfọdụ etozuola kemgbe 2011.
E kwuputala na na e nweela nsogbu 60 sitere na iPods ndị n'anaghị arụ ọrụ nke ọma na-ekwo oke ọkụ, nke na-ebutala ọkụ ọgbụgba isii merụrụ ndị mmadụ ahụ obere.
Ministri Japan nke Akụnụba, Azụmaahịa na Ụlọ ọrụ mmepụta (METI) kwuru na ọ ma ama maka ihe mberede iri abụọ na asaa metụtara njìarụ ndị ahụ.
N'izuka gara aga, METI mara okwa sị na Apple gwara ya gbasara oke ekpomoku iri atọ na anọ merenụ, nke ụlọ ọrụ kpọrọ "ihe na-abụghị ihe."
Ụlọ ozi zaghachiri sị na mbugharị oge rịpọt Apple mere dị "mwute n'ezie".
Ala ọma jijiji ahụ mere Mariana na 07:19 elekere ụtụtụ mpaghara (09:19 p.m. GMT Friday).
Ụlọ ọrụ nlekọta ihe mberede nke Nọtan Marianas sị na onweghị mmebi ihe akọpụtara n'obodo.
Ụlọọrụ ịdọ aka na ntị n'ihe gbasara ebili mmiri nke Pasifiki sị na onweghi ihe gosiri na ebili mmiri na-abịa.
Otu onye Filipino wụbụrụ onye uwe ojii edobela ndị njem nleta Hong Kong na njigide site n’ịkwụsị n’ike bọọsụ ha n’ime Manila, isiobodo nke ndị Filipaịnụ.
Rolando Mendoza gbara egbe ya bụ M16 n’ebe ndị njem nọ.
Azọpụtara ọtụtụ ndị eji èji ma mmadụ isii ka ekwuru na ha anwụọla.
Ndị ejigidere ejigide isii, tinyere ụmụaka na ndị okenye, ka ahapụrụ n'oge, ma ndị Filipino n'ese foto.
Ndị ose foto ahụ mechara nọchie otu agadi nwanyị dịka ọ gara ụlọmposi. A gbagburu Mendoza.
Liggins soro n’uzoụkwụ nna ya ma banye n’ọrụ ọgwụ.
Ọ zụrụ ọzụzụ dị ka ọkachamara nke nne na-amụ nwa wee malite ịrụ ọrụ na Ụlọ Ọgwụ Ndị Inyom Nke ala Auckland na 1959.
Mgbe ọ na-arụ ọrụ n'ụlọ ọgwụ Liggins malitere inyocha ọmụmụ nwa akaghị aka n'oge ezumike ya.
Nlebaanya ya gosiri na e nye homonu, ọ ga-eme ka nkuume nwata dị n'afọ tozuo oke ọsịsọ karịa.
Xinhua kwuru na ndị nnyocha gọọmenti chọtara igwe 'igbe ojii' na-edokọ etu njem ụgbọelu si gaa na Wenezdee.
Ndị mgba ibe ha mere ihe ndị gosiri nkwanye ugwu nye Luna.
Tọmi Drima sị na "Luna bụ Eze nwaanyị ihe ngabiga oke nke mbụ. Onye nlekwa ọrụ m nke mbụ. Luna nwụrụ n'abalị ọnwa abụọ. Ọ pụrụ iche dị ka ya. Nwaanyị siri ike."
Dọstin "Goldọst" Runnels sị na "Luna na-eme ihe ndị ara ka m...onwere ike karịa... ahụrụ m ya n'anya aga m na atụkwa anya ya... Enwerem olileanya na ọnọ ebe ka mma."
N'ime mmadụ otu puku na iri anọ tụrụ ụtụ tupu ndọrọ ndọrọ ọchịchị gọọmenti etiti nke afọ 2010, ndị megidere mba Ọstrelia ịbụ obodo kwuuru onwe ya ji pasentị asatọ rịa elu kemgbe afọ 2008.
Onye nlekota ala (Caretaker Prime Minister) Julia Gillard kwuru n’oge Kampeenu nke nhoputa ndi ochichi nke goomenti etiti na okwere na Australia kwesiri ibu repoblik ma Eze nwanyi Elizabeth nke abuo chicha.
34 nime-otu-nari-nile bu ndi tinyere aka na ntuli aka ahu n’enwe otu uche ahu, n’acho ka Eze-nwanyi Elizabeth II buru onye eze nke ikpeazu nke Australia.
Ka ịtụ vootu nọ na ngwụcha, pasentị iri abụọ na itolu n'ime ndị elebaara anya kwenyere na Ọstrelia kwesịrị ịbụrụ mba nọọrọ onwe ya ngwa ngwa, ebe pasentị iri atọ na otu kwenyere na Ọstrelia ekwesịghị ịbụ obodo nọọrọ onwe ya.
Onye nwebụrụ mgbanye ọlaedo Olympicruru igwu mmiri na nke 100m na 200m ụdị nnwere onwe na ngwụgharị ugboro atọ n'Egwuregwu Commonwealth ahụ, mana n’ihi mkpesa ya, enweela obi abụọ maka ịdị mma nke ahụike ya.
O nwebeghị ike ịn̄ụ ọgwụ ndị ahụ o kwesịrị iji merie mgbu ya dị ka a machibidoro ha iwu site n’Egwuregwu.
Curtis Cooper, onye ọka mmụta mgbakọ na mwepụ na onye ọka mmụta sayensị kọmputa na Mahadum nke Etiti Missouri, achọpụtala akara praịm kachasị buo ibu ruo ta na Jenụwarị 25.
Ọtụtụ ndị mmadụ nyochara nchọpụta ahụ n’iji ngwaike na ngwanrò dị iche iche site na mbido Februarị ma a mara ọkwa ya na Tusdee.
Ụmụ Kọmetị nwere ike ịbụ isi mmalite nnefe mmiri nye ụwa ya na ihe dị ndụ nwere ike ịmepụta ụmụ protiin ma kwado ndụ.
Ndị ọka mmụta sayensị nwere olileanya ịghọta ka uwa dị iche iche sị kpụọ, ọkachasị otu ụwa anyị siri kpụọ, kemgbe okwute igwe na ụwa anyị sukọkọ isi n'ote aka.
Kuomo, onye dị afọ iri ise na atọ, bidoro ọchịchị gọọmenti steeti na mbido afọ a ma binye aka n'ọnwa gara aga n'iwu kwadoro mmekọahụ nwoke na nwoke maọbụ nwanyị na nwanyị.
Ọ kpọrọ asịrị ndị ahụ "mkparịta ụka ndọrọndọrọ ọchịchị na nzuzu".
A na-aka na ọ ga-azọ ọkwa onye isi ala n'afọ 2016.
NextGen bụ otu sistemụ FAA na-asị ga-enye ụgbọ elu òhèerè ife site n’ụzọ kara pee mpe ma chekwa ọtụtụ nde galọnụ nke mmanụ kwa afọ na mkpọfụ anwụrụ.
O ji teknụzụ satilaịti dị iche na teknụzụ rada nọ n'ala were enyere ndị na-ejikwa nfegharị ụgbọelu aka ịma ebe ụgbọelu nọ kpọmkwem ma nyekwa ndị ọkwọ ụgbọelu ozi ziri ezi.
Anaghị etinyekwasị ihe njem, ma ụgbọoloko elu ala agaghị akwụsị na Wembli, ma ndowe ụgbọala makwa akụrụngwa dowe ma gbakwaa adịghị ebe ahụ.
Ụjọ ụbịam ụzọ njem mere na onwere ike ndị egwuregwu ga egwu n'enweghị ndị nkwado ha.
Otu mmụta e bipụtara na Tọzdee n’ime jọnaalụ Sayensi kọrọ na mwube nke otu ụdị nnụnụ ọhụrụ na Agwaetiti Galápagos nke Ikuedọ.
Ndị nchọcha sitere na Mahadum Princeton dị na mba Amerịka na Mahadum Uppsala dị na mba Sweden kọwara ụdịdị ọhụrụ pụtara na naanị ọgbọ abụọ, ọ bụ ezie na ụkpụrụ a ka e chere na ọ na-ewe oge karịa, n'ihi ọmụmụ n’etiti otu ụdị nnụnụ bụ Dawin Finchi na-ebi otu ebe, Jiospiza Fọtisi, nakwa Kakụtus Finchi si esi bata, Jiospiza konirostrisi.
E nwere ike ịrụpụta ọla edo n'ime ụdị ụdịdị niile. E nwere ike ịpịakọta ya n'ime ụdịdị ndị pere mpe.
Enwere ike itinye ya n'ime waya girigiri, nke e nwere ike ịghịkọta ma tee ya ihe otite. Enwere ike itisa ya ma ọ bụ rọkụlọ ya n'ime mpempe akwụkwọ.
Enwere ike ime ya ọ dị oke gịrịgịrị, ma mado ya n'ahụ igwe ọzọ. Enwere ike ime ya ọ dị oke gịrịgịrị ruo na ụfọdụ oge eji ya achọ ọrụ agba ejiri aka tee n'akwụkwọ akpọrọ "akwụkwọ ihe ngosi" mma.
A na-akpọ nke a PH nke kemịkal. I nwere ike ịme ihe ngosi site na iji mmiri kabeeji na-acha ọbara ọbara
Ihu mmanya kabej a na-agbanwe agba dabere na otu kemikal ya si dị asidik maọbụ bezik (alkaline).
Nha nke ayọn Hydrogen nọ na kemịkal ọbụla bụ ihe na-egosi ogo pH ya.
Ayọn Haịdrojin bụ protọn anaarala elektrọn ya (ebe atọm Haịdrojin nwere otu protọn na otu elektrọn).
Kpaharia kota nzu abuo ahu kporo-nku onu ma mgbe-ahu, na aka di mmiri ma dikwa ocha, pikoo ha ka ha ghoo boolu.
Mpụta ya na mmiri dị gị n'aka ga-enwe mmekọrịta, nke ga-enye gị mmetụta dị aghaa ma mepụta ihe dị ka ọkpụkpụ mkpuchi.
Ọ fọrọ obere ka ụlọ niile dị n'obodo Harappa na Mohenjo-daro nwee mpochi mmiri, ya na usoro mkpopu kara aka.
A chọtala sistemu nsi fọdụrụnụ n’ụlọ Minoan ndị dị n’obodo Crete na Santorini na Greece
Ha nwekwara ụlọ mposi n'Ijipt mgbe ochie, Peshia na Chaịna. N'okpuru ọchịchị ndị Rom, mgbe ụfọdụ ụlọ mposi na-abụkarị otu akụkụ nke ụlọ ọsịsa ahụ ọha ebe ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị nọkọtara ọnụ.
Mgbe ikporo mmadu onye no otutu puku maili site n’ebe ino , ihe iji bu igwe satalaiti.
Satilaịti nọ n'ikuku na enweta oku ma zighachi ya n'ala na ntabi anya.
E ji ụgbọelu rọkeetị zije satilaịti n'ikuku. Ndị ọka mmụta sayensị na eji igwe nyocha kpakpando afụ ụzọ n'ikuku mpụga ụwa n'ihi na igwe ụwa anyị na arọgharị ụfọdụ ọkụ anyị na ahụ.
O na-ewe nnukwu rọketi gafere ụkwụ otu narị n’elu itinye otu satịlaịtị na teliskop n’eluụwa.
Wiilu agbanweela ụwa n'ụdị enweghị atụ. Ihe kachasị ukwu nke wiilu merela anyị bụ na o nyere anyị ụzọ njem dị mfe ma dị ọsịsọ karịa.
O wetegoro anyị ụgbọoloko, ụgbọala na ọtụtụ akụrụngwa njem dị iche iche.
N'okpuru ha bụ ụmụ nwamba ha ọkara na-eri anụoriri ha ọkara nke nwere ike isi na oke bekee ruo na ele nakwa mgbada.
N’ikpeazụ, e nwere ọtụtụ obere nwamba (gụnyere anụ ụlọ nwamba furu efu) na-eri ọtụtụ obere ụmụ anụmanụ dị ka ụmụ ahụhụ, oke, ngwere, na nnụnụ.
Ihe nzuzo nke ọganihu ha bụ gburugburu ebe obibi, ọrụ nwamba niile ji nke na egbochi ịsọmpi ha na ndị ọzọ.
Ọdụm bụ nwamba kachasị emekọrịta n'onwe ha, na-ebi na nnukwu òtù akpọrọ nganga.
Mpako gasị bụ otu ruo atọ ụmụ nwoke tozuru oke metụtaranụ mejupụtara ya, yana ụmụ nwanyị na ụmụ ya dị ọtụtụ dị ka iri atọ.
Ndị nwanyị na-emetụtakarị nke ukwu n’onwe ha, n’ibu otu nnukwu ezinụlọ nke ụmụnne nwanyị na ụmụ nwa nwanyị.
Ezinụlọ Ọdụm na-akpa agwa ka ezinụlọ oke nkịta ọhịa maọbụ nkịta ụlọ, anụ ndị nwere oyiyi dị ịtụ n'anya nye Ọdụm (mana odịghị otu a n'ebe nnukwu nwamba ndị ọzọ nọ) n'omume, ma bụrụ ihe oke iyi egwu nye ihe ọbụla ha na-achụ na nta.
Ome ihe egwuregwu zuruoke nkeoma, agu ahu ga enyili elu (obu ezie na obughi nkeoma), gwuo mmiri, maa-amaa garuo ebe di oke anya ma doo okpukpu ise dika ike mmadu di ike nwere ike ido.
Agụ nọ n’otu otu (Genus Panthera) dika ọdụm, owuru, na jaguar. Nwamba anọ ndị a bụ naanị ndị nwere ike ime mbigbọ.
Ụja agụ adịghị ka mgbọpụta n'uju ụja ọdụm, mana ọ dị nnọọ ka okwu e kwuputara n'iti mkpu.
Ona amasi Ocelot iri obere umu-anumanu. Ha ga anwuchi enwe, agwo, oke na nnunu ma ha nwee ike. Oka-na-onuogugu anu anumanu nile Ocelot na achu-nta di obere nnukwu karia ka odi.
Ndị oke mmụta sayensị cheere na nwamba Oselọt ji isi esochi ma na-achọta anụ ha ga eri, site na ịkpọkwa imi n'ala iji site ebe ha gara.
Ha na-ahụ ụzọ nke ọma n'abalị, ma na ejegharịkwa na nzuzo karịa. Oselọotụ na agwakọta onwe ha na gburugburu ha iji nwude anụ ha na achụ.
Mgbe ọbụla ụmụ obere ihe dị ndụ (obere ọnụ ọgụgụ yiri onwe ha) si na ndị otu ha pụọ (dịka ha gafee ugwu, osimiri, maọbụ gaa n'agwaetiti ọzọ ebe ọ ga-ara ahụ isi laghachi) ha ga-achọta onwe ha na gburugburu di iche ọtụtụ mgbe.
Gburugburu ọhụrụ a nwere akụrụngwa dị iche ma ndị ịsọmpi dị iche, n'ihi nke a ọnụọgụgụ ọhụrụ ahụ kwesịrị inwe akụrụngwa dị iche maọbụ ihe mmegharị ọzọ ga eme ya ka ọbụrụ onye ịsọmpi dị ike karịa ka ọdịbu.
Ọnụọgụgụ nke izizi agbanwebeghị maọlị, ha ka chọrọ ihe mmegharị dịka nke mgbe mbụ.
Ka oge na-aga, dịka gburugburu ha ọhụrụ bidoro mawa ha ahụ, oyiyi ha na ndị ha hapụrụ ebido na-ebelata.
Mgbe puku afọ maọbụ rịị nde afọ ụfọdụ gasịrị, otu abụọ a ga adị nnọọ iche ruo oke ebe agaghịzị akpọ ha abụọ otu ụdị.
Anyi na-akpọ usoro a speciation, nke pụtara nguzobe nke ụdị okike ọhụụ. Speciation bụ nsonaazụ a na-apụghị ịgbagha agbagha na akụkụ dị oke mkpa nke evolushọn.
Osisi na-eme ikuku oksigin nke mmadụ na-ekuru, ma ha na e kubanye carbon-dioxide nke mmadụ na-ekufu ume (ya bụ, na-ekufu ume).
Akụmakụ osisi na emepụta nri nke ha site n’anyanwụ site n’aka fotosintesis. Ha na-enyekwa ndo.
Anyị ji osisi eme ụlọ na akwa. Ọtụtụ nri anyị na-eri bụ osisi. Ewepụ osisi, anụmanụ agaghị adị ndụ.
Mosasaurus bụbu isi n'anụ na-eri anụ n’oge ya, nke a mere na onweghi ihe na-atụ ya egwu, karịa mosasaurs ibe ya.
Agba ogologo ya bụ nke emejupụtara n'iji ihe karịrị eze dị aguba-nkọ iri asaa, yana òtú òtù mmezi n'elu ọnụ ya, nke pụtara na ọ nweghị ụzọ mgbapụ maka ihe ọ bụla gafere n'ụzọ ya.
Onweghị anyị anya, mana ọ dịka onwere ire abụọ. Ọ na eri mbe mmiri, nnukwu azụ, anụ ndị yiri ya, onwekwara ike na eri ụdị nke ya.
Ọ wakpọkwara ihe ọ bụla banyere n’ime mmiri ahụ; ọbụná nnukwu dainosọọ dị ka T. rex abụghị atụ n’ebe ọ nọ.
Ka anyị maara nke ọma imirikiti nri ha, ndị Rom nwere oke ha na ihe erimeeri ijuanya ma ọ bụ pụrụ iche, gụnyere ezi ọhịa, piikọkụ, ejula, na ụdị oke akpọrọ dormouse.
Ihe ọzọ dị iche bụ na ebe ndị ogbenye na nwanyị ahụ riri nri ha ka ha nọ ọdụ n'oche, ndị ọgaranya na-enwe mmasị inwe mmemme oriri ebe ha ga-eri nke ha n'ezumike.
Ụmụ nri Ndị Rome Ndị mgbe ochie enwughị ike ịgụnye nri ndị batara Yurop site na Amerịka ma ọ bụ Eshịa na narị afọ ndị na-esotenu.
Na imaatu, ha enweghi oka, nweghi tomato, nweghi poteto, nweghi koko, na onweghi onye Rome mgbeochie deturu anu toro-toro ire.
Ndị Babịlọn rụrụ otu n’ime chi ha otu isi ụlọ nsọ nke e were ka ebe obibi chi ahụ.
Ebe ndị mmadụ wetaara chi ndị ahụ aja, ndị nchụ aja ahụ maka ihe ha bụ chi na-achọ, site n'emume na mmemme di iche iche.
Ulo-uka n’otu n’otu nwere mbara-ezi ulo-uka ma nwekazie ime ebe nchuaja ebe nani onye-isi nchu-aja nwere-ike ibanye.
Ụfọdụ oge a na arụnye ụlọ elu nwere oyiyi oiramid, ndị akpọrọ ziggurats, ka ha bụrụ osonye ụlọ okpukpe.
Elu ụlọ elu a bụ ebe dị nsọ pụrụ iche nye chi ahụ.
Na ekpem-oku nke udidi na mba ndi etiti owuwa-anyanwu, ulo ahu abachaghi uru.
Ọtụtụ ihe ezinụlọ ndị juu a mere, ọ bụ n'anya onye ọbụla ka ha mere ya.
Ụmụ nwanyị siri nri na mbara eze; ụmụ ụlọ ahịa wụbụ naanị ọgụego mepere emepe na-elefe anya n'okporo ámá. E jire okwute maka ịrụ ụlọ.
O nweghị ụmụ ọhịa buru ibu n’ala nke Keenan, ya mere osisi na-ada oke ọnụ.
Ndị mmadụ anọjughị otu ebe na Grinland. N'akụkọ Norse ha sị na achụfuru Erik the Red n'obodo Iceland n'ihi igbu ọchụ, ma mgbe ọ na aga njem na mgbada ọdịda anyanwụ, ọchọpụtara Grinland wee gụọ ya Grinland.
Mana n'agbanyeghi nchọpụta ya, agbụrụ Ezkimo ebirilarị ebe ahụ n'oge ahụ.
N'agbanyeghị na obodo ọbụla bụ 'mba Skandinevia', enwere ọtụtụ ihe dị iche n'etiti ndị, ndị eze, omenala, na akụkọ ihe mere na Denmak, Swiden, Nọọwe na Aisland.
Ọ bụrụ na ileela ihe nkiri a na-akpọ Akụ nke Mba, i nwere ike chee na e dere otu maapụ akụ n'azụ nke Nkwupụta nke Nnwere Onwe ahụ.
Agbanyeghị, nke ahụ abụghị eziokwu. N’agbanyeghị na enwere ihe edere n’azụ nke dọkumentị ahụ, ọ bụghị otu maapụ akụ.
Ka-edere na azu nkwuputa nke nnoro-onwe bu okwua “Nkwuputa nke Nnoro-onwe Nke bu ezie ubochi abali 4 juli 1776” .Ederede ahu putara na ala-ala akwukwo ahu, kpodo isi na-ala.
Ọ bụ ezie na ọnweghị onye maara nke ọma onye dere ya, amaara na mmalite na ndụ ya, afụkọtara nnukwu dọkụment e jiri akpụkpọ anụ mee (o nwere nha inchì 29¾ site na inchì 24½) ọnụ maka nchekwa.
Ya mere, ọ dị ka agbakwụnyere ihe ngosi a dị ka akara njirimara naanị.
Ubochi-ubochi nladata ya agha ndi na esota atohapula mpaghara ugwu nke France, mana mpaghara ndida enwerebekwa onwe ha.
Ndị chịrị ya bụ ndị "Vichy" French. Ndị a bụ ndị mba Frans ndị ha na ndị mba Jamini mere udo n'afọ 1940 ma soro ndị iro rụkọọ ọrụ karịa ịlụso ha ọgụ.
N'ụbọchị nke iri na ise nke ọnwa Ọgọọstụ n'afọ 1940, ndị enyi busoro mpaghara ndịda nke Frans agha, akpọrọ nke a "Operation Dragoon".
N'ime nanị izu abụọ ndị agha America na Ndị French nke Nweere onwe ha emeela ka ndịda France nwere onwe ha ma wee na-atụgharị echewe ihu na Germany.
Ọdịnala bụ otu omenaala ọha mmadụ buru ibu na-ebi ma na-arụkọ ọrụ ọnụ, a na-akpọ ọha mmadụ a sosayiti.
Ahịrịokwu "civilization" si n'okwu Latin bụ civilis, nke pụtara "gbasara obodo", nke metụtara okwu Latin bụ civis, nke pụtara onye obodo, na civitas, nke pụtara obodo maọbụ obodo-steeti, nke ahụ nwekwara otu o si egosi nha nke ọha mmadụ.
Steeti-obodo gasị bụ obu ụzọ nke ụmụ mba. Omenaala kemmepeanya pụtara nnyefe nke ihe ọmụma n'etiti ọtụtụ ọgbọ, akaraụkwụ omenaala nke ka nọ ya na mgbasa dịtụ mma.
Ụmụ obere ọdịnala na-apụ n'anya na-ahapụghị ihe akaebe dị mkpa ya mere anaghị ahụta ha dị ka sivilaịzeshọn kwesịrị ekwesị.
Ka a na alụ agha ntụgharị, steeti iri na atọ ahụ bu ụzọ gbakọọ bido gọọmenti nchịkọta nke na adịghị ike - nke nzukọ bụ sọ ngalaba onwere- n'okpuru akwụkwọ obodo.
Nzukọ enweghị ike ike ụtụ ma n'ihi na enweghi ndị isi ọchịchị gọọmenti etiti maọbụ ndị omeiwu, ọ dabeere na ndị isi ọchịchị steeti, ndị anaghị enwe otu obi ọtụtụ oge ịkwado iwu ya nile.
O nweghi ikike imechi iwu ụtụisi na tarifu n'etiti steeti na steeti.
Ederede ahụ chọrọ nkweta steeti niile n'enweghi mgbagha tupu enwee ike imezi ha ma steeti ga weere gọọmentị etiti n'ihe efu ruo na ndị nnọchiteanya ha anaghị abịa.
Ndị otu egwuregwu bọọlụ ukwu nke mba Itali, ya na ndị otu egwuregwu bọọlụ ukw nke mba Jamani bu ndị kacha eme nke ọma n'otu bọọlụ ukwu na mbaụwa ma bụrụkwa ndị nwetara mmeri n’iko mbaụwa nke afo 2006.
Egwuregwu ndị a ma ama gụnyere futbọl, basketbọl, volleybọl, polo-mmiri, fencing, rugby, ịgba ịnyịnya, hockey ice, hockey roller na ịgba ọsọ ụgbọ ala F1.
Egwuregwu oge oyi kachasị ewu ewu n'ugwu, ebe ndị mba Italy so asọ mpi n'egwuregwu mba na mba makwa na Olimpik.
Mba Japan nwere isuo ruru nde asaa (nke kachasị ibu bụ isuo Honshu), nke a mere mba Japan isuo nke asaa kacha ibu n'ụwa.
N’ihi mkọkụlọta/òtù agwaetiti ahụ Japan nwere, a na-arụnyekarị Japan aka, n’elu etu ala ndị ahụ sị guzogide, dị ka "archipelago"
Mbido mmepe Taịwan malitere n’oge gara aga nke narị afọ iri na ise mgbe ndị ọkwụ ụgbọ mmiri Ndị Yurop na-agafe dekọrọ aha agwaetiti ahụ dị ka Ilha Formosa, ma ọ bụ agwaetiti mara mma.
N'afọ 1624, Ụlọọrụ Dọch Isti Indịa mepere ụlọọrụ na ndịda ọdịdaanyanwụ Taịwan, bido mgbanwe n'otu e si emepụta mkpụrụ n'oge gboo, ma wee ndị ọkpọkọọrụ Chaịna ka ha rụọ ọrụ n'ugbo osikapa na nke shuga ha.
N'afọ 1683, ndị agha ezinụlọ ọchịchị Shịng (1644-1912) weghaara akụkụ mmiri Taịwan dị n'ọdịda anyanwụ na nke dị n'ugwu ma kwuputa na Taịwan bụzi mpaghara n'okpuru ọchịchị Alaeze Shịng n'afọ 1885.
Na 1895, mgbe a dachara n’Agha Sino-Japanese Mbụ (1894-1895), ọchịchị Qing ahụ mere mbịanye aka na Nkwekọrịta nke Shimonoseki ahụ, site na nke o jiri nyefee Japan ọbụbụeze nke Taiwan, nke na-achị agwaetiti ahụ ruo 1945.
Machu Picchu nwere ọdịdị atọ, ya bụ Intihuatana, Ụlọ Nsọ nke Anyanwu, yana Ime ụlọ nke Windo Atọ.
Ọtụtụ n'ime ụlọ ndị nọ na mpụta ogige ụlọ ahụ ka arụgharịrị ka enwee ike gosi ndị njem nleta echiche etu ha siri pụta na mbụ.
Mgbe 1976 ruru, e mezigharịala pasent iri atọ nke Machu Pichu; mmezi a ka na-aga n'ihu ruo taa.
Dịka ọmụmaatụ, nhàzi nka osise onyinyo nkwụ n'otu ebe a na-ahụkarị n'ụwa niile bụ 35mm, nke bụ nha fim kachasị ewu ewu na ngwụcha oge fim analọgụ.
A ka na-emepụta ya taa, mana ihe ka mkpa bụ na ụdịdị sensọ foto nke igwefoto dijital eketala aspekt reshiyo ya.
Ọ dịtụ mgbagwoju anya na, n'ezie, ụdịdị 35mm nwere 36mm n'obosara na 24mm n'ogo.
akuku rashio nke usoro a ( iji iri na-abuo were nweta rashio onu ogugu dikasiri mfe) bu 3:2 maka nke a.
Ọtụtụ usoro nkịtị (dịka usoro APS si n'otu ezinaụlọ) ga-abụ otu ihe maọbụ ruo ihe dịka nkepụta nkewa a.
Iwu nke atọ ndị a na-akparị ma na-akwakarị oke emu bụ usoro dị mfe na-emepụta ịdịmgbanwò dị ka ọ na-edotekwa otu ụhara usoro ọrụ n'ime otu onyinyo.
O kwuru na ebe kachasị dị ire maka isi nke isiokwu bụ na mmekọta ụmụ ahịrị na-ekebi ụmụ onyinyo ahụ n’ụzọ atọ na nke eguzoro ọtọ nakwa nke a mara afọ n’ala (hụ ọmụmatụ).
N'oge a na Yurop, e bidoro lebawa anya n'Ụka Katọlik, nke bagoro ụba ma dị ike.
Kamgbe ihe karịrị otu puku afọ, okpukpe Ndị Kraịst jikọtara obodo ndị dị na Yuropu n'agbanyeghị na asụsụ na omenala ha dịgasị iche.
Ike ya juputara ebe niile metụtara onye ọbụla site n'eze ruo na mmadụ nkịtị.
Otu n'ime isi okwu okwukwe Ndị Kristian bu na ekwesiri iji akụ belata nhụjuanya na ịda ogbenye nakwa na ego ụka nọ kpọmkwem ebe ahụ n'ihi nke ahụ.
Ikike keetiti ahụ nke ụlọ uka anọọla n'ime Rom karịa otu puku afọ ma mkpọkọnata ike na ego a duru ọtụtụ ndị ịjụ sị ma a na-esokwa ụkpụrụ ya.
Ka agha dara, mba Britenị jiri ndị agha elu mmiri gbochie ndị Jamani inweta enyemaka
Atụmatụ ahụ rụrụ ọrụ ọfụma, na-ebepụ ụmụ ihe mbute ihe ndị agha na ndị nkiti dị oke mpka, n’agbanyeghị na mgbochi a dara iwu mba ụwa anabatara n’izugbe nke ọtụtụ nkwekọrịta n’etiti mba ụwa nke afọ narị abụọ gara aga nyere ikikere.
Briten tinyere ogbunigwe na mmiri ọha mba igbochi ụgbọ mmiri ọbụla ịbata, nke a abụrụ ihe ize ndụ nye ụgbọ mmiri ndị esoghi alụ agha.
Ebe nzaghachi ihe omume a pere mpe, mba Jamini lere anya na a ga emekwa otu ihe n'ebe agha okpuru mmiri nọ.
N'oge afọ ndi 1920, agwa kachasị dị ebe nile n'etiti ndị mba dị iche iche bụ nke ịchọ udo na nnọrọ onwe.
Mgbe a hụchara ụmụ egwu na ajọ ọmụme nke agha n’oge Agha Ụwa I, mba gasị chọrọ izere ụdị ọnọdụ ahụ ọzọ n’ọdịnihu.
N'afọ 1884, Tesla kwagara na mba Amerịka ịnara ọrụ na nke Ụlọ ọrụ Edison n'Obodo Niu Yọk.
Ọ bịarutere na US n’inwe centị anọ n’aha ya, otu akwụkwọ nke uri, ya na otu akwụkwọ ozi nke nkwanye sitere na Charles Batchelor (onye njikwa ya n’ọrụ ya gara aga) ruo Thomas Edison.
Chaịna ndị mgbe ochie nwere ụzọ pụrụ iche igosi oge afọ; ogo ọbụla nke Chaịna ma ọ bụ ezinụlọ ọ bụla nọbụrụ n’ọchịchị wụbụ oge ọchịchị eze pụrụ iche.
Nakwa n’etiti usoro ndị eze ọ bụla bụ otu oge ejighị n'aka mke mpaghara ndị kewara ekewa. Oge ndị a nke a kacha mara amara bụ oge nke Alaeze Atọ nke mere ruo afọ iri na isii n'etiti Usoro Ndị Eze Han na Usoro Ndị Eze Jin ndị ahụ.
N'oge ndị a, a lụrụ ọtụtụ agha n'etiti ndi ukwu na-azọ oche eze.
Alaeze Atọ so n'otu n'ime ọgbọ kacha dị egwu n'akụkọ ihe mere na mba Chaịna mgbe gboo. Puku kwuru puku mmadụ nwụrụ n'agha ịnọ n'oche ọchịchị nke kachasị elu na nnukwu obi eze nke dị na Xi'an.
Nke a butere ọtụtụ mmetụta na mmekọ mmadụ na ibe ya makwa na ndọrọ ndọrọ ọchịchị dika usoro agụm ọnụ, mgbanwe site n'ọchịchị okwu otu onye gaa na nke okwu mba, nke obodo na nkwenye na obodo bụ nke ọha karịa ịbụ nke otu onye ọchịchị.
Ọzọkwa mgbe ụmụ aka ọrụ Mgbanwe ọchịchị ahụ mepechara maka ụmụ nwoke ọchọ ọrụ niile na-ekwe ka ndị kacha nwee oké ọchịchọ na ihe ịga nke ọma ka ha gaa nke ọma.
Ọ bụkwa otu ihe ahụ n'amị, maka na kama nhazi n'usoro nke ndị amị ga-adabere n'ogugo, ọ daberezie n'ikikere.
Mgbanwe France melitere obi ndi oru ana emegbu emegbu no gasi na mba ndi ozo ha ewere wee ike ibido mgbanwe nke ha.
Muhammad nwere ezigbo mmasị n’ụmụ okwu gabigara ụwa a na-agwụ ike. Ọ dịbụ na-agakarị n’otu nnukwu ọnụala nke emechara mara dị ka “Hira‘” n’ugwu nke “Noor” (light) maka ntụgharị ụche.
ọgba ahụ n'onwe ya, nke lanarịrị oge ndị a, na-enye ezigbo ihe ngosi maka echiche gbasara ihe mmụọ nke Muhammad.
Na-ezu ike n’elu otu n’ime ugwu ndị nọ n’uwgu nke Meeka, nnukwu ọnụala dịpụrụ adịpụ n’ozuzu site n’akụkụ ụwa ndị ọzọ niile
N'ezie, ọ dịghị mfe maọlị ịchọta, ọbụrụgodi na mmadụ maara na ọ dị. Ozugbo abanyere n'ime ọgba ahụ, ọ bụ ndịpụ kpam kpam.
O nweghị ihe ọzọ enwere ike ịhụ na-abụghị eluigwe dị n’elu gbachapụrụ, maa mma na ọtụtụ ugwu gbara gburugburu. Nanị obere nke ụwa ka enwere ike ịhụ ma ọ bụ nụ site n’ime nnukwu ọnụala ahụ.
Oke Piramid na Giza bụ naanị nke ka kwụ taa n'ime ihe itụnanya asaa ahụ.
Ndị Ijipt rụrụ n’ime narị afọ atọ BCE, Oke Piramidi ahụ otu n’ime ọtụtụ nnukwu ihe ọwụwụ piramidi arụrụ ịkwanye Fero nwụrụ ugwu.
Ala ugwu Giza maọbụ "Giza Nekropolis" nke dị na ndagwurugwu ọnwụ Ijipt nwere ọtụtụ piramid (nke piramid ukwu bụ nke kachasị ibu), ọtụtụ ebe olili, ọtụtụ ụlọ ofufe nakwa oke Sfinks.
Arụrụ oke piramid iji kwanyere Eze Khufu zugwu, ya na ọtụtụ piramid obere ndị ọzọ, ebe olili na ụlọ ofufe arụrụ ịkwanyere ndị inyom Khufu na ezinụlọ ya ugwu.
Akara “ụta elu” ahụ yiri otu V ma akara “ụta ala” ahụ yiri otu stepụlụ ma ọ bụ otu ǹkomgbaànoǹhà nke tufure ebe okpuru ya.
Elu pụtara na Ị kwesịrị isi n'ọnụnụ ya pịa ụta aka, ma ala pụtara na Ị kwesịrị isi na fụrọgụ (nke bụ ebe aka gị ji ụta) were dọọ ụta aka.
Otu ụta-elu na -emepụtakarị ụda kara dị nro, ebe ụta-ala ka sie ike ma kara kwupụta.
Detuo akara nke gị na nwere onwe, mana chetakwa na akara ndị ahụ ebiri ebi nwere uru egwu ha bara, n'ihi nke a ha kwesịrị ka akwanyere ha ugwu.
N'Oktoba 6, 1789, ụmụ nwanyị ahịa iwe ji yiri Eze Luwi XVI oke egwu mgbe ha si na Versailles dọrọ ya, nwunye ya Marịa Antwanet, obere ụmụ ha abụọ (Marịa Teriza dị afọ 11 na Luwi-Chals dị afọ anọ), na nwanne nwanyị Eze, Madam Elizabet, dọghachi ha na Parii.
Ha laghachiri Paris n'ime moto ịnyịnya ndị iwe na-ewe gbara gburugburu, ha na-eti mkpu na-agwa Eze na Nwunye ya ihe egwu dị iche iche.
Ndị iwe a manyere Eze na Queen ka ha meghee windo ụgbọ ha.
N'otu mgbe otu n'ime ndị igwe mmadụ fegharịrị isi onye nche eze egburu na Versailles n'ihu eze nwanyi ụjọ ji.
Mmefu ego n'agha nke ndị Amerịka mbịarachịwa na mmeri ndị Filipaị bụ nke ndị Filipino kwụrụ ụgwọ ya n’onwe ha.
A manyere ha iwu ịkwụ ụtụisi nye ndị ọchịchị mbịarachịwa mba Amerịka iji wedata oke ego e mefuru n'aha gọọmenti mba Filipin site n'aka ụlọakụ Wọlụ Striti.
N’eziokwu, nnukwu uru e nwetara na ogologo mmegbu ndị mba Filipiinụ ga-abụ ihe mejuputara isi uru omume empaya Amerịka.
Ịghọta ndị Templars, aghaghi ịghọta ọnọdụ nke kpaliri okike nke otu a.
Ọgbọ ihe ndị a mere na ya ka a na-akpọkarị Ọgbọ Etiti dị Elu bụ oge ihe ndị mere na mba Yuropu n'afọ narị iri na otu, narị iri na abụọ na narị iri na atọ (AD 1000-1300).
Ọgbọ etiti ndị nke mbụ butere ọgbọ etiti ndị dị elu ụzọ, nke ọgbọ etiti nke ngwụcha sotere n'azụ nke gwuru ebe 1500.
Mkpebi teknụụzụ bụ usoro gazuru nchịkọta nchepụta gasị etinyere n’uju, site na technụụzụ-kwàa maọbụ nye iwu siri ike nke bụ na njedebe nke onye ga-esite n’iwu metụtara sayensi na nke ngosipụta teknụụzụ.
Ọtụtụ nkọwa e nyere nkwenyesiike kenkanụzụ nwere echiche izugbe abụọ: na mmepụta nkanụzụ n'onwe ya na-agbaso usoro nke gbapụrụ iche site na nkwanye nke omenala maọbụ ndọrọndọrọ ọchịchị, ya na kwa na nkanụzụ n'aka nke ya nwere "mmekpaahụ" ọ na-enye ọhaobodo nke dị adị, n'abụghị nke sitere na mmekọrịta.
Maka ọmụmaatụ, mmadụ nwere ike ịsị na ụgbọala n'ịkwesị ekwesị na-eduga na mmepe nke ụzọ gasị.
N'agbanyeghị nke a, okporo ụzọ zuru obodo ọnụ bụ mmefu ego ma ọbụrụ na ụgbọ ala ehighị nne, ya mere emepụtara ụzọ ọhụrụ ịwedata ego o na ewe inwe ụgbọala.
Ọtụtụ mmadụ inwe ụgbọ ala na-ebutekwa nnukwu ihe mberede n'okporo ụzọ, nke na-eweta mmepụta usoro nleta ahụike ọhụrụ maka ịrụzi ahụ mebiri emebi.
Ihunanya ya nwere otutu ihe banyere mmeme nke ọdịnala, nke sitere n'aka ndị edemede dịka Goethe, Fichte, na Schlegel.
Na onodu romanticism, ala ebe onye no bu ihe na kpu omume mmadu, k’oge na aga odinala na omenala metutara ala ebe obibi amalite, nkea mere ndi mmadu jiri nabata odinala na omenala ndia maka na ha na ya bu odinala na omenala nwere nkwekorita karia iwu ana atukwasa n’isi oha.
N'otu aka a maara Paris ka isi ejiji ịchọ mma n'ụwa nke oge a, e weere Kọnstantinopul dịka isi ejiji ịchọ mma na mba Yuropu n'oge agha.
Ebidoro n’afo 400A.D. ruo n’afo 1100 A.D were mara ya na o bu isi mkporindu.
Ọkwa na gbadara n’oge narị afọ iri na abụọ tụmadị n’ihi eziokwu bụ na Ndị agha ntute alaghachila ma bute ụmụ onyinye dị ka ụmụ akwa sịlk na ngwa nri ndị nwere mbamuru karịrị ihe ahịa Byzantine nyere.
Ọ bụ n'oge ahụ ka okwa isi ejiji ịchọ ma siri na Kọnstantinopul fere Paris.
Usoro Gotik kasị elu n'oge dị n'etiti afọ ndị nari nke ir na narị nke iri na otu ya na narị nke iri na anọ.
Na mbido, ọ bụ usoro ejiji ndị Byzantium n'ọwụwa anyanwụ ka onye ọbụla na-eso.
Mana, n'ihi ụkpụrụ mkparịta ụka na adịghị ọsịsọ, usoro dị na ọdịda anyanwụ nwere ike inọzụga azụ n'oteaka afọ iri abụọ na ise ruo iri atọ.
na njedebe nke oge Mịdụl Eeji ndị ọdịda anyanwụ Europe malitere mepụtawa usoro nke ha. Otu ihe mmepụta kachasi mkpa n'oge ahụ, n'ihi ọgụ aghara, ndị mmadụ bidoro iji bọtịnụ akpọchị akwa.
Ugbo oru bu ihe oru ugbo bu nke eweputara iji meputa nri ga ezuru ndi mmadu choro ya ma obu ya na ulo ya.
Ịkọ ọrụ ugbo bụ ihe dịcha mfe, ọtụtụ mgbe nke ndụ, sistèm n'iji nkpụrụ echekwara bụ nwa afọ na mphaghara ebe obibi ahụ ejikọtara ya na nghagharị mkpụrụ ma ọ bụ usoro ndị ọzọ dị mfe iji mee ka ọmịmị kachasị.
Na mgbe gboo ọtụtụ n'ime ndị na-akọ ugbo na-eme ụdị nke onwe n'enweghị nke orire ọ ka dịkwa otu a n'ọtụtụ obodo ka na etolite etolite.
Obere omenaala na-ekpọkọta ọnụ ndị nwere ụdị echiche ndị nwere mmetụta na ụkpụrụ keobodo ha leghaara ha anya ma nye ha ohere ịzụlite echiche nke njirimara.
Enwere ike imata ngalaba omenala site na afo, agburu, klaasi, ebe onye bi, ma o bu etu chukwu si kee mmadu -i bu nwoke ka ibu nwanyi.
Ihe nlereanya aji ama na omenala pụrụ iche bụ asụsụ, ịchọ mma, okpukpe, ọchịchị, mmekọahụ, ọnọdụ ebe, maọbu njikọ ọtụtụ ihe.
Ndịòtù nke otu okpuru omenala na-akpọtụrụkarị ịdị n'òtù ha site n'otu ojiji akanka pụrụ iche ma dịmara, nke gụnyere ụmụ ejiji, omume, na asụsụ ịgba izu.
Otu n’ime ukpuru akacha mara nke atuzi-aka banyere uru di mmekorita bu iweta n’uche ihe nwute banyere umu-aka ndi elefuuru-anya, na-nwuta, maobu mmeto akpachaara-anya mee, enweghi mmekorita ha ndi toro-eto mgbe ha ka na-eto eto.
Ụdị ụmụaka a ka a na akpọ ndị azụghị azụ. Ọtụtụ ụmụaka an na azụghị azụ abụrụla ndị ndị mmadụ jituru ejitu (ọ na abụkarị ndị mụrụ ha); oge ụfọdụ ngharịpụ ụmụaka bụ maka ọjụjụ ntụpọ dị na ahụ nwatakịrị ahụ a na ahụ anya maọbụ ntụpọ dị n' akọ n'uche ya.
Ụmụaka azụghịazụ nwere ike ha e nweela ahụmihe nke mmetọ ụmụaka ma ọ bụ ahụmihe mkpasasị uche nke ukwuu tupu agbahapụ ha ma ọ bụ ha na-agbalaga.
Ndị ọzọ bụ ebubo ka eboro n’ọbụ ụmụ anụmanụ kpọpụtara ha; a sịkwara n’ụfọdụ biri n’ime ọhịa na onwe ha.
Mgbe anumanu na-abughi-mmadu zulitechara ya kpam-kpam, nwa-ohia ahu egosi akparama-agwa (na njedebe ebe ana ahu anya) ihe dika nani nke anumanu-nlekota ya, dika ujo ya nye maobu enweghi ujo nye umu mmadu.
Dịka ọmụmụ dabere n’arụmarụ kwesịrị ime ka ọmụmụ kara dị mfe ma na-adọkwu mmasị, ịkụ skafoldu gakwuru otu ụzọụkwụ n’ihu.
Skafoldin abụghị usoro mmụta kama ọ bụ enyemaka na-akwado ndị na-amụ ihe ọhụrụ dịka iji program ọhụrụ arụ ọrụ na kọmputa maọbụ ibido ọrụ ọhụrụ
Ụmụ arụrụmarụ osisi nwere ike ịbụ ma kendịnuche ma ịdịrị ire, n'ụzọ ọzọ, onye nkuzi bụ ụdị arụrụmarụ osisi mana ọ dịkwa dị ka nwoke ntakịrị mkpado akwụkwọ n'ime Microsoft Office.
A rụnyechara Ihe nkwado n'ime ngwanro a, ndị ga-ajụ ajụjụ, nye ozi, ma kọwaa usoro ndị gaara ara nwa akwụkwọ ahụ ịghọta n'onwe ya.
Enwere ọtụtụ ihe e ji akpọga ụmụ aka ka onye ọzọ lekọta ha, dịka nleghara anya, mmegbu, nakwa nnapụ ihe.
Ọ dị mma ka nwatakịrị tolite na gburugburu ebe a na-adịghị elekọta, elekọta, na agụmakwụkwọ, mana ha na-eme ya.
Anyị na-ahụta Ụkpụrụ Nlekọta anya ahụ ka ebe n’enweghi ihe iyi ndụ egwu nye ụmụaka ndị a.
Ụlọ nchekwa ụmụaka anyị kwesịrị inye ụlọ nwere nchekwa, ndị nledo anya nwere ịhụnanya, nkụzi akwụkwọ dị mma, na nlekọta ahụike dị ntụkwasịobi.
Ulo nlekọta anya ndi akpotara-akpota kwesiri inyecha ihe nile di mkpa nke na adighi n’ulo ochie esi na kpota ha.
Ịntanetị na-ejikọ akụkụ nke nkwukọrịta ọha na nkwukọrịta nke mmadụ abụọ.
Njirimara pụrụ iche nke Ịntaneetị na-eduga akụkụ agbakwụnyere n’usoro nke ojiji ya na usoro afọ ojuju.
Maka ọmụmaatụ, “mmụta” na “mkpakọrịta” bụ ndị atụnyere dịka mkpalite dị mkpa maka ojiji Ịntanetị (James na ndị ọzọ., 1995).
Eighmey na McCord(1998) chọpụtara na “nsonye” na “mmekọrịta ga-adịgịde” sokwa na ihe mkpali ọhụrụ mgbe ha nyochara mmeghachi omume ndị na-abịa n'ọtụtụ webụsaịtị.
Ojiji nke ndekọ vidio edugawo na ụmụ nchọpụta dị mkpa n’ime nkọwa nke nzipụta-n’ihu-kentakịrị, mmegharị ihu nke na-anọru milisekọnd ole na ole.
Akachasị ekwu na mmadụ nwere ike ịma mmgbe mmadụ na atụ asi ma ọbụrụ na onwere ike ịkọwapụta obere mmegharị ahụ dị iche iche ọfụma.
Oliver Saks, n'akwụkwọ ya Okwu Onyeisi Obodo, gosiri ka ndị enweghị ike ịghọta ọnụ okwu n'ihi isi mmebi nwere ike ikwu mgbe mmadụ na-ekwu eziokwu.
Ọ na-ekwu rịị na ikekwe ụmụ anụmanụ dịka nkịta ụlọ nwekwara ụdịrị ikikere a ịghọta omume mmadụ
Nnyocha na narị afọ nke iri abụọ egosipụtala na enwere ụdịrị genetik variyeshọn abụọ: nke zoro ezo na nke pụtara apụta.
Mgbanwe n'ọdịdị na-agbakwunye ọdịdị kejenetiki ọhụrụ, ma nhọpụta na-ewepụ ya n'ogwu ọdịdị nke a kọwapụtara.
Nkewa na ntughari nkpokorita nkeghari na azu n'etiti ọdọ mmiri abua ahu na ọgbọ o bula.
N'ime savanna, ọ bụ ihe siri ike na primate nwere usoro nri dị ka nke mmadụ iji mejupụta amino-acid chọrọ site na ihe ọkụkụ dịnụ.
Ọzọ dịka ibe ya, ị jụ ime ihe a nwere nnukwu ntaramahụhụ: nnukwu ndamụmbà, ọtịtaahụ, nakwa ọnwụ n'ikpeazụ.
Ihe akụrụngwa a na-enweta ngwa ngwa ga-abụrịrị protein ndị dị na akwụkwọ na legume gasị, mana ihe ndị a siri ike maka ndị nyiri mmadụ ndịọzọ bị n’ọhịa dịka anyị iji gbazèe ma anyị sie ya n’ọkụ.
N’aka ọzọ, nri anụmanụ arụrụ, ntanta, akwa) abughi naani di nfe, kama ha na-enye oke protein nke nwere amino acid nile di nma.
Eleghị anya, ya atụla anyị n'anya ma ọbụrụ na ndị nna nna anyi ji aka ha gboo "mkpa protin" ha n'usoro dị ka nke enwe bi n'ọhịa si eme taa.
Nkwụsịtụ ụra bụ usoro nke ịkpacharanya eteta ụra mgbe oge ị na-ehikarị ụra ma na-ada n’ụra mgbe obere oge gachara (nkeji 10–60).
Enwere ike ime ka n’uzo mfe site na iweta atanu ogbu-opi uzu ya dikariri nwayo ikpobata gi na uche kama ghara ikpotecha gi na-ozuzuoke.
Ọ bụrụ na ị hụtara onwe gị na-ewubergharị elekere gị n’ime nrọ gị, e nwere ike idobe ya n’akụkụ nke ọzọ nke ime ụlọ ahụ, na-amanye gị isi n’akwa bilie ịgbanyụ ya.
Ụzọ biorhythm ndị ọzọ gụnyere ịñụ oke ihe mmiri (karịsịa mmiri maọbụ tii, dayuretik a maara amaara) tupu arahụ ụra, na-amanye mmadụ ibili maka ịnyụ amịrị.
Ọ bụ ole udo nke obi mmadụ nwere na-emekọrịta na nchịkọta ihu na ole obimgbalielu nọ n'ime ahụ na mmụọ nke mmadụ.
Ka a na-ewetulata esemokwu ahụ, ka ike ndụ nọ ugbu a na-adịkwuo mma. Mmadu niile nwere ike mmepụta ịchọta udo zuru oke na afọ ojuju.
Mmadụ nile nwere ike ịma ihe. Sọ ohe nọchiri ụzọ bụ ekweghị ekwe nke anyi na ụjọ.
Buddhism ndị Tibet dabere n’ụmụ nkuzi nke Buddha, mana adọtịkwuru ha site n’aka ụzọ nke ihụnanya mahayana ya na site n’aka ọtụtụ usoro si na Yoga Indịa.
Na ntọala, Buddhism Tibet dị ezigbo mfe. Ọ mejupụtara Yoga Kundalini, ntụgharị uche na ụzọ nke ịhụnanya nnabata-ihe niile.
N’iji Yoga Kundalini ike Kundalini (ike mmepe anya) bụ nke etetara site n’ụmụ postchọ yoga, mgbatị ahụ iku ume, ukwe ntụgharị uche na ihe ngosi.
Nke bụ isiokwu ntụgharị uche nke ndị Tibet bụ Deyiti Yoga. Site na ichepụta chi dị iche iche, a na ehichapụta ụkpụrụ ike, kpọghee chakra ma kepụta owuweanya nke amamihe.
Jamini bụ ndị iro ọha n'Agha Ụwa nke abụọ, nke mere mba USA na USSR ji nwee mmekọ. Ka agha gwụrụ, esemokwu usoro omume, na omenala mere mba ndị ahụ ji nwee okwu.
N'etiti afọ abụọ nke nlụcha nke agha ahụ, ndị mba bụbu ndị mmekọrịta bụzi ndị iro ugbu a ma Agha Oyi ahụ bidokwara.
O kwesịrị ịnọru ruo afọ iri anọ na-abịa abịa ma a ga-alụkwa ya n'ezie, site n'aka ụsụụ ndị agha nnọchite, n'ama agha site n'Afrịka ruo Eshia, n'ime Afghanistan, Kiuba na ọtụtụ ebe ndị ọzọ.
Mgbe Septemba 17, 1939 ruru, a kutuola nchekwa ndị Poland; naanị olileanya ha nwere bụ ịlaghachi tụọ atụmatụ ọzọ n'akụkụ isi briij Romenia.
Mana, o gbughi oge ka atụmatụ a niile laa n'efu, mgbe ihe karịrị ndị Sọviet Yunịọn Red Amị 800,000 banyere, kepụta ogige agha ndị Belarụs na Yukren, ka ha wakpochara akụkụ ọwụwa anyanwụ Poland na nnupu isi nye Nkwekọrịta Udo Riga, Nkwekọrịta Udo Sọviet Yunịọn na Poland, na ọtụtụ nkwekọrịta ndị ọzọ, ma nke dị n'etiti mba abụọ, na nke dị n'etiti ọtụtụ mba.
Iji ụgbọ mmiri ebughari ngwa ahịa bụ ụzọ kachasị mma n'ezie iji buru ọtụtụ ndị na ọtụtụ ngwa gafee oke osimiri.
Ọrụ nke ndị agha nke mmiri abụrụla kemgbe ịgba mbọ hụ na mba gị jidesiri ike ikikere ibugharị ndị gị na ngwaahịa gị, ma n'otu mgbe ahụ, na-egbochi ikikere onye iro gị ibugharị ndị ya na ngwaahịa ya.
Otu n’ime ọmụmatụ oge na-etebeghị anya nke a kacha tozuo oke bụbu kampeenụ Ugwu Atlantik nke WWII. Ndị Amerịka nọ na-anwa ibugharị ụmụ nwoke na ngwongwo gafee Oke osimiri Atlantik inyere Britenụ aka.
N'otu mgbe ahụ, ndị agha nke mmiri nke Jamanị, n'iji naanị ụgbọokpurummiri, nọ na-agbalị ịkwụsị mkpọchi ụzọ a.
Ọ bụrụ na ndị mba bụbu ndị mmekọrịta dara, Jamanị nwere ike eleghi anya merie Briten dị ka o mere Yurop ndị ọzọ fọdụrụ.
Ewu yiri ka e buru ụzọ mee ya anụụlọ n’ihe ruru puku afọ iri gara aga n'ugwu Zagros nke Iran.
Omenala ndị mgbe ochie na agbụrụ bidoro iji dobe ha maka inweta ohere dị mfe na mmiri ara, ntutu isi, anụ, na anụahụ gasị.
E dobere n'ozuzu ụmụ ehu ụlọ n'ime ìgwè ndị nke pagharịrị n'elu ugwu ma ọ bụ ebe ịta ahịhịa ndị ọzọ, nke ọtụtụ mgbe bụ ndị ọzụzụ ehu na-elekọta ha ndị nke na abụkarị ụmụaka ma ọ bụ ụmụ ntorọbịa, nke yiri onye ọzụzụ atụrụ a ka mara ama. A ka na-eji usoro ọzụzụ ehu ndị a ruo taa.
E wuru ụzọ ụgbọ ibu gasị n’Ingland dị ka n'oge dị ka narị afọ nke iri na isii ahụ.
Agbanyeghị ụmụ ụzọwagọn nwere naanị ogwe osisi nọ n’akụkụ n’akụkụ, ha nyere ụmụ ịnyịnya na-esere ha òhèrè irute ekwomọsọ ndị karịrị ma sere ibu kara dị ukwuu karịa n’ụmụ ụzọ nke ụbọchị ahụ ndị karịtụrụ dị ike ike.
Ebidoro mgbe gboo were krọstaị na-arụ ụzọ ụgbọoloko ka o were gbasie ike. Obere obere a bịa mata na ụzọ ụgbọoloko ga-esikarị ike ma ọ bụrụ na o nweturu obere igwe n’elu ya.
Nke mechara bụrụ omume a na-emekarị, mana igwe ahụ kpatakwuru ndọwa n'ụkwụ ụmụ ụgbọ ibu ejiri osisi mee.
N'ikpeazụ, eji wiil ígwè dochie wiil osisi. N'afọ 1767, e wepụtara wiil nke mbụ ejị igwe rụọ kpam kpam.
Usoro njem e bu ụzọ mara ama bụ ịga ije, ụmụ mmadụ bidoro ịkwụ ọtọ aga ije afọ nde abụọ gara aga site na mpụta nke Homo Erektus (nke pụtara nwoke kwụ ọtọ).
Ndị bụ ha ụzọ, Ọstralopitekus ahụ akwụghị ọtọ gaa ije dị ka n'akparamagwa.
Achoputara ọkachamara bipedal na fosil Australopithecus site na nde nde afọ 4.2-3.9 gara aga, o bu ezie na Sahelanthropus nwere ike ije ije n'ukwu abuo na nde afọ asaa gara aga.
Anyị nwere ike malite ibi n’enyi karịa na gburugburu ebe obibi, anyị nwere ike isonye ije nke gburugburu ebe obibi, ma anyị nwekwara ike ịbụ ndị ọchọ mgbanwe ka e nwee ike belata ntaramahụhụ ọdịnihu ruo ogo ụfọdụ.
Nke a dị nnọọ ka ọgwụgwọ kemgbaàmà n’ọtụtụ okwu. Agbanyeghị, ọ bụrụ na anyị achọghị naanị ọsịsa nke nwa oge, ya mere anyị kwesịrị ịchọta isi ihe kpatara nsogbu ndị ahụ, ma anyị kwesịrị iwepụ̀ ike ha.
O doro anya nke ọma n'ụwa agbanweela nnukwu n'ihi ụmụ ọganihu nke sayensị na teknụzụ nke ụmụ mmadụ, ma ụmụ nsogbu adịla nnukwu karịa n'ihi ọnụọgụgụ mmadụ karịrị akarị na ibifụga ndụ ókè nke ụmụ mmadụ.
Mgbe Kọngres nyechara ya nkwekọrịta ha na Julaị 4, e weere ya n'akwụkwọ eji aka dee, nke Jọn Hankọk Onye isi Kọngres na Chals Tọmsin Onye odeakwụkwọ tinyere akara nkwado ha, wega ya n'ụlọ mbipụta Jọn Dunlap nke eteghi aka.
N'ime abali n'etiti mbipụta otu narị na iri ise ya na narị abụọ ka e mere, nke a mara ugbu a dị ka “Dunlap broadsides”.
Oge mbụ a gụpụtara edemede a n'ọha bụ na Julaị 8, nke John Nixn gụrụ na mbaraezi Ụlọọgbakọ Ndipenda.
Na Julaị 6, e zigaara George Washington otu kọpị, onye mere ka a gụọrọ ya ndị agha ya na Niu Yọk na Julaị 9. Otu kọpị ruru Lọndọn n'Ọgọstụ 10.
Dunlap brọdsaịd 25 ka nọ taa bụ kọpị edemede izizi ndị kachasị dị ochie. Nke izizi e ji aka dee anọzighi.
Ọtụtụ ndị ọkàchamara ihe banyere fọsịl anụmanụ na osisi taa kwenyere na otu òtù daịnosọọ lanarịrị ma dị ndụ taa. Anyị na-akpọ ha ụmụ nnụnụ.
Ọtụtụ ndị mmadụ anaghị eche bayere ha dị ka daịnosọọ n'ihi na ha nwere nku ma nwee ike ife efe.
Mana a ka nwere ọtụtụ ihe gbasara ụmụ nnụnụ ndị yiri nke daịnosọọ.
Ha nwere okpa ya na abuba na mbu aka, ha na eyi akwa, ha nakwa aga ije na ukwu oji ha abuo dika T-Rex.
Ihe dịka igwe kọmputa niile e ji arụ ọrụ taa bụ ihe sitere na mkpụrụokwu ndị a gwakọrọ agwakọ nke e tinyere dịka mkpụrụọnụọgụ.
Otu akara ọnụọgụ abụọ nwere ike inwe naanị otu n’ime mbamuru abụọ, ya bụ 0 ma ọ bụ 1, ma a na-akpọ akara ndị a dị ka ọnụọgụ keọnụọgụ abụọ - ma ọ bụ bits, iji asụsụ mpụiche kọmputa.
Ọrịa ịtụ nsị nke ime ahụ nwere ike ọ gaghị adị ire ozigbo. Ihe ngosipụta ya, dịka ọgbụgbọ, bụ ihe ndị na-emekwa n'ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ. Ya mere na enweghi ike ịchọpụta ọrịa a ozigbo ozigbo.
Ndosipụta kachasị mma maka inwe ńsí n’ime ahụ nwere ike ịbụ ọnụnọ nke mkpọ ogwụ ghe oghe ma ọ bụ kemikalụ ezinụlọ ndị na-egbu agbu.
Lelee nnyeàhà ahụ maka ntụziaka mgbata ọsọ enyemaka mbụ akọwapụtara maka nsi ahụ akọwapụtara.
okwu bụ ahụhụ bụ ndị ọka mmụta ahụhụ n’ụzọ nwere ugwu maka òtù ụmụ ahụhụ a.
Okwu a sitere mmarita mgbe-ochie nke akpiri, bu chinchi di oke nko maka ibunye ndi mmadu oria.
Ma Assassin-bọg na Bed-bọg dị nidikolous, ha zuru oke ibi na nest maọbụ n'ụlọ nke hostu ha.
N'ofe mba Amerịka, e nwere ihe dị ka ọnụọgụ ọrịa Multiple Sclerosis (MS) 400,000 a maara amaara, nke na-eme ya isi ọrịa ụbụrụ na-emetụta ndị ntorọbịa na ndị okenye.
Mọltipụl Sklerosis bụ ọrịa na-emetụta sentral navọs sistem, nke gbakwunyere ụbụrụ, ogwurugwu azụ na ọptik nav.
Nnyocha achọpụtala na ụmụ nwanyị bụ ihe yikarịrị ugboro abụọ inwe MS karịa ụmụ nwoke.
Di na nwunye nwere ike ikwekọrịta na ọ gaghị abara ha maọbụ nwa ha uru ịzụpụta nwa.
Di na nwunye ndị a nwere ike ịhọrọ ime atụmatụ mkpọta nwa maka nwa ha.
N’ime otu mkpọRọ nwa, nne na nna mụrụ nwa ahụ ga-akwụsị ikikere ha dị ka nne na nna ka di na nwunye ọ bụla nwere ike izulite nwa ahụ.
Isi ọrụ sayensị bụ ịchọpụta otu ụwa si arụ ọrụ site na usoro kesayensị. Usoro n'ezie na-edu ọtụtụ n'ime nnyocha kesayensị.
Ọ nọghị naanị ya n'ezie, eksperimenteshọn, ma otu eksperimenti bụ otu ule nke eji ewepụ otu haịpotesis kwere omume ma ọ bụ karịa, ịjụ ajụjụ gasị, na ime nyochata nakwa eduzi nnyocha sayensị.
Ndị ọkammụta n'ụmụ ihe ekere na ndị ọkachamara gbadoro ụkwụ n'ederede oge gboo, ọkachasị, n'akwụkwọ nsọ e dere na Latin.
A nabatara echiche Aristotle gbasara okwu sayensi niile ma mmuta akparamagwa ya bu psychology
Dika amamihe nke ndi Greek biara gbatuwa, ndi odida anyanwu huta onwe ha ka ha na egbubiri site mgbara-ogwu ndi Greek ha nke ihe-omuma na nka.
Ọtụtụ usoro a na-ahụ na fisiọlọji na omume na-adabere ọtụtụ mgbe n'usoro ime ahụ na mmepụta ha site n'elekere nke ime ahụ.
Usoro kwa-oge kwa-oge, nke n'abụghị nzaghachi nye ntụpenye kwa-oge keezi, ka edeturula maka ọtụtụ ihe ndị dị ndụ , nke gụnyere nje bakterịa, fọngaị, akụmakụ na ụmụanụmanụ.
Elekere ime ahụ nwere usoro eje alọ nke na-arụ ọrụ n'onwe ya; usoro a ga na-aga n'ihu ma asịgodị rịị na onweghi ihe ọzọ metụtara ya.
Nwale Hershey na Chase so na otu aro no na isi siri na DNA wubu otu mkpụrụ ndụ ihe nketa.
Hershey na Chase jiri ụmụ feeji, ma ọ bụ ụmụ nje, iji kụnye DNA nke ha n'ime otu nje bakterịọm.
Ha mere nnwale abụọ ebe ha ji rediyoaktiv fosforọs kaa akara na DNA nọ na fej maọbụ jiri rediyoaktiv sọlfọ kaa akara na protin nọ na fej.
Mgbanwe ọjọọ nwere ike inwe ọtụtụ mmetụta dị iche iche na ndabere na ụdị mgbanwe ọjọọ ọ bụ, abamuru nke otu iberibe nke ihe mkpụrụ ndụ ihe nketa o metụtara na ma ọ bụrụ na ụmụ mkpụrụ ndụ o metụtara bụ ụmụ mkpụrụ ndụ geem-laịnụ.
Ọ bụ nanị mgbanwe na mkpụrụ ndụ jem-laịn ka a ga-enyefe ụmụaka, ebe mgbanwe n’ebe ndị ọzọ nwere ike ibute ọnwụ nke mkpụrụ ndụ maọbụ ọrịa kansa.
Njem-nlere anya nke dabere na udidi na enweta uche ndi mmadu ndi nwere mmasi izute ebe di na udidi ha maka ihi ikpori-ndu na udi ebe, gunyekwara akumaku anumanu anu-ohia.
Ụfọdụ ihe omume enwere ike ime ma anọrọ ya gụnyere ịchụ nta, ịkụ azụ, ise foto, ilele nnụnụ, na ịga n'ogige gụọ maka ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha.
Otu ọmụmaatụ bụ ileta, ise fòto, na ịmụta gbasara na ụmụ ọrangụtanụ nọ n'ime Bọnioo.
Ututu o bula, ndi mmadu n'ahapu obere obodo n'ugbo ala were gawa ulo oru ha ma ndi ozo n'agbafe ha ndi ulo oru ha di n'ebe ha si puta.
N'ime ụgbọ mgbagharị kenjem a na-agbanwegharị agbanwe onye ọ bụla si n'otuọdịla metụta ya, ma na-akwado, otu sistemụ njem dabere na ụgbọala nkeonwe.
Sayensị na-egosi ugbu a na ekọnọmi a ji oke kabọn arụ ọrụ akupụla mkpokọta ihe ndụ niile nọ n'ụwa site n'otu n'ime ọnọdụ nkwụsi ike ya nke kwadogoro obibi ndụ mmadụ n'afọ nde abụọ gara aga.
Onye ọ bụla na-esonye n'ime ọha mmadụ ma na-eji ụmụ sistemụ njem. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ onye niile na eme mkpesa gbasara ụmụ sistemụ njem.
N'ime ụmụ mba mepere emepe ọ ga-ara ahụ tupu ị nụ larịị mkpesa ndị yirinụ gbasara ogo mmiri ma ọ bụ ụmụ akwa mmiri na-ada n'ala.
Gịnị mere sistemụ njem ji akpata ụdịrị ụmụ mkpesa ahụ, gịmị mere ha ji ada kwa ụbọchị? Ọ bụ na ndị injinịa njem amaghị arụ ọrụ ha nke ọma? Ma ọ bụ ihe ọzọ si n'isi na-eme?
Ọwụwụ trafik bụ ọmụmụ nke ngagharị nke onye ọkwụ ụgbọ ọ bụla na ụgbọ ha n'etiti akara abụọ na mmekọrịta ha na-eme n'etiti onwe ha.
Na mwute, ịmụ maka otu okporo njem si aga siri maka na e nweghi ike ikwu kpọm n'ọgụ otu narị pasentị ụdị omume ọkwọ ụgbọ nwere ike ime.
Ọ dabara nke ọma na ndị na-anya ụgbọ ala nwere usoro omume na-adịgide; ya mere, ụzọ njem moto anaghị agbanwecha agbanwe ma bụrụkwa ihe enwere ike iji eserese aritmetik gosipụta.
Iji ka mma na-anọchi anya ije nke okporo ụzọ, E mebewo mmekọrịta n'etiti isi njirimara atọ ahụ: (1) eruba, (2) njupụta, na (3) ike ọsọ.
Mmetụta ndị a na-enyere aka n’ime atụmatụ, ncheremee, na arụmọrụ nke akụrụngwa okporo ụzọ ụgbọ ígwè.
Ụmụ ahụhụ bụ ụmụ anụmanụ buru ụzọ fee n'elu. Ike ha n'ife efe nyere ha aka ịgbanaha ndị iro n'ụzọ kara dị mfe ma ịchọtakwa nri na ndị otu mmekọ n'ụzọ dị werewere.
Ihe karịrị ọtụtụ n’ime ụmụ ahụhụ nwere uru nke inwe ike ịpịa nku ha gaa n’ahụ ha.
Nke a na-eme ka ha nwee ọtụtụ ebe izonarị ndị na-eri ha.
Ubochi taa, nani ogugu nwere ike ikpalaga nku ya azu bu ogugu drago na ogugu may.
Ọtụtụ puku afọ gara aga, otu nwoke a kpọrọ Aristarchus kwuru si na Usoro Mbara Igwe nọ na-agagharị gburugburu Anyanwụ.
Ufodu ndi mmadu chere na ihe o na-ekwu bu eziokwu mana ufodu ekweghi; na mbara igwe na-agba uwa okirikiri ma anyanwu(ma kwa kpakpando ndi ozo)
Nke a yiri ezi uche, n’ihi na ọ naghị emetụta ka ụwa ọ na-agagharị agagharị, ọ na-emetụta?
Osimiri Amazọn ahụ bụ nke abụọ kachasị ogologo na osimiri kachasị n’ibu n’ụwa. Ọ na-ebu ihe karịrị nha mmiri ugboro asatọ dị ka osimiri nke abụọ kachasị ibu.
Amazọn bụkwa osimiri kachasị saa mbara n'ụwa, mgbe ụfọdụ ọ na-eru maịlụ isii.
Pasentị mmmiri 20 zuru oke nke na-awụpụta site na osimiri ụwa ga na-abanye n'ime oke osimiri ga si n'Amazọn abịa.
Isi osimiri Amazọnụ dị km 6,387 (maịlị 3,980). Ọ na-ewetaju mmiri site n’ọtụtụ puku osimiri ndị kara di obere.
Agbanyeghị na ọrụrụ-piramidi n’okwute gara n’ihu ruo na njedebe nke Alaeze Ochie, ụmụ piramidi nke Giza bụ ndị agafeghị ma ọlị na nha ha na ima mma nka na ụzụ nke ọrụrụ ha.
O juru ndị Niu Kịngdọm Ijipt mgbe ochie anya ihe ncheta ndị bu ha ụzọ, nke gaferela otu puku afọ mgbe ahụ.
Onu ogugu ndi mmadu obodo Vatican di nari 800. O bu obodo kacha nta n’uwa n’uwa n’uwa na obodo n’ogbe ndi kacha pere mpe.
Obodo Vatican na-eji asụsụ Italian na iwu na ukara nkwukọrịta ya.
Asụsụ Itali ka ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ na steeti na-asụkwa kwa ụbọchị ebe a na-asụkarị Latin n’emume ndị ụka ga.
Ndị obodo niile nke Obodo Vatican bụ Roman Katọlik.
Ndị mmadụ amarala maka isi kemịkalụ njìmebe ndị dị ka ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa sitere na oge ochie, dị ka enwere ike ịchọpụta ihe ndị a n’ụwa n’ụdị mbupụtaụwa ma dịrị mfe igwupụta n’iji ngwaọrụ ndị mgbe ochie.
Aristotle, bụ onye ọka ihe ọmụma, ekwuola na tiori na ihe niile bụ mgwọkọta njimebe otu ma ọ bụ karịa mejupụtara ya. Ha wụbụ aja, mmiri, ikuku, na ọkụ.
Nke a dị kara yiri ọnọdụ anọ nke mata (n’usoro ahụ kwa): nsiriike, mmiri mmiri, ikuku, na plasma, agbanyeghị na o nyere tiori na ha na-agbanwe ghụọ umi ọhụrụ iji mepụta ihe anyị na-ahụ anya.
Ụmụ alọị bụgodu mwurikọta ígwè abụọ ma ọ bụ karịa. Echefula na e nwere ọtụtụ njìmebe nọ na tebụlụ pirịọdik.
Ihe ndị dị ka kalsium na potassium bụ igwe. Ee, enwekwara igwe ndị ọzọ dịka ọla ọcha na ọla edo.
I nwekwara ike nwee allọyi nke gụnyere nwa-obere njieme gasị nke enweghị metalik dịka cabọn.
Ihe niile dị na elu ụwa a nwere mata. Mata niile bụ njikọ ọtụtụ obere ihe a na-akpọ atọm.
Atọm pere nnọọ mpe ruo na puku ijeri ga-abali n'ime akara kpọm nọ na ngwụcha okwu a.
Ya mere, pensụl ahụ wụbụ ezigbo enyị nye ọtụtụ ndị mmadụ mgbe ọ pụtara.
Ọ bụ ihe mwute na ka ụzọ ọhụrụ e si ede ihe na-apụta, 'ọkwa', mkpịsịodee ọkpọọ bụzi ihe a tụlagara n'akụkụ anaghịzikwa eji ya ede ihe mgbe niile.
Ndị mmadụ na-edezi ozi na ihuenyo kọmputa gasị, o nweghị mgbe ha na-enwe ịbịaru nso na otu ọmụ nkọ.
Mmadụ ga na-atụ naanị n’uche ihe kiibọọdụ ga-abụzi mgbe ihe kara dị ọhụrụ bịaziri.
Bọmbụ fishọn ahụ na-arụ ọrụ n’iwu na ọ na ewere ike ijikọta otu nuclus ya na ọtụtụ protọnụ na nutrọnụ.
Dika ibinggasi ugbo-ala nke di elu.Nkewa dị na etiti na elụ wee wepụta ike ụfọdụ.
Ụfọdụ atọm nwere nukei na-anọsighị ike nke pụtara na ha na-agbajikarị n'iji obere ma ọ bụ n'enweghị akwamaka.
Elu ọnwa bụ ụmụ okwute na ájá mejupụtara ya. Mkpuchi mpụga ọnwa ka a na-akpọ krọstụ.
Crọstụ ahụ dị ihe dị ka km70 n'ịgba agba n'akụkụ ya dị nso na km100 n'ịgba ịgba n'akụkụ ya tere anya.
Ọ kara taa ahụ n'okpuru marịa ma kara gbaa agba n'okpuru ụmụ ala ugwu ugwu ahụ.
E nwere ike nwekwuo marịa ọzọ n'akụkụ ya dị nso n'ihi na krọstụ ya kara taa ahụ. Ọ kara dịrị mfe maka lava ịrịgote n'elu ya ahụ.
Tiori ndịnà bụ ndị a gbadoro anya ha ịchọta ihe na-eme ndị mmadụ kpaa agwa ha na-akpa ma ọ bụ ihe na-amasị ha.
Tiori ndị a na-ekwu na ndị mmadụ nwere mkpa ụfọdụ na/ma ọ bụ ọchịchọ nke ndị e chechala ma tinye n'uche dị ka ha na-etozuru ntorọbịa.
Tiori ndị a na-eleba anya n'ihe gbasara ụfọdụ ndị mmadụ nke kpatara ha ji achọ ihe ndị ha chọrọ na kedu ụmụ ihe nọ na gburugburu ebe obibi ha ga-eme ha mee ma ọ bụ emela ụfọdụ ihe.
Uzo-echiche ihe-di_n’ime abuo ama ama bu uzo-echiche ogogo nke mkpa nke Maslow na uzo-echiche ihe abuo kpatara nke Hertzberg.
Ikwu n'izugbe, akparamaagwa abụọ nwere ike ịpụta dịka ndị nlekọta na-amalite idu ndị ọgbọ ha ochie. Otu mpaghara n'echiche ahụ bụ "ịgbalị ịnọrọ dịka otu n'ime ụmụokorọbịa" (maọbụ ụmụagbọghọbịa).
Ụdịrị onye njikwa a nwere ihe isi ike ime mkpebi ndị amasịghị, ime omume ndị ịdọ aka na ntị, ụmụ nnyocha arụmọrụ, ikenye ibu ọrụ, na ijide ndị mmadụ maka ịza ajụjụ nke ọrụ ha.
Na njedebe ọzọ nke ụdị ahụ, otu onye ahụ ga-aghọ wụrụ mmadụ a na agali amata nke na- eche na ọ ga-agbanwerịrị ihe niile otu ahụ na- eme ma mee ka ọ bụrụ nke ha.
Kaosiladị, onye ndu ahụ bụ ya ka ọ dịịrị n'ikpeazụ ịhụ maka ọdịmma na ọdịda nke òtù ahụ.
Omume a ọtụtụ mgbe na adapụta n'esemokwu n'etiti ndị isi na ndị òtù ndị ọzọ fọdụrụnụ.
A na-ebugowe otu egwuregwu ndị a na-ejighi n'aka n'otu ụdị ụkpụrụ mmapụrụiche dịka otu egwuregwu ndị nke a ma ama, mana ndịiche dị n'etiti ha nke n'eweghi anya.
Ndịòtù òtù kedịnuche na-arụkarị ọrụ dị ka ebe nzute mbụ maka òtù ozugbo ha keanahụanya.
Ha na enwekwuru ikike ichoro onwe ha karia ndiotu otu ha na ha dika otu ha nwere ike izute na-ndabere n’oge na-adi iche iche nke obodo ha nwere ike njikwa obodo ha agaghi aghota ya.
Ọnụnọ nke otu "òtù anaghị ahụ anya" n'ezie (Larson na LaFasto, 1989, p109) bụkwa otu ǹsòmebe pụrụ iche nke otu òtù kendịnuche.
“Òtù anaghị ahụ anya” ahụ bụ òtù njikwa nke onye ọ bụla n’ime ndịòtù ahụ na-ekpesa. Òtù anaghị ahụ anya ahụ na-ewube ọkọlọtọ maka onyeòtù ọ bụla.
Gịnị mere otu ụlọọrụ ga-achọ ịgafe n'ime usoro na-egbu oge nke iwube otu ụlọọrụ ọmụmụ? Otu ebumnobi maka itinye echiche ọmụmụ keụlọọrụ n'ime ọrụ bụ nkepụta ihe ọhụrụ.
Mgbe e tinyere ngwaọrụ niile dị adị n’ọrụ n’ụzọ bara uru n’ime ngalaba niile na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ ọbụla, nrụpụta ihe na amamihe pụrụ iche ga-enwe ike puta ihe.
N'ihi nke a, usoro nke otu ụlọọrụ ịrụkọta ọrụ ọnụ iji merie otu ihe mgbochi nwere ike idunyeru otu usoro nkpepụta ihe ọhụrụ iji jee ozi nke mkpa onye ahịa.
Tupu ulo-oru obula enwee ike idi n’eweputa uche-ohuru, nduzi aghaghi ikepuya omenala uche-ohuu dika kwa nkerita nghota na imu ihe nke ulo-oru.
Angel (2006), kowara ukpuru nke agamnihu dika omume nke ejiri nyere otutu ulo-oru aka iru ogo di-elu nke iruputa ihe.
Ozi ihe-omumundu-banyere-uburu ewetala akaebe ana ahu anya maka usoro kowaputa nye nyocha nke nkota. Nihi ya obelatala ogbe nchoputa ma mee ya kpom-kwem nke ukwu karia.
Mmekọrịta n’etiti patọlọji ụbụrụ na omume kwadoro ndị ọka mmụta sayensị na nnyocha ha.
Obu ihe ama-ama site na mgbe di anya na otutu mmeru-ahu uburu, mmeru-ahu uche , mmeru-ahu nke ahu, na otuto nke uburu n’emututa akparama-agwa ma kpatakwa mgbanwe na oru oburu ufodu.
Mmụbanye nke ụmụ teknụzụ ọhụrụ na-enye anyị ohere ịhụ ma nyochaa ọdịdị na arụmarụ ụbụrụ nke a na-ahụbeghị mbụ.
Nke a na-akuziri anyị ọtụtụ ihe ma na-enye anyị ihe anyị ji arụ oyiri ya nke na-enyere anyị aka ịghọta usoro n'uche anyị.
Agbanyeghị na AI na-ada ka ihe gbasara akụkọ ifo sayensị, AI bụ ngalaba dị oke mkpa na sayensị kọmputa, nke gbasara etu igwe si eme omume, amụta ihe ma na-agbanwe dabere n'ihe ọ mụtara.
Nchọpụta na ngalaba AI gụnyere ịmepụta igwe ndị ga na-arụ ụmụ ọrụ ndị na-achọ amamihe nwere usoro.
Ọmumatụ gụnyere njikwa, ịtụ arọ na ịhàzi oge, ike ịza ụmụ nchọpụta ọrịa na ajụjụ onye ahịa, ya na ịmata aka odide, olu na ihu.
Ụdị ihe ndị ahụ aghụọla nkebi ọzụzụ ndị iche, nke na-agbado anya na-enye ụmụ azịza maka ụmụ nsogbu keụwa dị ire.
Ukpuru nke AI ahu buzi nke ana etinyezi ugbua n’ihe banyere aku-n’uba, ogwu, ikpu-uzu na ndi-agha, dika arunyere n’ime ututu igwe komputa digasi iche-iche ndi ana eji n’ulo ya na ihe ntinye ihe egwuregwu onyonyo.
Njem fild bụ otu nnukwu akụkụ nke klaasị ọ bụla. Ọtụtụ mgbe ọ na-amasị otu onye nkuzi ịkpọrọ ụmụ akwụkwọ ya gaa ebe ndị njem bọọsụ esoghị na nhọrọ ya.
Nka na uza n’enye igbo-mkpa nke ime jem site ihu-nanya. Umu-akwukwo nwere ike ilele ihe ngosi n’ulo ngosi, zute ebe izu-azu maobu gosi mmasi nye oru nka dika ha no-odu n’ogige ulo-akwukwo ha.
Ịkekọrịta njem site na kọmputa bụkwa otu ụzọ dị mma iji chee echiche na njem ma kekọrịta ahụmahụ nye klas ndị nke ọdịnihu.
Na imaatu, kwa afo umu-akwukwo sitere Ulo-akwukwo Bennet di na mpaghara ugwu Carolina na aruputa otu websaiti banyere njem ha na Isi Obodo, kwa afo aga arozihari websaiti a, mana aga edowe udidi ochie ya na ikuku iru oru dika akwukwo-efu.
Ụmụ blọọgụ nwerekwara ike inye aka imelite ederede nwa akwụkwọ. Dị ka ụmụ akwụkwọ na-ebidokarị ahụmihe blọọgụ ha n'iji ụtọasụsụ na nsụpe na-adịghị nke ọma, ọnụnọ nke ndị nkiri na-agbanwekarị nke ahụ.
Ebe ọ bụ na ụmụ akwụkwọ na-abụkarị ndị nkiri kachasị mkpa, odee blọọgụ ahụ na-amalite ịgbalị imelite odide ya iji zere nkatọ.
Nakwa ime blọọgụ "na-akwanye ụmụakwụkwọ ịmatakwu ihe gbasara ụwa gbara ha gburugburu." Mkpa nke ịkwalite mmasị nke ndị nkiri na-akpali ụmụakwụkwọ inwe amamihe ma na-adọrọ mmasị (Toto, 2004).
Ide blogu bu ngwa oru na akpalite mmekorita, o na akwadokwa umuakwukwo ka ha gbatiaa mmuta ha karia mmuta n’ulo akwukwo.
Ojiji kwesịrị ekwesị nke ụmụ blọọgụ "nwere ike inye ụmụ akwụkwọ ike iji dịkwuo na kennyocha na ichekwu echiche; site n'ịza ọsịsọ n'ụmụ ihe ịntaneet, ụmụ akwụkwọ nwere ike ịkọwa ọnọdụ ha na nghọta nke ụmụ ederede ndị ọzọ ya na kwupụtachaa uche onwe ha n'ụmụ nsogbu pụrụ iche (Oravec, 2002).
Ottawa bu isi obodo mara mma, nwere asusu abuo nke Canada ma nwekwa galari nka na ebe ngosi nka di iche iche n’egosiputa Canada n’oge gara aga ma n’oge ugbu a.
Igakwuo ndida bu Mkpoda-mmiri Niagara ma mpaghara ugwu bu ulo nye nma udidi na emetubeghi aka nke Muskoka ma gafere.
Ihe ndị a niile na ọzọ na-egosipụta Ọntario dị ka ihe echere na ọ bụ site n'ogo kachasị zuo oke Ndị Kanada site n'aka ndị ọbịa.
Ebe ndị buru ibu na ngapụga ugwu bụ ọzara nke obere ndị mmadụ bi ma ụfọdụ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebe ndị mmadụ ebighị.
Otu ntule ọnụ ọgụgụ na-agbagwoju ọtụtụ ndị mmadụ anya: Ndị isi ojii amerịka bi na mba Amerịka karịrị ndị Kanada bi ebe ahụ n'ọnụ ọgụgụ.
Obodo-akuku-mmiri nke ndi Owuwa-anyanwu Africa di na Osimiri India na opupu onu mmiri owuwa-anyanwu Africa.
Madagaaka kachasị buo ibu, ma bụrụkwa kọntinentị nọọrọ onwe ya ma a bịa n'ihe gbasara anụmanụ ndị bi n'ọhịa.
Ọtụtụ agwaetiti ndị ka obere bụ mba ndị kwụụrụ onwe ha, maọbụ nọrọ na njiko ha na France, ndị a makwaara dịka rezọt ọnụ osimiri bu ebe mkporindụ.
Ndị Arabụ wetekwara okpukpere Alakụba n'ala ndị ahụ, ma a nabatara ya nke ukwuu na mba Komoros na Mayọtụ.
Ike onwunwe ndị Yurop ọchịchị ala ọzọ bidoro n’ime narị afọ nke iri na ise, dị ka one ngagharị one Pọtugalụ Vasco da Gama chọtara Ụzọ Kepụ site na Yurop ruo Indịa.
N'akụkụ ugwu, Sahel gbara mpaghara a ogige; na ndịda ma n'ọdịda anyanwụ, Oke osimiri atlantik gbara ya ogige.
Ụmụ nwanyị: Ọ bụ ihe akwadoro na ndị njem nwanyị ọ bụla kwuo na ha alụọla dị, n'agbanyeghị etu ọnọdụ ha dị n'ezie.
Ọ na-enyekwara aka ịgba otu ọlaaka (naanị ọ bụghị nke yiri ka ọ dị oke ọnụ).
Ụmụ nwanyị kwesịrị ịghọta na ndịiche omenala nwere ike ịkpata ihe ha ga-ewere dị ka ịchọ okwu ma ọ bụghị ihe a na-ara ahụ ịhụ isoro gị, ijide site n'aka, dgz.
Guzosie ike n'ịsị ụmụ nwoke mba, ma atụla egwu ịkwechiri (na-agbanyeghi ọdịnala ọbụla nke ọ bụ, o kwesighi ekwesi!).
Obodo nke Casablanca nke ugbu a bụ Berber fishermen wubere ya na BCE narị afọ nke iri, ma ndị Phoenicia, Rome, na ndị Merenid jiri ya dị ka ọdụ ụgbọ mmiri dị oke mkpa akpọrọ Anfa.
Ndị Pọtụgaalụ bibiri ya ma rụgharịa ya n’okpuru aha Casa Branca, naanị ịgbahapụ ya mgbe otu ala ọma jijiji mechara n’ime 1755.
Sọltan Ndị Moroko ahụ rụgharịrị obodo ahụ dị ka Darụ-I-Badya ma e nyere ya aha Casablanka site n'aka Ndị Spen na-azụ ahịa ndị wubere isi ebe ndị a na-ere ahịa ebe ahụ.
Casablanca bụ otu n'ime opekata mpe ebe na-adọrọ mmasị ịzụ ahịa na Morocco niile.
Gburugburu Medina ochie ahụ ọ dị mfe ịchọta ebe ndị na-ere ụmụ ngwaahịa ọdịnala Ndị Moroko, dị ka ụmụ tagịnị, ite akpụrụ akpụ, ngwaahịa ejiri akpụkpọ anụ mee, huuka, na giigawụ nke ụdịdị dị iche iche zuru ezu, mana ha nille bụ maka ndị nleta.
Goma bụ obodo nleta nke Democratic Replublic nke Kongo n'ime akụkụ ọwụwa anyanwụ kachasị anya na nso Rwanda.
N'afọ 2002, ebibiri Goma site n’aka lava si na ugwu ọkụ Nyiragongo nke liri ọtụtụ n'okporoama obodo, ọ kachasị etiti obodo.
Dịka Goma nwetụrụ nchekwa n’ụdị dịtụ mma, nleta ọ bụla na mpụga Goma bụ nke ekwesịrị inyocha iji ghọta ọnọdụ nke ọgụ ka nogidesiri ike n’Ugwu ngalaba ọchịchị kizu.
Obodo ahụ bụkwa ntọala ịrị ugwu mgbawa Nyiragongo tinyere ụfọdụ nsochi Ọzọdimgba Ugwu dịchasị ọnụ ala n'Afrịka.
Ị nwere ike iji boda-boda (tagzi ọgba tum tum) ịga gburugburu Goma. Ọnụahịa nkịtị (ebeụlọ) bụ Francs Ndị Congo ~500 maka ọkwụkwọ dị mkpirikpi.
Tinyere na ira-ahu na nweta ya karia ibe ya, "Timbuktu" aburula ihe eji ama-atu maka ala ndi di anya, di oke-onu.
Taa, Timbuktu obodo agụọ na-egbu, agbanyeghị n'ugwu ya na-eme ya otu ndọta ndị nleta, na o nwere otu ọdụ ụgbọelu.
N'afọ 1990, e debanyere ya n'etiti ebe ọpụrụiche n'ụwa ndị nọ na nsogbu mkpochapụ, maka nsogbu aja si n'ọzara.
Ọ bụ otu isi nkwụsịtụ n'oge Henry Louis Gates Ihe-ebube pụrụ iche PBS nke Ụwa Afrịka.
Obodo ahụ dị n'ọdịiche kachasị ya n'ụmụ obodo nke mba ahụ fọdụrụnụ, n'ihi na o nwere karịa mmasị nke Arabik karịa otu Onye Afrịka.
Obianụọhịa Kemba Kruger (KNP) nọ n'ebe ugwu-ọwụwa anyanwu nke South Afrịka ma nọrọ ogologo ókè ahụ nke Mozambik n'ime ọwụwa anyanwụ, Zimbabwe n'ime ebe ugwu, na ókè ebe ndịda ahụ bụ Osimmiri Agụiyi.
Ogige a ruru 19,500 km² nakwa ekewara ya n'ụzọ mpaghara ecozone 14, ebe nke ọbụla na-akwado ụdịrị anụ ọhịa dị iche.
Ọ bụ otu n’ime nke isi ihe ndọta nke Ndịda Afrịka ma a na-ewe ya dị ka nke kacha mma nke Ebennọkọta Nkeobodo (SANParks) Ndịda Afrịka.
Dịka o si adị n'ogige mba niile nọ na Sawụtụ Afrịka, e nwere ụgwọ nchekwa n mbanye a na-akwụ kwa ụbọchị n'ogige a.
O nwekwara ike iba uru ka mmadu gote Kaadi Ohia nke ga-enye gi ikikere iji banye na ogige ahoputagoro na South Africa ma o bu na Ogige Kemba South Africa niile.
Ọ bụ site na Agwaetiti Họng Kọng ka mpaghara Họng Kọng nwetara aha ya; Ọ bụkwa ebe a ka ndị njem nlereanya na-ahụta dịka ebe kachasị mkpa.
E jirila ụmụ ogologo ụlọ elu na-achọ igwe Họng Kọng mma maa atụ na ha yiri eserese baa chat, nke mmiri Viktoria Habọ mere ka ọ pụta ihe.
Ịhụta Họng Kọng n'ụzọ kachasị mma, pụọ n'agwaetiti gawa na Kowloon, mpaghara akụkụ mmiri, nke chere gị ihu.
Oke ihe ka n'ọnụ ọgụgụ n'ime mmepe obodo nke Agwaetiti Hong Kong jupụtara n'ọnụ na ala a napụtara na mmiri dị n'ogologo ụzọ nke ugwu akụkụ oke osimiri.
Ebe a bụ ebe ndị nchịkwa mba si Britenụ were dịka nke ha ya mere ọ bụrụ na ị na-achọ maka akaebe nke nchịkwa ókèala ahụ gara aga, ebe a bụ ebe dị mma ịmalite.
Ebe Sundarbans bụ ebe ala nwere ọhịa mmiri nọ n'akụkụ mmiri kachasị ukwuu n'ụwa dum, na-agbatị ruo kilomita 80 (50 mi) n'ime n'ala Bangladesh na India ahụ nke amaghị ama site n'ụsọ osimiri.
E kwupụtawo na Sundarbans bụ otu Ebe Nketa Keụwa UNESCO. Akụkụ nke oke ọhịa n'ime ókèala nke Indịa ka a na-akpọ Obianụọhịa Kemba Sundarbans.
Ọhịa ndị a abụghịkwa sọọsọ apịtị mangrov dị na ha – ha gụnyekwara ihe ndị ka fọrọ site n'oke ọhịa ndị juburu Ala nọ na mpaghara Ganjiz.
Sundabans kpuchiri ohere km² 3850, nke mmiri maọbụ ala apịtị kpuchiri otu ụzọ n'ụzọ atọ ya.
Ka mgbe 1966, ka Sundarbans ji buru ebe obibi nso anu ohia ana asi na aga enwe ihe dika 400 Royal Bengal tiger na ihe dika 30,000 mgbada nwere ntupo na mpaghara ebe ahu.
Bọọsụ na-esi n'ọdụ ụgbọala njikọ-mpaghara apụ (n'ofe osimiri ahụ) mgbe niile n'ụbọchị, agbanyeghị na nke kacha, tụmadị ndị ahụ na-aga n'ebe ọwụwaanyanwụ na Jakar/Bumthang na-apụ n'etiti 06:30 na 07:30.
Dị ka ụmụ bọọsụ njikọ-mpaghara na-ejukarị eju, ọ bụ ezi ndụmọdụ ịzụta otu tiketi ụbọchị ole na ole n'ọdịnihu.
A na-ejere imirikiti mpaghara ozi site n'ụmụ Nnukwu Bọọsụ nke ndị Japan, nke dị mma ma sie ike.
Tagzi ekere eke bụ ụzọ dị ọsịsọ ma maa mma iji gaa ebe dị nso, dịka Paro (Nu 150) na Punakha (Nu 200).
Akwammiri Osimiri Oyapock bụ otu akwa mmiri ejiri kebùl runye ya. Ọ gbara gburugburu Osimiri Oyapock iji jikọọ ụmụ obodo nke Oiapoque n'ime Brazịl na Saint-Georges de l'Oyapock n'ime French Guiana.
Towa abuo ahu rigoro 83 meters, ogologo o bu 378 meters n’ogologo ma o nwekwara obodobo uzo abuo di 3.50m.
Ogologo ahụ ya kwụ-ọtọ nke akwa mmiri ahụ bụ mita 15. A rụchara ọrụrụ ya n'Ọgọọst 2011, e mepeghị ya nye ụgbọala ruo Maachị 2017.
E hiwere na akwa ahụ ga-ebido rụwa ọrụ n'uju na Septemba 2017, mgbe a na-ele anya ịrụcha ebe nnyocha nke ụlọọrụ na-ahụ maka ọpụpụ na mbata nke ndị Brazili.
Ndị Guaraní bụ otu amaala kachasị gbaa ọkpụrụkpụrụ bi n'eba a na-akpọ ugbua Ọwụwaanyanwụ Paragụwa, ha na-ebi ka ndị dinta na-awagharị awagharị ma na-arụkwa ọrụ ugbo mmepụta nri nke onwe.
Mpaghara Chako bụ ụlọ nye ụfọdụ agbụrụ amaala ndị ọzọ dịka Guaykuru na Payagua, ndị ji nta, ntụtụkọ, na ịkụ azụ wee zụọ onwe ha nri.
N'ime narị afọ nke iri na isii Paragwei, a kpọbụrụ "Nnukwu Ngalaba Ọchịchị nke Ndị Indii", bụ nke a mụrụ n'ihi mbịakwute nke ndị mmeri Ndị Spen ya na ụmụ òtù nwaafọ amaala.
Ndị Spen bidoro oge ọchịchị ike nke digidere ruo narị afọ atọ.
Kemgbe ntọala Asunción n’ime 1537, Paraguay agbalịala idobe ọtụtụ n’ime omume na njirimara amaala ya.
Amaara mba Ajentịna dịka obodo nwere ndị egwuregwu na otu egwuregwu polo kachasị mma n'ụwa dum.
Ndọrọndọrọ kachasị ukwu nke afọ ahụ na-eme na Disemba na fịịldị polo n’ime Las Cañitas.
Obere asọmpi ga na egwuregwu bọlụ ga ka e nwere ike ịhụ ebe a n'oge ụfọdụ n'afọ.
Maka akụkọ gbasara ụmụ ndorondoro na ebe a na-azụ tiketi maka egwuregwu polo, lelee Asociacion Argentina de Polo.
Ego azụmahịa mba Fọlkụlandị bụ pam Fọlkụlandị (FKP) nke ọnụ ya na otu pam ndị Britenị (GBP) ha.
E nere ike ime mgbanwe ego na naanị otu ụlọ akụ nọ n’agwaetiti ndị ahụ nke a ga-achọtali n’ime Stanley n’ofe site n’ụlọ ahịa FIC West.
A ga-anabata n’izugbe pam ndị Britenụ ebe ọbụla n’ime agwaetiti ndị ahụ ma na gburugburu ụmụ kaadị mbiri ego Stanley na dọla mba Amerịka sokwa na ndị a na-anabata.
N’agwaetiti ndị nọ na mpụga ebe ahụ ụmụ kaadị akwụmụgwọ nwere ike a gaghị anabata ya, n’agbanyeghị na enwere ike iwe ego Britenụ na United States; leru anya na ndị nwe ya n’ọdịnihu iji chọpụta ihe bụ ụzọ nkwụmụgwọ a na-anabata.
Ọ na-ara ezigbote ahụ ịgbanwe ego Falklands ma e si n'agwaetiti a pụọ, ya mere gbanwee ego gi tupu i si na ya pụọ.
Ebe Montevideo dị na ndịda Iquetọ, ọ bụ oge ọkọchị ebe ahụ mgbe oge oyi dị na Ebe ugwu Emisfee ma n'otu aka ahụ.
Montevideo nọ n'ime ebe na-ekpọ ọkụ ma jụọkwa oyi; n'ime ụmụ ọnwa ọkọchị, okpomọkụ gafere +30°C bụ ihe nkịtị.
Oge oyi nwere ike ịjụ ezigbo oyi n'aghụghọ: okpomọkụ na-ara ahụ tupu ya gaa n'okpuru ịghọ okwute mmiri, mana ikuku na oruru mmiri na-abịakọta ọnụ ime ka o nwee mmetụta kara jụọ oyi karịa ihe temometa kwuru.
Enweghị ihe dị ka "udu mmiri" na "ọkọchị": ogo mmiri ozuzo na-anọkarị otu ebe ogologo afọ niile.
Agbanyeghị na ọ maala ahụ ọtụtụ n'ime ụmụ anụmanụ nọ n'obianụmanụ ịhụ ndị mmadụ, ka o sina dị anụ ọhịa bụ nke azụghịazụ ma e kwesịghị inye ha nri ma ọ bụ nye ha nsogbu.
Site n'aka ndị na-ahụ maka ogige anụmanụ, nọtee aka opekata mpe yadị maọbụ mita 100 n'ebe anụ ọhịa bea na wulfu nọ na yadị maọbụ mita 25 n'ebe anụ ọhịa ndị ọzọ niile nọ!
Agbanyeghị etu ha siri dị nwayọọ, bison, elk, muuz, bea, na anụmanụ ukwu niile nwere ike iluso ọgụ.
Afọ ọ bụla, a na-emerụ ọtụtụ ndị nleta ahụ n'ihi na ha enyeghị ezigbo ohere. Ụmụ anụmanụ ndị a buru ibu, azụghịazụ, ma nweekkwa ike ịbụ ihe ize ndụ, ya mere nye ha ohere.
Na mgbakwunye, mara amara na usi na adọta ụmụ bea na anụ ọhịa ndị ọzọ, ya mere zere ibu ma ọ bụ isi ụmụ nri na-esi usi ma debe kampụ dị ọcha.
Apia bụ isi obodo Samoa. Obodo ahụ nọ n'agwaetiti Upolu ma ma nwee ngụpụta mmadụ nke ji obere ihe ghara eru 40,000.
E kepụtara Apịa n'afọ ndị 1850; kemgbe 1959, ọ bụ isi obodo Samoa.
Ọdụ ụgbọ mmiri ahụ bụ ebe nguzosike nke ndị agha mmiri wuru ewu na 1889 mgbe nnukwu ụgbọ mmiri asaa si Jamani, US, na Briten jụrụ ịhapụ ọdụ ụgbọ mmiri ahụ.
Nnukwu ụgbọ mmiri niile ndị ahụ miri, ewezụga otu ụgbọ agha Ndị Briten. Ọ fọrọ obere ka o ruo Ndị Amerịka na Ndị Jamani 200 nwụrụnụ.
N'oge mgba maka nnwereonwe nke a haziri site n'aka ngagharị Mau, otu nzukọ keudo n'ime obodo rụpụtara n'ogbugbu nke ezigbo onyeisi Tupua Tamasese Lealofi III.
E nwere ọtụtụ ọnụ mmiri, n’ihi nnọnetiti nke Ọklandị nke ọdụ ụgbọ mmiri abụọ. Ndị nke kacha ewu ewu nọ n’ebe atọ.
Akụkụ mmiri Ọnụmmiri Ugwu (nọ na mpaghara Ugwu Ebe ndote ụgbọ mmiri) nọ n’oke osimiri Pacifik ma dọtịa site na Long Bay nọ n’ugwu ruo Devonport nọ na ndịda.
Ha niile fọrọ obere ka ha bụrụchaa akụkụ mmiri aja aja ya na igwu mmiri echedoro echedo, ma ọtụtụ n'ime ha nwere ndo enyere site n'aka ụmụ osisi pohutukawa.
Ụmụ akụkụ mmiri Tamaki Drive nọ n’Ọdụ ụgbọ mmiri Waitemata ahụ, n’ime ahịa ndị bara ụba nọ mpaghara ebe obibi nke Mission Bay na St Heliers n’ime Central Auckland.
Ebe ndị a bụ mgbe ụfọdụ akụkụ mmiri ezinụlọ ndị mmadụ juru ya n’ọtụtụ ụdị ụlọ ahịa nọ n’ogologo ọnụ mmiri ahụ. Igwu mmiri dị mma.
Isi biya imeobodo ahụ bụ 'Number One', ọ bụghị biya na-agbagwoju anya, mana dị mma n'ahụ ma na-edo ahụ nke ọma. Biya imeobodo nke ọzọ bụ nke a na-akpọ "Manta".
Enwere ọtụtụ mmanya si Frans mmadụ ga-aṅụ, mana mmanya Niu Ziland na Ọstrelia ga-aka mma maka njem.
Mmiri mgbata ebeụlọ dị mma nke ọma ịn̄ụ, mana mmiri bọtụlụ dị mfe ịchọta ma ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị.
Maka ndị Australia, kọfị 'flat white' bụ ihe ala ọzọ. Shọt blak bụ 'espresso', cappuccino na-ebu nnukwu krim abịa (ọ bụghị froth), ha na-añụ tii na-etinyeghị mmiri ara ehi.
Chokoleeti ọkụ a ruru ogo nke Beljiọm. Mmanya mkpụrụ osisi dị ọnụ mana ha amaka.
A na-eme ọtụtụ njem ịga na ime ala osimiri gburugburu afọ niile, ma mmerụ ahụ n'ihi otu n'ime ihe mkpata ndị a n'ime ala osimiri ahụ na-ara ahụ inweta.
N’agbanyeghị, were ndụmọdụ si n'aka ndị nọ n’ọchịchị, rube isi n’ihe ntụaka niile, ma gee ntị nke ọma maka ịdọ aka na ntị nke nchekwa.
Azụjelii igbe na-apụta n'akụkụ ọnụ osimiri ma n'ụso ụmụ njekọta osimiri site n'Ọktoba ruo Eprel ugwu nke 1770. E nwekwara ike ịhụ ha mgbe ụfọdụ n'oge ndị ọzọ n'abụghị oge ndị a.
Shaakị gasị dị adị, otú ọ dị, ha adịkarịghị awakpo ụmụ mmadụ. Imirikiti shaakị na-atụ ụmụ mmadụ egwu yana ga-egwu mmiri pụọ.
Agụiyi mmiri nnu anaghị ebikewe n'ime oke osimiri, ebe ha na-ebikarị bụ na ngwọkọta osimiri na mmiri nnu dị n'ugwu sitere na Rọkhamptịn.
Itinye akwụkwọ n’ọdịnihu na-enye onye njem ahụ obi udo na ha nwere ebe ha ga-arahụ ụra ozugbo ha rutere ebe ha na-aga.
Ndị nnọchi anya ndị njem na-enwekarị nkwekọ azụmahịa ha na kpọmkwem ụmụ họteelụ, agbanyeghị na ị nwere ike ịhụ na o kwere omume itinye akwụkwọ maka ụdị nnabata ndị ọzọ, dị ka ala ebe a na-ama ụlọikwu, sitere n'otu onye nnọchite anya njem.
Ndị nnọchi anya ndị njem na-enyekarị ụmụ ngwungwu na-agụnye nri ụtụtụ, nhazi ụzọ esi eje njem ịga na/site na ọdụ ụgbọelu ma ọ bụ njem ụgbọelu etikọrọ ọnụ ya na ụmụ ngwungwu họteelụ.
Ha nwekwara ike idobere gị ohere a ma ọ bụrụ na ị ka chọrọ oge ịtụgharị uche na ya maọbụ ịnweta akwụkwọ ndị ọzọ maka ebe ị na-aga (ọmụmaatụ: visa).
Ihe ọbụla a chọrọ ịgbanwe maọbụ ịna, ọ bụ onye ejenti njem ka a ga-ebu ụzọ gakwuru; ọ bụghị họteelụ n'onwe ya.
Maka ụfọdụ mmemme, nnukwu ọtụtụ n’ime ndị bịara na mmemme egwu ahụ kpebiri ịnọ na kampụ n’ebe ahụ, ma ọtụtụ n’ime ndị bịara na-ewe ya otu akụkụ dị oke mkpa nke ahụmihe ahụ.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ịnọ nso na emereme ahụ ị ga-ekwesị ịbanye ọsịịsọ iji nweta otu ebe a na-ama ụlọikwu nọ nso n'egwu ahụ.
Cheta na obu ezie na egwu ogbo-egwu nwere ike gwula, enwere ike inwe mpaghara mmeme ahu gana aku egwu ruo ime abali.
Ụfọdụ ememme nwere ebe ndị a na-ama ụlọikwuu pụrụ iche maka ezinụlọ nke nwere ụmụ na-eto eto.
Mgbe ị na-agafe Ebe ugwu Baltic n’oge oyi, lelee ebe kabịn ahụ, dị ka ịgafe okwute mmiri na-akpata mkpọtụ dị nnọọ egwu maka ndị ọ kacha metụta.
Njem nnyagharị nke Senti Piitasbọg gụnyere oge n'ime obodo. Ndị njem nke njem nnyagharị bụ ndị ewezụgara site n'ụmụ ihe ndị achọrọ maka visa (lelee usoro ahụ).
Ụlọ chaa chaa gasị na-eme ihe niile ịhụ na ndị mmadụ mefuru oge na ego ha niile. Windo na elekere anaghị adịkewe n'ime ha; ọzọ, ụzọ ọpụpụ na-arakarị ahụ ịchọta.
Ha na-enwekarị nri pụrụ iche, mmanya na ụmụ onyinye ntụrụndụ, iji debe ndị ọbịa n'ọnọdụ dị mma, ma debe ha n'ogige ahụ.
Ụfọdụ ebe mgbakọ na-enye ụmụ ihe ọn̄ụn̄ụ na-eme n'anya n'efu. Mana, mmanya ogbugbu na-egbochi echiche, ma ndị nille na-agba chaa chaa nke ọma mara mkpa nke ọ dị ịnọ n'ezi echiche.
Onye ọ bụla nke na-aga ịnya ụgbọ ala ya elu latitude maọbụ n’elu ugwu gafere, kwesịrị ịtụle ihe enwere ike ịbụ oge snow, ice, ma ọ bụ oke oyi.
N’okporo ụzọ ebe ais na sno dị, nrapara dị ala nakwa ịnweghị ike ịnya moto n'elu ya dịka ị nọ na asfalt nkịtị.
N'oge ụmụ oke ozuzo okwute mmiri, sinoo ga-ezu iji mee ka ị tọọ nwere ike izo n'ime ntakịrị oge.
Enwere ike igbochi mgbàràìhè site na ịda ma ọ bụ ịfụ sinoo ma ọ bụ site na umu irighiri mmiri ma ọ bụ mmiri kpụkọrọ akpụkọ na windo ụgbọala.
N'aka nke ọzọ, ụmụ ọnọdụ okwute mmiri na sinoo bụ ihe nkịtị n'ọtụtụ mba, ma ụmụ ụgbọala na-anyagharị n'enweghị nsogbu afọ niile.
Safari nwere ike ịbụ ihe kachasị akpọta ndị njem nlereanya na Afrịka ma bụrụkwa ihe kachasị atụ ha n'anya.
Okwu bụ safari n’ojiji ama ama pụtara ime njem n’ofe ala ileleanụ ọhịa Afrịka dị ịtụnanya, tụnadị na savanna.
Ụmụanụmanụ ụfọdụ, dịka enyi ga na mgbara ga, na-abịaru nso n’ụgbọala ma ngwaọrụ izugbe dị mma ga-enye gị ohere iji hụ ha nke ọma.
Ọdụm, agụogbu na agụ na-eme ihere mgbe ụfọdụ ma ị ga-ahụ na nke ọma karịa n'iji baịnokụlaasị.
Safari ngagharị (nke a na-akpọkwa "njem ọhịa", "safari ọrịrị", maọbụ "nzọụkwụ") gbakwunyere ịrị ugwu ruo awa ole na ole maọbụ ọtụtụ ụbọchị.
Engwuregwu Paralimpiks ga-eme site n'Ọgọọst 24 ruo na Septemba 5 2021. A ga-eme ụfọdụ emume n'ebe ndị ọzọ gburugburu Japan.
Tokyo ga-abụ naanị obodo Eshia nke kwadoro asọmpi nke oge okpomọkụ ugboro abụọ, ebe akwadoro egwuregwu ahụ na 1964.
Ọ bụrụ na ị kwụrụ ụgwọ maka ụgbọelu gị na ebe obibi gị maka 2020 tupu ekwuputa myigharịrị oge, i nwere ike inwe ọnọdụ tara akpụ.
Iwu nkagbu na-adị iche iche, mana ka ọ dị na Maachị gara aga ọtụtụ n'ime ụmụ iwu nkagbu dabere na njecorona agbatịghị ruo Julaị 2020, mgbe ahazirioge Olumpiks ahụ.
Ọ bụ ihe atụwara anya ya na ọtụtụ tiketị emume ga-adị ọnụ n'etiti ¥2,500 na ¥130,000, ya na tiketị a na-ahụkarị na-adị ọnụ ruo ihe dị ka ¥7,000.
Ide akwa butụ mmiri nwere ike inyere ha aka ịkọ. Ọtụtụ ụlọ nkwarị akụ nwere otu igwe ndetị akwa na bọọdụ ide akwa dị adị maka mgbaziri, ọbụlagodi ma otu anọghị anọ n'ime ụlọ ahụ.
Ọ bụrụ na igwe ndetị akwa adịghị adị, ma ọ bụ ọ bụrụ na ọ masịghị gị iyi sọks edere ede, mgbe ahụ ị nwere ike ịnwa iji otu igwe ịkọ ntutu, ma ọ dịrị.
Kpachara anya ka akwa ghara ịdị oke ọkụ (nke a nwere ike ime ka akwa hịkpọọ, maọbụ ọ ka njọ, o nwere ike ịgba ọkụ).
E nwere ọtụtụ ụzọ e ji eme ka mmiri dị ọcha, ụfọdụ kara dị ire maka ụmụ ihe iyi egwu pụrụ iche.
N'ebe ụfọdụ isi mmiri n'ọkụ ruo otu nkeji ezuola, n'ebe ndị ọzọ achọrọ ọtụtụ nkeji.
Ụmụ m̀yọ̀ na-adị iche n’ịdị irè, ma ọ bụrụ na ị nwee nchebara echiche, mgbe ahụ ị kwesịrị itule uche ịzụ mmiri gị n’ime otu karama amachiri siye na otu ụlọ ọrụ nwere aha ọma.
Ndị njem nwere ike ịhụta ụmụ anụ ọtapịa ndị nke ha na-amaghị n'ebe ụlọ ha.
Pesti nwere ike imebi nri, kpata Pests can spoil food, cause mmeka ahụ, ma ọ bụ n’ọnọdụ ka njọ kpata mmeghachi omume nfụkasị, kesaa venọm, ma ọ bụ ọrịa ofufe.
Ụmụ ọrịa na-efe efe n’onwe ha, ma ọ bụ ụmụ anụmanụ dị egwu nwere ike imerụ ma ọ bụ gbuo mmadụ n’ike, a na-ghị etozukarị oke dị ka ụmụ ahụhụ a na-achọghị.
Azụmaahịa na-enweghị ụtụ isi bụ ohere ịzụ ngwaahịa ndị ewezụgara site na ụtụ isi n’ụgwọ ndị ọzọ n’ebe ụfọdụ.
Ndị njem na-aga mba ndị nwere nnukwu ụtụ isi nwere ike mgbe ụfọdụ ichekwa ọkpụrụkpụrụ ego, tụmadị na ngwaahịa dị ka ụmụ ihe ọn̄ụn̄ụ ndị na-aba n'anya na ụtaba.
Mgbatị ụzọ nọ n'etiti Point Marion na Fairmont na-enye ọnọdụ ịnya ụgbọala kachasị taa akpụ n'Okporoụzọ Buffalo-Pittsburg, na-agafe ọtụtụ oge site n'ọdịdịala azụ ọhịa dịpụrụ adịpụ.
Oburu na imaatachabeghi ka esi anya ugboala n’okporouzo ime obodo, ume ahapukwala gi: uzo n’akpode akpode, uzo di wara wara na nkuku nko juru eju.
Ókè ekwomọsọ ebipụtara dị obere karịa n'ụzọ ahụrụ anya na ngalaba ndị ọzọ gara aga ma ndị na-abịa abịa - na-abụkarị mph 35-40 (km/h 56-64) - ma nrubeisi siri ike na ha kara dị mkpa karịa otu ọzọ.
Na mmata ihe, n'agbanyeghị, ọrụ ekwentị mkpààgagharị ka dị ike ebe a karịa ọtụtụ ogologo ụzọ ndị ọzọ ahụ, dịka ọmụmaatụ Ọhịa Pennsylvania ahụ.
Pastrị ndị Jamini dị nnọọ mma; na Bavaria, ọ na-enwe ọtụtụ ihe ma dịkwa iche iche ka nke ndị Ọstrịa, agbata obi ha n'akụkụ ndịda.
A na-ahụkarị ụmụ achịcha mkpụrụ osisi, e ji apụl eme achịcha mgbe niile n'afọ, ejikwa cheri na plọm eme achịcha n'oge sọma.
Ọtụtụ ngwaahịa achịcha eghere eghe na Jamanị na-egosipụtakwa njirimara ụmụ alịmọndụ, hezelnọt, na mkpụrụ osisi ndị ọzọ. Achịcha ndị ama ama na-agakarị nke ọma ya na otu iko nke kọfị siri ike.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ụmụ achịcha ndị pere mpe ma baakwa ụba, nwaa ihe na-ndabere na mpaghara a na-akpọ Berliner, Pfannkuchen ma ọ bụ Krapfen.
Curry bu nri eji ngwa nri nke di iche iche esi, ana etinyekwa ya anu ma o bu akwukwo nri.
Kọrị nwere ike ịdị "akọrọ" maọbụ dị "mmiri mmiri", ọ dabeere na mmiri dị adị.
Ụmụ mpaghara imeala nke Ebe Ugwu Indịa na Pakistan, a na-ejikarị yogọọt n'ime ụmụ kọrị; n'ime Ebe Ndịda Indịa na mpaghara ndị ọzọ dị n'akụkụ mmiri nke okpuru kọntinent ahụ, a na-ejikarị mmiri ara akị oyibo.
Ebe enwere agwaetiti 17,000 isi wee họrọ, nri Indonesia bụ aha gburugburu nke a na-akpọ ọtụtụ erimeri nke ọtụtụ mpaghara dị na mba ahụ niile.
Mana, e kwuo ya n'etinyeghi nkọwa ọbụla, ihe a na-achọkarị ikwu bụ nri ahụ si n'etiti na ọwụwa anyanwu nke nnukwu agwaetiti Java.
Ugbu a ọ dị adị nke ukwuu na gburugburu òtù ụmụ agwaetiti ndị ahụ, nri Ndị Java nwere njirimara nri ndị etijuru ngwa nri na mfe n’usoro, ekpomeekpo ahụ kara dị ike Ndị Java kara nwee mmasị na ya ndị nke bụ ahụekere achịcha kpuchiri, ose, shuga (tụmadị shuga akị Ndị Java) na ngwa nrị ndị ọzọ nwere usi ọma.
Ihe nkonye ụkwụ bụ ihe na-ejide ụkwụ onye na-agba ịnyịnya nke na-awụdata n'akụkụ abụọ site oche elu ịnyịnya.
Ha na-ewetara onye na-agba ha nnukwu nnọsi ike mana ha nwere ike inwe nsogbu nchekwa maka na ụkwụ onye na-agba ya pụrụ ịkpachi n'ime ha.
Ọ bụrụ na esị n'elu ịnyịnya tụpụ onye na-anya ya mana ụkwụ onye ahụ ekonye n'ekike ịnyịnya, ịnyịnya nwere ike ịsekpụrụ ya na-aga ma ọ gbaa ọsọ. Iji belata ihe egwu a, enwere ụfọdụ ihe mkpachapụ anya enwere ike ime.
Na mbụ, ọtụtụ n’ime ndị na-anya na-eyi akpụkpọ ụkwụ ọnyịnya ndị nwere kọị kọị na okpuru dị nrọ ma pee mpe.
Ọzọ, ụfọdụ sadụl, ọkachasị sadụl Bekee, nwere ebe nchekwa na-ekwe ka akpụkpọ anụ si na sadụl dapụ ma onye na-anya anya sere ya laa azụ mgbe ọ na-ada.
Ndagwurugwuru Cochamó - ebe arimelu nwere ogo kachasị elu nke Chile, a mara dị ka Yosemite nke Ndịda Amerịka, ya na ụdị dị iche iche nke ụmụ nnukwu ahụaja kọnkịrị na nnukwu nkume.
Ụmụ ọnụ ugwu kachasị elu gụnyere nlenle ndị magburu onwe ha site n'elu ebe ndị ahụ. Ndị na-arị elu si n'akụkụ ụwa niile na-awapụta mgbe niile ụzọ ọhụrụ site n'ahụaja ya niile e nwere ike isi wapụta ụzọ nke anaghị agwụ agwụ.
Kpoda-ugwu egwuregwu-snow, bu nke gunyere igba igwe mmiri ski na snowboard, bu egwuregwu amaara-amaara nke gbasara ikpoda ala site n’elu n’ogige juputara na snow jiri igwe ski na snowboard eyigidere n’ukwu gi.
Egwuregwu skii bụ otu isi ihe omume n'etiti ndị ọ na-amasị, mgbe ụfọdụ a na-amara ya dị ka "ski bums," na-eme atụmatụ nke oge ezumike niile gburugburu ime skii n'otu ebe kpọmkwem.
Egwuregwu ski eteela ọ nọ — ụmụ eserese esere n'ọgba kemgbe 5000 BC na-egosi ndị egwuregwu ski!
Igwu skii na mgbada ugwu dị ka otu egwuregwu gara azụ ruo opekata mpe ọ bụrụ na arị afọ iri na asaa, ma n’ime 1861 òtù egwuregwu skii ntụrụndụ nke mbụ bụ nke emepere site n’aka Ndị Nọọwei n’ime Ọstrelịa.
Njem mfe ski: A na-akpọkwa omume a bakkọntrị ski, ije nlegharị anya ski maọbụ ịrị ugwu ski.
O metụtara mana ọ naghị agụnyekarị ọdịdị njem nleta ski keugwu ma ọ bụ egwuregwu ịrị elu ugwu, nke ikpeazụ ndị a e mere n'ọdịdịala kpodara ekpoda ma na-achọ ụmụ ski na buutu kara sie ike.
Chee echiche maka ụzọ esi egwu egwuregwu skii dị ka ụzọ e si aga njem ije nke yiri.
N'ọnọdụ dị mma i nwere ike ịgarute ntoanya buru ibu karịa ịga ije - mana ọ na-ara ahụ tupu i rute ekwomọsọ nke ime skii ofe mba n'enweghị otu akpa azụ dị arụ n'ime mkpọwaraụzọ akwadogwere.
Yurop bụ kọntinent dị obere na mmetụta ma nwee ọtụtụ mba nwere onwe ha. N’okpuru ọnọdụ nkịtị, ime njem gafee ọtụtụ mba ga-apụta ị ga site na ntinye akwụkwọ maka visa na njikwa paspọọtụ ọtụtụ oge.
Agbanyeghị, mpaghara Schengen na-arụ ọrụ dịka mba a na-akwanyere ugwu.
Ọ bụrụ na ị nọrọ n'ọgbọ a, i nwere ike igafe oke ala ma zere nnyocha paspọtụ.
N'otu aka ahụ, site n’inwe otu visa Schengen, ị kwesịghịzi itinye akwụkwọ maka visa otu n’ime mba ndịòtù Schengen nke ọ bụla iche, ya mere chekwa oge, ego na mmepe akwụkwọ.
Onweghi nkwekọrịta zuru ụwa maka ngwa a na-akpọ ihe ochie. Ụfọdụ ụlọ ọrụ ụtụ na-akpọ ngwa ndị karịrị afọ 100 ihe ochie.
Nkọwasị ahụ nwere ọdịiche kwa ọdịdị ala, ebe ókè afọ nwere ike ịdị obere karịa n'ebe ndị dị ka Ugwu Amerịka karịa n'ime Yurop.
Enwere ike ikpo ngwaahia eji aka ruo ihe mgbe ochie, n’agbanyeghi na o di ohuru karia ngwaahia ndi nke emere maka oha.
Ọzụzụ Reindeer dị mkpa nke ukwuu ọkachasị n’ime ihe banyere ndụ na omenaala ndị Sámi nakwa ahịa gbara ya okirikiri dịkwa mkpa maka ọtụtụ akaọrụ ndị ọzọ.
Ọbụna n'ọdịnala, agbanyeghị, ọ bụghị Sámi niile bụ ndị metụtara n'ime nnukwu ogo ọzụzụ anụmanụ reendiya, mana biri site n'igbu azụ, ịchụ nta na ihe yiri ya, na-enwe reendiya n'ọtụtụ oge dị ka ụmụ anụmanụ akpọbatara.
Taa ọtụtụ Sámi na-arụ ọrụ n’ụmụ ahịa nke ugbu a. Njem nleta bụ mkpata egọ dị mkpa na Sápmi, mpaghara Sámi ahụ.
Agbanyeghị na ndị abụghị ndị Roma na-ekwu ya n'etiti ha, a na-ahụta aha a bụ "Gypsy" dị ka aha ọjọọ maka na ọ gbasara ụfọdụ ụzọ ọjọọ ndị ọzọ si ahụta ndị Roma, nke abụghị eziokwu.
Ọ bụrụ na mba ahụ ị ga-aga ileta bụrụ nke nọ n'okpuru otu ndụmọdụ njem, mkpuchi ahụike njem gị ma ọ bụ mkpuchi nkagbu njem gị bụ nke o nwere ike imetụta.
Ị nwere ike ịjụta ndụmọdụ nke ndị ọchịchị karịa nke gị, mana ndụmọdụ ha bụ ndị e mebere maka ndị amaala ha.
Iji mee atụ, ndị Amerịka nọ na Mịdụl Ist nwere ike igabiga ihe dị iche n'ihe ndị Yurop maọbụ Arab ga-agabiga.
Ndị ndụmọdụ gasị bụ naanị obere nchịkọta nke ọnọdụ ndọrọndọrọ ọchịchị n’otu obodo.
Uche ndị e gosipụtara na-esekarị n'elu, n'izugbe na ntọghasị dị ukwuu ma a tụnyere ya ozi ndị a kọwara nke ọma dị ebe ọzọ.
Ajọ ihu igwe bụ aha izugbe a na-akpọ ihe ọbụla gbasara ihu igwe nke nwere ike imebi ihe, ghasaa mmekọrịta, maọbụ gbuo mmadụ.
Ihu igwe dị oke njọ nwere ike ime n'ebe ọbụla n'ụwa, ma o nwere ụdị dị iche iche, nke nwere ike idabere na ọdịdịala, ọdịdịebe na ọnọdụ keikuku.
Ụmụ oke ifufe, mkpụrụ mmiri, oke mmiri ozuzo, na ọkụọhịa bụ ụmụ ụdị na mmetụta nke ihu igwe dị oke njọ, dị ka ụmụ egbe eluigwe mmiri ozuzo, ajọọ̀ oke ifufe, ajọọ̀ ifufe mmiri, na ajọọ̀ oke mmiri ozuzo.
Ihe ihu igwe siri ike na-eme na mpaghara na n'oge ụfọdụ gụnyere blizadị, oke ikuku na ọdịda ibubeoyi, oke ikuku na ọdịda aịzị, na oke ifufe na-ebu aja.
Ana adusi ndi njem odu ike ha mara gbasara ihe ndaba nke ekpem-oku maobu di oke ukwuu nke na emetuta ogbe ha dika onwere ike imetuta atumatu ime-njem obula.
Onye ọbụla na-achọ ịga mba ọbụla bụ ọgbọ agha kwesịrị ka e kuziere ya etu e si eme ya.
Ọchịchọ n'ịntanetị maka 'Ọmụmụ gburugburu keiro' nwere ike iweta adreesị otu ụlọọrụ imeobodo.
Otu ihe ọmụmụ ga-akọwa nke ọma ihe niile a kọwara ebe a tinyekwa ahụmihe bara uru.
Ihe ọmụmụ na-abụkarị site na ụbọchị abuo ruo ụbọchị ise ma ọ ga-emetụta mmepụta omume, ọtụtụ mgbata ọsọ enyemaka mbụ na ọzụzụ maka ngwaagha n'oge ụfọdụ .
Ụmụ akwụkwọ na magaziini ndị na-akọ maka nlanarị nke ọzara juru eju, mana ụmụ mbipụta na-akọ maka ebe a na-alụ agha dị obere.
Ndị njem ụgbọ mmiri na-eme atụmatụ ịwa ahụ ntụgharị mmekọahụ na mba ofesi ga-ejiriri n'aka na ha ji ụmụ akwụkwọ ziri ezi maka njem nlaghachi.
Ịdị njikere ndị ọchịchị inye akwụkwọ ikike ngafe ndị a na-edepụtaghị jenda ha (X) maọbụ dọkụmentị emelitere ka ọ daba n’aha a chọrọ ma jenda adị iche.
Njikere nke ndị ọchịchị mba ndị ọzọ ịsọpụrụ akwụkwọ ndị a dị nnọọ ka ihe na-agbanwe agbanwe.
Ọchịchọ na ebe nyocha nchedo abụrụkwala oke nsogbu mbanye n’ike n’ime oge Septemba 11, 2001 gachara.
Ndi transgender n’emebeghi oparashon atubekwana anya na ha gafecha ihe nyocha na ha ka ga ano na nzuzo ma ugwu ha adikwachim.
Oke ọchịchị mmiri bụ mmiri na-asọlata asọlata site n'ebili mmiri tikapụrụ n'ọnụ, na-emekarị n'okwute ala mmiri maọbụ ihe yiri ya.
N'ihi tọpọlọjì nke okpuru mmiri ahụ, mmiri na-abanyeghachi dị ike n'akụkụ ole na ole miri emi, ma ike ọwụwụ mmiri ngwa ngwa ruo na mmiri dị omimi nwere ike ịmepụta n'ebe ahụ.
Imirikiti ọnwụ na-eme n'ihi ike ọgwụgwụ n'ịgbalị igwughachi azụ megide kọrenti mmiri, nke nwere ike ọ gaghị ekwe omume.
Ozugbo ị na-esi n'ọwụwụ mmiri ahụ pụta, igwughachi azụ na-aka ara ahụ karịa na nkịtị.
Gbalịa tụọ atụmatụ ọzọ maka ebe ejidebeghi gị, maọbụ, dabere na nka gị yana ma achọpụtala gị, ị nwere ike ịchere maka nnapụta.
Mmenyeụjọ mbanyegharị abia na nkpirikpi karia mmenyeụjọ omenala (enwere agba họnịịmuunu dịtụ ntakịrị), dịruru ogologo, ma nwee ike ịka njọ.
Ndị njem ndị nwere oge dị mfe ịnọgharị n’omenala ọhụrụ mgbe ụfọdụ na-enwe oge siri ike ịnọgharịkwa n’omenala keobodo ha.
Mgbe a na-alaghachite n’ụlọ mgbe e bichara n’obodo oyibo, ị nweela mmara ahụ nye omenala ọhụrụ ahụ ma tufuokwa ụfọdụ agwa gị si n’omenala nke ụlọ gị.
Mgbe ị gara na mba ofesi na mbụ, ndị mmadụ nwere ike ha nwere ndidi na nghọta, na-amara na ndị njem nọ n'ime mba ọhụrụ chọrọ imegharị ahụ nnọshị̀.
Ikekwe ndị mmadụ agaghị atụ anya na ndidi na nnagide bụ ihe ndị njem na-alaghachi ụlọ aghaghị inwe.
Ihe ngosi uda na oku piramidi bu ihe kachasi akpalite mmuo emere maka umuaka n’ebe a.
Ị nwere ike ịhụ piramidi n'ime itiri ma ị nwere ike ịhụ ha n'ịgbachi nkịtị tupu ihe ngosi ahụ ebido.
Mgbe niile ị na-anụkarị ụda ndị njem nleta na ndị na-ere ahịa. Akụkọ gbasara ụda na ọkụ dị nnọọ ka otu akwụkwọ akụkọ ifo.
Edobere Sphinx ka ihe mgbakwasa na onye na ako akuko toro ogologo
A na-egosipụta ihe ngosi ndị ahụ na piramidi ndị ahụ ma mere ka piramidi ndị ahụ dị iche iche na-enwukepụ.
Sawụt Shetland Aịlands, nke a chọpụtara na 1819, bụ ebe ọtụtụ mba na-azọ; Agwaetiti nọ na ya karịrị ndị nọ ebe ọzọ, ebe agụtara iri na isii nọ n'ọrụ n'afọ 2020.
Archipelago ahụ tọgbọọrọ na Km 120 na mpaghara ugwu nke obodo akụkụ mmiri ahụ. Nke kachasị buo ibu bụ Agwaetiti Eze George nwere ebe obibi nke Villa Las Estrellas.
Ndị ọzọ gụnyere Agwaetiti Livingston, na Nghọgbu ebe caldera mmiri tojuru nke ugwu mgbawa ka dị ire na-enye otu ebe obibi dị ịtụnanya.
Ala Ellsworth bụ mpaghara ndịna nke Penịnsụla, Oke osimiri Bellingshausen gbara ya gburugburu.
Ugwu ndị Peninsụla ahụ nọ ebe a jikọtara ọnụ ịghọ ugwu dị larịị ahụ, mgbe ahụ jikọgharịa ịghọ km 360 eriri igwe nke Ugwu ndị Ellsworth ahụ, egbubiri abụọ site n’aka Glesịa Minnesota ahụ.
Akụkụ ebe ugwu ma ọ bụ Renji Sentinel nwere ugwu ndị kachasị elu nke Antaatika, Vinson Massif ahụ, na-eru ọnụ elu na 4892 m Ugwu Vinson.
N'ebe ndị zopuru ezopu, n'enweghị netwọk ekwentị, ikekwe ekwentị satịlaịt ga-abụ naanị nzọpụta i nwere.
Otu ekwentị satịlaịtị abụghị nnọchite anya n’izugbe nke ekwentị kengagharị, dị ka ị kwesịrị ịnọ n’ezi ya na inwe ụzọ warawara ịhụ satịlaịtị iji ya kpọọ oku ekwentị.
Ọrụ ahụ bụ nke mbupu na-ejikarị, gụnyere nka obi ụtọ, ya na ụmụ njem nchọpụta ndị nwere mkpa datà ebe dịanya na olu.
Onye ọrụ ekwentị ebeụlọ gị kwesịrị inwe ike inyekwu ozi gbasara ị na-ejikọta n'ọrụ a.
Otu nhọrọ kara ewu ewu n'ụzọ na-amụbanye maka ndị na-atụ arọ ịnara otu ohere-afọ bụ ime njem ma mụta.
Ọ bụ ndị si ụlọ akwụkwọ pụta na-emekarị nke a, maka ọ na-ekwe ka ha jiri otu afọ zuo ike tupu ha abanye mahadum, ma ghara imebi mmụta ha.
Ọtụtụ oge, ịdebanye aha n'ọmụmụ ohere-afọ na mba ofesi nwere ike imelite n'ezie ohere i nwere isonye n'agụmakwụkwọ dị elu n'obodo ebe i si.
A ga-enwekarị ụgwọ akwụkwọ iji debanye aha n’ime ụmụ emume mmụta ndị a.
Finlandị bụ ebe dị oke mma maka inya ụgbọ mmiri. “Ala nke otu puku ọdọ mmiri” ahụ nwekwara ọtụtụ puku agwaetiti, n’ime ọdọ mmiri ndị ahụ ma n’akụkụ mmiri nke òtù agwaetiti.
Na otu agwaetiti n’umu ọdọ mmiri ị gaghị achọriri ụgbọ mmiri.
Agbanyeghị n'òtù agwaetiti akụkụ mmiri ahụ na ụmụ ọdọ mmiri kachasị ibu bụ ndị nke buru ibu n'ezie maka yaach ọ bụla, ụgbọ mmiri ndị kara obere ma ọ bụ ọbụna otu kayak na-enye ahụmihe dị iche.
Akwọm ụgbọmmiri bụ ihe mmemme nchereoge na mba Finlandị, nke bụ otu ụgbọmmiri ibu mmadụ asaa maọbụ asatọ.
Norway, Sweden na New Zealand emegokwa ya, mana ewezụga ha, ihe a bụ ihe mmeta pụrụ iche (dịka ọmụmaatụ na Netherlands fịgọ a bụ otu nye iri anọ).
Ọtụtụ n'ime Njem Ụgbọmmiri Baltik pụrụiche na-enye njirimara nke ọnụnọ agbatịrị n'ime St. Pitasbọọg Rọshịa.
Nke a pụtara na i nwere ike ịwere ụfọdụ ụbọchị gaa leta obodo ochie a, ma na-echighata n'ụgbọ mmiri ịrahụ ụra abalị.
Ọ bụrụ na ị nọ n'ụgbọmmiri eme njem nlereanya nke naanị elu ala ị gaghị enweta visa dị iche maka ya (bidori na 2009).
Ụfọdụ njem ụgbọ mmiri na-enye njirimara Beelịn, Jamani n'ime ụmụ broshuọ ahụ. Dị ka ị nwere ike ịhụ site na maapụ ahụ n'elu Beelịn anọghị oke osimiri ahụ nso ma ọlị ma otu nleta n'obodo ahụ bụ nke agụnyeghị n'ọnụahịa nke njem ụgbọ mmiri ahụ.
Njem ụgbọ elu nwere ike bụ ihe egwu ny onye ọbụla agbanyeghị afọ ole ha dị maobụ ebe ha si, ọkachasị ma ọ bụrụ na ha efebeghị mbụ maọbụ na ha enwego ihe ọghọm mbụ.
Ọ bụghị ihe ihere: ọ dịghị iche dị n'etiti ya na mmadụ inwe egwu gbasara ihe nwere ike ime na ndụ ya nakwa enweghi mmasị n'ihe ndị ọzọ nke ọtụtụ mmadụ nwere.
Maka ụfọdụ, nghọta ihe gbasara otu ụgbọ elu si arụ ọrụ na ihe na-eme n'ime otu njem ụgbọelu nwere ike inye aka ịgabiga ụjọ nke dabere na ihe amaghị ma ọ bụ anọghị na njikwa.
A na-akwụ ndị ụlọ ọrụ na-ebugharị ngwa ụgwọ nke ọma maka ibuga ihe ngwa ngwa. Kwa ugboro, oge dị ezigbo mkpa n'ebe akwụkwọ azụmahịa nọ, ngwa ahịa maọbụ akụkụ nnochite maka nrụzi igwe ọbụla ngwa ngwa.
N’ụzọ ụfọdụ, ụlọ ọrụ ndị kara buo ibu nwere ụgbọ elu nke ha, mana maka ụzọ ndị ọzọ na obere ụlọ ọrụ ndị ọzọ enwere otu nsogbu.
Ọ bụrụ na ha jị ụgbọelu ziga ihe, n'ụfọdụ ụzọ, ikekwe ọ gaara ewe ọtụtụ ụbọchị igafere mbupusi na ndị kọstom.
Naanị ụzọ a ga-esi ewefe ya ọsịịsọ wụbụ iziga ya dị ka ibu e nyochagoro. Iwu ụlọọrụ ụgbọelu agaghị ekwe ha izipụ ibu na-enweghị otu onye njem, nke bụ ebe ị ga-esi bata n'ime.
Ụzọ kachasị doo anya nke ife n’ime klaasị mbụ ma ọ bụ azụmahịa bụ iwepụta nnukwu ego maka urūàmàrà (ma ọ bụ, nke ka mma, mee ka ụlọ ọrụ gị mere gị ya).
Mana nke a adịghị ọnụ ala: dịka ihe i ga-ebu n'uche, lewe anya ịkwụ ugboro anọ ihe a na-akwụ maka ekọnọmi nkịtị maka biznes, na ihe ruru ugboro iri na otu maka fest klas!
Ikwu n'ozuzu, ọ baghị uru ọbụna ị na-ele anya maka ụmụ mbelata maka ochie ndị azụmaahịa ma ọ bụ klaasị-mbụ n'ụmụ njem ụgbọelu ozugbo sitere na A ruo B.
Ndị ụgbọ elu mara nke ọma na o nwere isi òtù ndị na-agba ụgbọ elu ndị nwere ike ịkwụ ezigbo ego maka urūàmàrà nke irute ebe ọzọ ọsịsọ nakwa n’ezigbo ọnọdụ, ma gbaa ụgwọ etu o kwesịrị.
Isiobodo nke Moldova bụ Chișinău. Asụsụ keobodo ahụ bụ Romanian, mana a na-ejikarị Rọshịan.
Moldova mba nwere ọtụtụ-agbụrụ nke nke tagwere ahụhụ sitere na ndọkụrịta agbụrụ.
N'afọ 1994, ọgbaaghara a butere nkepụta Mba Transnistria kenkwupụta-onwe n'ime ebe ọwụwaanyanwụ Moldova, nke nwere ọchịchị na ego nke ya mana onweghi mba ọbụla so n'otu UN nabatara ya.
E dozigharịala njikọ akụnaụba dị n'etiti nkewa Moldova abụọ a n’agbanyeghi ọdịda na mkpakọrịta nkwe nke ndọrọndọrọ ọchịchị.
Okpukpe kachasị n'ime Moldova bụ Ụka Kraịstị Keọdịnala.
Izmir bụ obodo nke atọ kacha buo ibu na mba Tọkị nwere ọnụọgụgụ ndị mmadụ dị ihe dịka nde 3. 7, ọdụ ụgbọmmiri nke abụọ kacha buo ibu ma a gụpụ Istanbulu, na ọdụ ụgbọ njem dị ezigbo mma.
Obodo ochie nke Smyrna na mbụ, ọ bụzi ugbu a otu ebe na-ewi ewi, mepere emepe, na azụmaahịa dịnọrụ, e wubere gburugburu otu nnukwu ọnụ mmiri ma ụmụ ugwu gbaakwa ya gburugburu.
Ụmụ buulivadị ahụ sara mbara, ụlọ ndị nwere karama n'ihu ha na ebe ụlọ ahịa na-ewi ewi bụ ndị e wubechara n'iji eluụlọ taịlị-uhie keọdịnala, ụlọ ahịa narị afọ iri na asatọ ahụ, na ụmụ ụlọ alakụba na ụlọ ụka, agbanyeghị n'obodo ahụ nwere nkwụrụ nke kara bụrụ Mediterranean Yurop karịa Tọki keọdịnala.
Obodo Haldarsvik na-ekwe ka ahụta Eysturọị, agwaetiti dị ya nso, ma nwekwaa ụlọ ụka akụkụ asatọ pụrụ iche.
Na yaadị ụlọ ụka, e nwere ụmụ nduru akpụrụ n’ofe ụfọdụ ili na-adọrọ mmasị.
Ọ meritere nkeji iri atọ iji gagharịa n’ime obodo ahụ na-akpali akpali.
Na aka-ugwu ma gburu-gburu dikwa nso igaru di obodo ihunanya na itunanya Sintra bukwa nke emere amara-amara nye ndi mba-ozo ka akowaputara idi-ukwu ya n’uzo egbuke-egbuke site na-aka Onye-nwe Byro.
Bọọsụ 403 Scotturb na-eme njem mgbedum aga Sintra, na-akwụsị na Cabo da Roca.
Ọzọkwa n'ugwu leta nnukwu Ebe Nsọ nke Nwanyị Anyị nke Fatima (Ebenchụaja), otu ebe ama ama n'ụwa niile maka ụmụ ihe ngosipụta nke Marịa.
biko cheta na ebe ina aga izute bu n’ezie ogige eliri otutu ozu, dika kwa nwere ihe-oputara ana agaghi agutali onu nye okere onu-ogugu uwa putara-ihe
A ka nwere ọtụtụ ndị dị ndụ taa lanarịrị oge ha nọrọ ebe a, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị nwere ndị ha hụrụ n'anya ndị e gburu ma ọ bụ jiri ọrụ gbuo ha ebe ahụ, ma Ndị Juu ma ndị ọzọ na-abụghị Ndị Juu.
Biko kwanyere webụsaịt a ugwu niile dịịrị ya. Ejila Họlọkọst maọbụ ndị Nazi eme ihe ụka ọchị.
Emebila saịtị ahụ site n'ise akara maọbụ ịkanye grafiti n'ime ihe ndi owuwu.
Ụmụ isi asụsụ nke Baselona bụ Katalan na Spanish. Ihe dị ka ọkara kara chọọ ịsụ Katalan, imirikiti na-aghọta ya, ma onye niile kendịnuche mara Spanish.
Ma otu-osi-di, ihe-ngosi ka n’onu ogugu ka egosiri na asusu Catalan nani n’ihi na eguzosiri ya ike n’iwu dika asusu nke bu nke obodo.
Ma, a na-ejikwa asụsụ ndị Spenụ njem ọha ebe ọ dị ukwuu nakwa akụrụngwa ndị ọzọ.
A na-ama ọkwa mgbedum na Metro naanị na asụsụ Catalan, mana mmesasị nke a na-emeghị atụmatụ ya bụ ndị a na-ekwuputa site na sistemụ akpaghị aka n'ọtụtụ asụsụ dịgasị iche iche gụnyere Spanish, English, French, Arabic na Japanese.
Ndi Parisi nwere aha imaara isi, nganga na mpako.
Mgbe nke a na-abụkarị naanị nhụnuche na-ezighị ezi, ụzọ kachasị mma iji na-aga n’ihu n’ime Parii bụ na ị nọ n’omume gị kachasị mma, na-eme ka onye bụ "bien élevé" (a zụrụ nke ọma). Ọ ga-eme ka ngagharị n’ebe ahụ kara dị mfe.
Agwa ọjọọ Ndị Pari ga-akwụsị ọsịịsọ ma ọ bụrụ na i gosi ụfọdụ nruweisi nkịtị.
Ebe nnọkọọha mba nke Ụmụ ndọrọ mmiri Plitvice nwere oke ọhịa, nwejuru ụmụ osisi beech, spruce, na fir, ma nweekwa mwụkọta nke Alpine na ahịhịa Mediterranean.
Onwere otutu osisi ama ama, maka ebea nwere klimeti di icheiche, aja ya di iche iche, altitude ya dikwa iche n’iche.
Ebe a bụkwa ebe obibi nye ọtụtụ ụdị dị iche iche nke ụdị ụmụ anụmanụ na ụmụ nnụnnụ.
Ụmụ anụmanụ nke ebe obibi pụrụ iche nke anaghị ahụkarị dị ka anụ ọhịa bea ndị Yurop na-acha uri, agụ owulu, ugo, ikwiikwii, nwamba oke ọhịa linz, e nwere ike ịhụ nwamba oke ọhịa na eruru, ya na ọtụtụ ụdị ndị ọzọ a na-ahụkarị.
Ụmụ nwanyị na-aga na monastrị ga-eyi sket na-ekpuchi ikpere ha ma mechiekwa ubu ha.
Ọtụtụ n'ime ebe obibi ndị mọnk na-enye akwa mkpuchi maka ụmụ nwanyị ndị bịara na-adịghị njikere, mana ọ bụrụ na ị weta nke gị, tụmadị nke nwere agba chapụrụ achapụ, ị ga enweta otu mmụmụ ọnụ ọchị sitere na mọnk ma ọ bụ nọn nọ n'ọnụ ụzọ ahụ.
N'otu ụzọ ahụ, a chọrọ ka ụmụ nwoke na-eyi ụmụ traụza na-ekpuchi ikpere.
E nwere ike ịgbaziri nke a kwa site n'akwa ndị nọ n'ọnụ ụzọ mana anaghị asa akwa ahụ ma mmadụ yichaa ya mere ị nwere ike ị gaghị enwe ahụ iru ala iyi sket ndị a. Otu nha na-adaba ụmụ nwoke niile!
Nri ndị Majorca, dị ka nke ndị mpaghara ndị yiri ya n'ime Mediterranean, na-adabere n'achịcha, akwụkwọ nri na anụ (tụmadị anụ ezi), ma na-eji mmanụ oliv mgbe niile.
Pa amb Oli bụ nri abalị dị mfe nke amaara ọkachasị n'oge sọma: Achịcha na mmanụ oliv, tomato, na ụmụ orishirishi ndị ọzọ dị adị dịka chiizi, azụ tuna, dzg.
Aha niile, tinyere okwu Sie maka gị, na-ebidokarị n’iji mkpụrụ edemede ukwu, ọbụnadị n’etiti ahịrịokwu.
Ụzọ a bụ ụzọ dị mkpa e si amata ihe dị iche n’etiti ụfọdụ ngwaa na nnara.
Ọ na-emekwa ka ọgụgụ dị mfe karịa, mana edemede bịara ratụ ahụ maka aghaghị ịmara ma ngwaa maọbụ nkọwa aha ọbụla ọ bụ mpụta ahịrịokwu ahụ.
Mkpọpụta okwu dịtụ mfe n' Ịtalịan ebe ọtụtụ mkpụrụokwu bụ ndị a na-akpọpụta kpọmkwen etu esi dee ha
Ụmụ isi mkpụrụabịdịị ndị a ga-elesi anya maka bụ c na g, ebe mkpọpụta ha na-adị iche na-ndabere na ụdaume na-esote.
Jisiekwa ike hụ na ị kpọpụtara r na rr n'ụzọ dị iche. caro pụtara ezigbo, ebe carro pụtara ụgbọ ịnyịnya.
Asụsụ Peshịa nwere ụtọasụsụ kacha dị mfe ma bụrụ nke a kacha agbaso.
Ya bu igu akwukwo uto asusu ga enyere gi aka imuta maka uto asusu Persia makwa ghota ahiriokwu ofuma.
Ọ baghị uru ikwu, ọ bụrụ na ị mara otu asụsụ Ịhụnanya, ọ ga-adịtụ mfe ịmụta asụsụ Pọtụgiiz.
Agbanyeghi, ndị mara asụsụ Spenụ obere nwere ike ikpebi ọsịịsọ na ya na asụsụ Pọtugiizi yrir nke ọma na o kwesịghị ka a mụọ ya n’iche.
Ọbzavetrị ndị oge gara aga anaghị abachazi uru taa; e jizi ha eme ụlọ ndokwa ihe nka maọbụ ebe mmụta.
Dị ka mmetọ keọkụ n'isimbụ ha abụghị ụdị nsogbu ọ bụ ugbu a, a na-ahụkarị ha n'ime obodo ma ọ bụ na kampọs, nke dị mfe irute karịa ndị ahụ arụrụ n'oge ugbu a.
Otutu teliskop eji eme resaach n'oge ugbu a bu nnukwu ulo oru di n'ebe dipuru adipu nwere ezigbo ihu igwe.
Nlere ifuru Cheri, nke a maara dị ka hanami, bụ omenala na Japan kemgbe nari afọ nke 8.
Echiche ahụ sitere na mba Chaịna bịa ebe plum blossom bụ okooko kacha amasị.
Na Japan, Onye eze Emperọ haziri mmemme mkpụrụ osisi cheri izizi maka naanị ya na ndị otu ndị ọzọ na-ahụ maka ọchịchị Ụlọ ikpe etiti.
Ụmụ akụmakụ na-adị n'ụdị ha kacha mma mgbe ha nọ na gburugburu ebe obibi ekere, ya mere gbochie ọnwụnwa iwepụ ọbụna "naanị otu" ihe nlere.
Ọ bụrụ na ị na-eleta otu ubi ahazigoro etu o kwesịrị, ị na-ewere "ụmụ ihe nlere" ga-eme ka a chụpụ gị, na-emeghị mkparịta ụka.
Singapore bu kwanu ebe di mma ino makwa igaghari ma inwere ike igote ihe o bula i choro ma irute.
Mana ị na-edobe gị n'ime "ebe ndị na-ekpo oke ọkụ" ị ga-achọ naanị digiri ole na ole n'ugwu nke ikwuetọ imeso ma ekpomọkụ (mgbe niile) ma anwụ siri ike (mgbe elu igwe kpochara ekpocha, nke kara raa ahụ omume).
E nwekwara ụfọdụ burumbu na-aga mgbago ugwu ruo Hebrọn, ebe ọdịnala e liri ndị nnaochie nke akwụkwọ nso bụ Ebraham, Aịzik, Jekọb, na ndị nwunye ha.
Lelee na bọọsụ ị na-eche maka ịbanye na ya na-aga Hebron ma ọ bụghị naanị na ebe obibi ndị Juu nke Kiryat Arba dị nso.
Ụzọ mmiri ndị ime obodo nwere ike ịbụ ezigbo isiokwu iji hazie oge ezumike.
Maka ọmụmatụ ileta ụmụ nnukwu ụlọ n’ime Ndagwurugwu Loire, Ndagwurugwu Rhine ma ọ bụ ime njem ụgbọ mmiri gaa obodo ndị na-adọrọ mmasị n’ime Danube ahụ ma ọ bụ ịgba ụgbọ mmiri n’ogologo ụzọ Kanaal Erie ahụ.
Ha na akọwapụtakwa ụmụ ụzọ a ga-eso maka ụzọ haịkịnụ na ọghụgha igwe ama ama.
Ekeresimesi bụ otu n’ime ezumike kachasị mkpa nke Ndị na-eso Ụzọ Kraịst, ma a na-eme ememme ya dị ka ncheta omumu Jizos.
Ndi na-ekweghi na Chukwu na mba ndi otu Kristi gasi ma ndi n’abughi ndi otu Kristi n’uwa niile anabatago otutu odinala enwere maka oge ezumike.
Enwere ọdịnala maka ịmụ anya n'abalị Ista n'ebe mepere emepe iji hụ ọwụwa anyanwụ.
Enwere n'ezie nkọwa na nkà mmụta okpukpe nke Ndị Kraịst maka ọdịnala a, mana ọ nwere ike bụrụ emume ọmụmụ tupu nchụaja Oge mmiri na Ọmụmụ nwa Ndị Kristi abịa.
Ọtụtụ ụlọụka agba ochie na-amụkarị anya abalị Ista n'abalị Satọde n'oge ngwụcha izu Ista, ebe ndị ụka na-abanye na mmemme ma ọ kụọ elekere abụọ nke etiti abalị iji mee mmemme mbilite n'ọnwụ Kraịstị.
Ụmụ anụmanụ niile ndị nke bịarutere n’ime agwaetiti ndị ahụ bịarutere ebe a site n’igwu mmiri, ife efe ma ọ bụ ise n’elu mmiri.
N'ihi ogologo ntoanya site na kọntinentị ahụ ụmụ anụ na-an̄ụ ara enwenwughị ike ịga njem ahụ ya mere na-eme nnukwu mbe isi anụmanụ na-ata ahịhịa n'ime Galapagos ahụ.
Ke,gbe mbịarute nke mmadụ na Galapagos, ewebatala ọtụtụ anụ na-an̄ụ ara gụnyere ewu, inyinya, ehi, oke, nwamba na nkịta.
Ọ bụrụ na ị leta ụmụ ebe Aktik ma ọ bụ Antatik n'ime oge oyi ị ga-enwe ahụmihe nke abalị pola, nke pụtara na anyanwụ agaghị awa na horaịzọn ahụ.
Nke a na-enye ezigbo ohere iji hụ Aurora borealis, dị ka eluigwe ga-agba itiri karịa ma ọ bụ obere gburugburu elekerea ahụ.
Dika ebe ndị ahụ bụ ebe ndị mmadụ ebichabeghị etu ahụ, na mmetọ nke ọkụ ya mere anaghị abụkarị nsogbu, ị ga-enwekwa ike ịnụ ụtọ ụmụ kpakpando.
Omenala ọrụ ndị Japan nwere ogugo na iwu dị iche iche karịa ihe ndị ọdịda anyanwụ maara.
Suutu uwe azụmaahịa izugbe, ma ndị ọrụ ibe na-akpọ onye ọ bụla site n'aha ezinụlọ ha ma ọ bụ site n'aha ọrụ ha.
Nkwekorita nke ebe oru di nkpa, na-ekwusi ike na mbọ otu karịa ito ụmụ mmezu nke otu onye.
Ndi oru kwesiri inweta nkwado onye isi ha maka mkpebi obula ha ga ekpebi, ha kwesikwara irube isi n’ozi o bula onye isi ha ziri ha n’ajughi ajuju.